1 Crônicas 16
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI
1 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ guzobe ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Ha chekwara aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Chineke.
1 Eles trouxeram a arca de Deus e a colocaram na tenda que Davi lhe havia preparado, e ofereceram holocaustos e sacrifícios de comunhão diante de Deus.
2 Mgbe Devid chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị.
2 Após oferecer os holocaustos e os sacrifícios de comunhão, Davi abençoou o povo em nome do Senhor,
3 O nyekwara onye ọbụla nʼIzrel, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ.
3 e deu um pão, um bolo de tâmaras e um bolo de uvas passas a cada homem e a cada mulher israelita.
4 Ọ họpụtara ụfọdụ ndị Livayị ka ha nọdụ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ inye Onyenwe anyị, Chineke Izrel ekele na otuto na ịrịọ ya ngọzị nʼisi ndị ya Izrel. Ndị a bụ ndị o nyere ije ozi a:
4 Davi nomeou alguns dos levitas para ministrarem diante da arca do Senhor, fazendo petições, dando graças, e louvando o Senhor, o Deus de Israel.
5 Asaf bụ onyeisi ndị a. Ndị ọzọ bụ Zekaraya, Jeiel, Shemiramot, Jehiel, Matitaia, Eliab, Benaya, Obed-Edọm na Jeiel. Ọrụ ha bụ ịkpọ ụbọ akwara, na une, ma ọrụ Asaf bụ onye na-akụ ogene ọla na-ada ụda.
5 Desses, Asafe era o chefe, Zacarias vinha em seguida, e depois Jeiel, Semiramote, Jeiel, Matitias, Eliabe, Benaia, Obede-Edom e Jeiel. Eles deviam tocar lira e harpa, enquanto Asafe tocava os címbalos.
6 Benaya na Jahaziel, ndị nchụaja, ketara ọrụ ịfụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke kwamgbe kwamgbe.
6 Os sacerdotes Benaia e Jaaziel deviam tocar diariamente as trombetas diante da arca da aliança de Deus.
7 Nʼụbọchị ahụ ka Devid buru ụzọ họpụta Asaf na ndị otu ya ka ha nye Onyenwe anyị otuto nʼusoro dị otu a:
7 Foi naquele dia que pela primeira vez Davi encarregou a Asafe e seus parentes de louvar ao Senhor com salmos de gratidão:
8 Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya,
8 Dêem graças ao Senhor, clamem pelo seu nome, divulguem entre as nações o que ele tem feito.
9 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto;
9 Cantem para ele, louvem-no; contem todos os seus atos maravilhosos.
10 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;
10 Gloriem-se no seu santo nome; alegrem-se os corações dos que buscam o Senhor.
11 Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
11 Olhem para o Senhor e para a sua força; busquem sempre a sua face.
12 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,
12 Lembrem-se das maravilhas que ele fez, dos seus prodígios e das ordenanças que pronunciou,
13 Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya
13 ó descendentes de Israel, seu servo, ó filhos de Jacó, seus escolhidos.
14 Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
14 Ele é o Senhor, o nosso Deus; seus domínio alcança toda a terra.
15 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi;
15 Para sempre se lembra da sua aliança, da palavra que ordenou para mil gerações,
16 Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara,
16 da aliança que fez com Abraão, do juramento que fez a Isaque,
17 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
17 que confirmou para Jacó como um decreto, e para Israel como uma aliança eterna, dizendo:
18 Sị, “Aga m enye gị ala Kenan
18 "A vocês darei a terra de Canaã, a herança que possuirão".
19 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
19 Quando eles ainda eram poucos, muito poucos, e estrangeiros nela,
20 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ,
20 e vagueavam de nação em nação, de um reino a outro,
21 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
21 ele não permitiu que ninguém os oprimisse; por causa deles repreendeu reis, ordenando:
22 “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka,
22 "Não maltratem os meus ungidos; não façam mal aos meus profetas".
23 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile;
23 Cantem ao Senhor, todas as terras! Proclamem a sua salvação dia após dia!
24 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,
24 Anunciem a sua glória entre as nações, seus feitos maravilhosos entre todos os povos!
25 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto.
25 Pois o Senhor é grande e muitíssimo digno de louvor; ele deve ser mais temido que todos os deuses.
26 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,
26 Pois todos os deuses das nações não passam de ídolos, mas o Senhor fez os céus.
27 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;
27 O esplendor e a majestade estão diante dele; força e alegria na sua habitação.
28 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,
28 Dêem ao Senhor, ó famílias das nações, dêem ao Senhor glória e força.
29 E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya,
29 Dêem ao Senhor a glória devida ao seu nome. Tragam ofertas e venham à sua presença. Adorem o Senhor no esplendor da sua santidade,
30 Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
30 tremam diante dele, todas as nações! Firmou o mundo, que não se abalará!
31 Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;
31 Que os céus se alegrem e a terra exulte, e diga-se entre as nações: "O Senhor reina! "
32 Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya,
32 Ressoe o mar, e tudo o que nele existe; exultem os campos, e tudo o que neles há!
33 Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ,
33 Então as árvores da floresta cantarão de alegria, cantarão diante do Senhor, pois ele vem julgar a terra.
34 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
34 Rendam graças ao Senhor, pois ele é bom; o seu amor dura para sempre.
35 Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị;
35 Clamem: "Salva-nos, ó Deus, nosso Salvador! Reúne-nos e livra-nos das nações, para que demos graças ao teu santo nome e façamos do teu louvor a nossa glória".
36 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
36 Bendito seja o Senhor, o Deus de Israel, de eternidade a eternidade. Então todo o povo exclamou: "Amém! " e "Louvado seja o Senhor! "
37 Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.
37 Então Davi deixou Asafe e seus parentes diante da arca da aliança do Senhor para ali ministrarem regularmente, de acordo com as prescrições para cada dia.
38 Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
38 Também deixou Obede-Edom e seus sessenta e oito parentes para ministrarem com eles. Obede-Edom, filho de Jedutum, e também Hosa foram porteiros.
39 Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
39 Davi deixou o sacerdote Zadoque e seus parentes sacerdotes diante do tabernáculo do Senhor em Gibeom
40 Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.
40 para regularmente, de manhã e à tarde, apresentarem holocaustos no altar de holocaustos, de acordo com tudo o que está escrito na Lei do Senhor, que ele deu a Israel.
41 Devid họpụtakwara Heman, na Jedutun, na ndị ọzọ a kpọrọ aha họpụta inye Onyenwe anyị ekele, “nʼihi ịhụnanya ya na obi ebere ya nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
41 Com eles estavam Hemã e Jedutum e os outros designados para darem graças ao Senhor, exclamando: "O seu amor dura para sempre".
42 Heman na Jedutun bụ ndị ọ dịịrị ịfụ opi, na ịkụ ogene ọla, na ihe egwu ndị ọzọ eji na-enye Chineke otuto. Ụmụ ndị ikom Jedutun bụ ndị nọ nche nʼọnụ ụzọ ama.
42 Hemã e Jedutum eram responsáveis pelas trombetas, pelos címbalos e pelos outros instrumentos musicais para o culto. Os filhos de Jedutum foram designados como porteiros.
43 Mgbe mmemme ahụ gwụsịrị, onye ọbụla lara nʼụlọ ya. Devid lakwara ịgọzi ezinaụlọ ya.
43 Então todo o povo partiu, cada um para a sua casa, e Davi voltou para casa para abençoar sua família.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Crônicas 16, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.