Neemias 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ACF
1 Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.
1 Sucedeu que, depois que o muro foi edificado, eu levantei as portas; e foram estabelecidos os porteiros, os cantores e os levitas.
2 Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
2 Eu nomeei a Hanani, meu irmão, e a Hananias, líder da fortaleza, sobre Jerusalém; porque ele era homem fiel e temente a Deus, mais do que muitos.
3 Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”
3 E disse-lhes: Não se abram as portas de Jerusalém até que o sol aqueça, e enquanto os que assisti-rem ali permanecerem, fechem as portas, e vós trancai-as; e ponhamse guardas dos moradores de Jerusalém, cada um na sua guarda, e cada um diante da sua casa.
4 Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị.
4 E era a cidade larga de espaço, e grande, porém pouco povo havia dentro dela; e ainda as casas não estavam edificadas.
5 Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:
5 Então o meu Deus me pôs no coração que ajuntasse os nobres, os magistrados e o povo, para registrar as genealogias; e achei o livro da genealogia dos que subiram primeiro e nele estava escrito o seguinte:
6 Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.
6 Estes são os filhos da província, que subiram do cativeiro dos exilados, que transportara Nabucodonosor, rei de Babilônia; e voltaram para Jerusalém e para Judá, cada um para a sua cidade;
7 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana.
7 Os quais vieram com Zorobabel, Jesuá, Neemias, Azarias, Raamias, Naamani, Mordecai, Bilsã, Misperete, Bigvai, Neum, e Baaná; este é o número dos homens do povo de Israel.
8 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172),
8 Foram os filhos de Parós, dois mil, cento e setenta e dois.
9 nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372),
9 Os filhos de Sefatias, trezentos e setenta e dois.
10 nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ (652),
10 Os filhos de Ará, seiscentos e cinqüenta e dois.
11 nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ (2,818),
11 Os filhos de Paate-Moabe, dos filhos de Jesuá e de Joabe, dois mil, oitocentos e dezoito.
12 nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254),
12 Os filhos de Elão, mil, duzentos e cinqüenta e quatro.
13 nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise (845),
13 Os filhos de Zatu, oitocentos e quarenta e cinco.
14 nke Zakai, narị asaa na iri isii (760),
14 Os filhos de Zacai, setecentos e sessenta.
15 nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ (648),
15 Os filhos de Binui, seiscentos e quarenta e oito.
16 nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ (628),
16 Os filhos de Bebai, seiscentos e vinte e oito.
17 nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ (2,322),
17 Os filhos de Azgade, dois mil, trezentos e vinte e dois.
18 nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa (667),
18 Os filhos de Adonicão, seiscentos e sessenta e sete.
19 nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa (2,067),
19 Os filhos de Bigvai, dois mil e sessenta e sete.
20 nke Adin, narị isii na iri ise na ise (655),
20 Os filhos de Adim, seiscentos e cinqüenta e cinco.
21 nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ (98),
21 Os filhos de Ater, de Ezequias, noventa e oito.
22 nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ (328),
22 Os filhos de Hassum, trezentos e vinte e oito.
23 nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ (324),
23 Os filhos de Bezai, trezentos e vinte e quatro.
24 nke Harif, otu narị na iri na abụọ (112),
24 Os filhos de Harife, cento e doze.
25 nke Gibiọn, iri itoolu na ise (95).
25 Os filhos de Gibeom, noventa e cinco.
26 Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188),
26 Os homens de Belém e de Netofa, cento e oitenta e oito.
27 ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128),
27 Os homens de Anatote, cento e vinte e oito.
28 ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ (42),
28 Os homens de Bete-Azmavete, quarenta e dois.
29 ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743),
29 Os homens de Quiriate-Jearim, Quefira e Beerote, setecentos e quarenta e três.
30 ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621),
30 Os homens de Ramá e Geba, seiscentos e vinte e um.
31 ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122),
31 Os homens de Micmás, cento e vinte e dois.
32 ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ (123),
32 Os homens de Betel e Ai, cento e vinte e três.
33 ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ (52),
33 Os homens do outro Nebo, cinqüenta e dois.
34 ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254),
34 Os filhos do outro Elão, mil, duzentos e cinqüenta e quatro:
35 ndị Harim, narị atọ na iri abụọ (320),
35 Os filhos de Harim, trezentos e vinte.
36 ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345),
36 Os filhos de Jericó, trezentos e quarenta e cinco.
37 ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu (721),
37 Os filhos de Lode, Hadide e Ono, setecentos e vinte e um.
38 ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ (3,930).
38 Os filhos de Senaá, três mil, novecentos e trinta.
39 Ndị nchụaja:
39 Os sacerdotes: Os filhos de Jedaías, da casa de Jesuá, novecentos e setenta e três.
40 ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ (1,052),
40 Os filhos de Imer, mil e cinqüenta e dois.
41 ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247),
41 Os filhos de Pasur, mil, duzentos e quarenta e sete.
42 ndị Harim, otu puku, na iri na asaa (1,017).
42 Os filhos de Harim, mil e dezessete.
43 Ndị Livayị:
43 Os levitas: Os filhos de Jesuá, de Cadmiel, dos filhos de Hodeva, setenta e quatro.
44 Ndị ọbụ abụ:
44 Os cantores: Os filhos de Asafe, cento e quarenta e oito.
45 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu:
45 Os porteiros: Os filhos de Salum, os filhos de Ater, os filhos de Talmom, os filhos de Acube, os filhos de Hatita, os filhos de Sobai, cento e trinta e oito.
46 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ:
46 Os servidores do templo: Os filhos de Zia, os filhos de Hasufa, os filhos de Tabaote,
47 Keros, Sia, Padon,
47 Os filhos de Queros, os filhos de Sia, os filhos de Padom,
48 Lebana, Hagaba, Shalmai,
48 Os filhos de Lebana, os filhos de Hagaba, os filhos de Salmai,
49 Hanan, Gidel, Gaha,
49 Os filhos de Hanã, os filhos de Gidel, os filhos de Gaar,
50 Reaya, Rezin, Nekoda,
50 Os filhos de Reaías, os filhos de Rezim, os filhos de Necoda,
51 Gazam, Ụza, Pasea,
51 Os filhos de Gazão, os filhos de Uzá, os filhos de Paseá,
52 Besai, Meunim, Nefusim,
52 Os filhos de Besai, os filhos de Meunim, os filhos de Nefussim,
53 Bakbuk, Hakufa, Hahua,
53 Os filhos de Bacbuque, os filhos de Hacufa, os filhos de Harur,
54 Bazlut, Mehida, Hasha,
54 Os filhos de Bazlite, os filhos de Meída, os filhos de Harsa,
55 Bakos, Sisera, Tema,
55 Os filhos de Barcos, os filhos de Sísera, os filhos de Tamá,
56 Nezaya na Hatifa.
56 Os filhos de Neziá, os filhos de Hatifa.
57 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi,
57 Os filhos dos servos de Salomão, os filhos de Sotai, os filhos de Soferete, os filhos de Perida,
58 Jaala, Dakon, Gidel,
58 Os filhos de Jaala, os filhos de Darcom, os filhos de Gidel,
59 Shefataya, Hatil,
59 Os filhos de Sefatias, os filhos de Hatil, os filhos de Poquerete-Hazebaim, os filhos de Amom.
60 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).
60 Todos os servidores do templo e os filhos dos servos de Salomão, trezentos e noventa e dois.
61 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
61 Também estes subiram de Tel-Melá, e Tel-Harsa, Querube, Adom, Imer; porém não puderam provar que a casa de seus pais e a sua linhagem, eram de Israel.
62 Ndị agbụrụ:
62 Os filhos de Delaías, os filhos de Tobias, os filhos de Necoda, seiscentos e quarenta e dois.
63 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja:
63 E dos sacerdotes: os filhos de Habaías, os filhos de Coz, os filhos de Barzilai, que tomara uma mulher das filhas de Barzilai, o gileadita, e que foi chamado do seu nome.
64 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
64 Estes buscaram o seu registro nos livros genealógicos, porém não se achou; então, como imundos, foram excluídos do sacerdócio.
65 Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
65 E o governador lhes disse que não comessem das coisas sagradas, até que se apresentasse o sacerdote com Urim e Tumim.
66 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360),
66 Toda esta congregação junta foi de quarenta e dois mil, trezentos e sessenta,
67 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise (245).
67 Afora os seus servos e as suas servas, que foram sete mil, trezentos e trinta e sete; e tinham duzentos e quarenta e cinco cantores e cantoras.
68 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise (245),
68 Os seus cavalos, setecentos e trinta e seis; os seus mulos, duzentos e quarenta e cinco.
69 ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720).
69 Camelos, quatrocentos e trinta e cinco; jumentos, seis mil, setecentos e vinte.
70 Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000), iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530).
70 E uma parte dos chefes dos pais contribuíram para a obra. O governador deu para o tesouro, em ouro, mil dracmas, cinqüenta bacias, e quinhentas e trinta vestes sacerdotais.
71 Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200).
71 E alguns mais dos chefes dos pais contribuíram para o tesouro da obra, em ouro, vinte mil dracmas, e em prata, duas mil e duzentas libras.
72 Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67).
72 E o que deu o restante do povo foi, em ouro, vinte mil dracmas, e em prata, duas mil libras; e sessenta e sete vestes sacerdotais.
73 Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha.
73 E habitaram os sacerdotes, os levitas, os porteiros, os cantores, alguns do povo, os servidores do templo, e todo o Israel nas suas cidades.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Neemias 7, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.