1 Crônicas 23

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ACF

Sair da comparação
ACF Almeida Corrigida Fiel
1 Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel.
1 Sendo, pois, Davi já velho, e cheio de dias, fez a Salomão, seu filho, rei sobre Israel.
2 Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị.
2 E reuniu a todos os príncipes de Israel, como também aos sacerdotes e levitas.
3 A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ.
3 E foram contados os levitas de trinta anos para cima; e foi o número deles, segundo as suas cabeças, trinta e oito mil homens.
4 Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe,
4 Destes havia vinte e quatro mil, para promoverem a obra da casa do Senhor, e seis mil oficiais e juízes,
5 puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”
5 E quatro mil porteiros, e quatro mil para louvarem ao Senhor com os instrumentos, que eu fiz para o louvar, disse Davi.
6 Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari.
6 E Davi os repartiu por turnos, segundo os filhos de Levi, Gérson, Coate e Merari.
7 E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị,
7 Dos gersonitas: Ladã e Simei.
8 Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ:
8 Os filhos de Ladã: Jeiel, o chefe, e Zetã, e Joel, três.
9 Ụmụ Shimei bụ,
9 Os filhos de Simei: Selomite, Haziel, e Harã, três; estes foram os chefes dos pais de Ladã.
10 Ụmụ Shimei bụ,
10 E os filhos de Simei: Jaate, Ziza, Jeús, e Berias; estes foram os filhos de Simei, quatro.
11 Jahat bụ onye mbụ, Ziza onye nke abụọ. Ma Jeush na Beriya amụtaghị ọtụtụ ụmụ ndị ikom. Nʼihi ya, a gụnyekọtara ha dịka otu ezinaụlọ, kenye ha otu ọrụ.
11 E Jaate era o chefe, e Ziza o segundo, mas Jeús e Berias não tiveram muitos filhos; por isso estes, sendo contados juntos se tornaram uma só família.
12 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ
12 Os filhos de Coate: Anrão, Izar, Hebrom, e Uziel, quatro.
13 Ụmụ ndị ikom Amram bụ,
13 Os filhos de Anrão: Arão e Moisés; e Arão foi separado para santificar o santo dos santos, ele e seus filhos, eternamente; para incensar diante do Senhor, para o servirem, e para darem a bênção em seu nome eternamente.
14 Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.
14 E, quanto a Moisés, homem de Deus, seus filhos foram contados entre os da tribo de Levi.
15 Ụmụ ndị ikom Mosis bụ,
15 Foram, pois, os filhos de Moisés, Gérson e Eliézer.
16 Ụmụ ndị ikom Geshọm bụ
16 Dos filhos de Gérson foi Sebuel o chefe.
17 Ụmụ ụmụ Elieza bụ
17 E, quanto aos filhos de Eliézer, foi Reabias o chefe; e Eliézer não teve outros filhos; porém os filhos de Reabias foram muitos.
18 Ụmụ ndị ikom Izha bụ
18 Dos filhos de Izar foi Selomite o chefe.
19 Ụmụ ndị ikom Hebrọn bụ
19 Quanto aos filhos de Hebrom, foram Jerias o primeiro, Amarias o segundo, Jaaziel o terceiro, e Jecameão o quarto.
20 Ụmụ ndị ikom Uziel bụ
20 Quanto aos filhos de Uziel, Mica o chefe, e Issias o segundo.
21 Ụmụ ndị ikom Merari bụ
21 Os filhos de Merari: Mali, e Musi; os filhos de Mali: Eleazar e Quis.
22 Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
22 E morreu Eleazar, e não teve filhos, porém filhas; e os filhos de Quis, seus parentes, as tomaram por mulheres.
23 Ụmụ ndị ikom Mushi bụ
23 Os filhos de Musi: Mali, e Eder, e Jeremote, três.
24 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo.
24 Estes são os filhos de Levi, segundo a casa de seus pais, chefes dos pais, conforme foram contados pelos seus nomes, segundo as suas cabeças, que faziam a obra do ministério da casa do Senhor, desde a idade de vinte anos para cima.
25 Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi.
25 Porque disse Davi: O Senhor Deus de Israel deu repouso ao seu povo, e habitará em Jerusalém para sempre.
26 Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.”
26 E também, quanto aos levitas, que nunca mais levassem o tabernáculo, nem algum de seus aparelhos pertencentes ao seu ministério.
27 Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ.
27 Porque, segundo as últimas palavras de Davi, foram contados os filhos de Levi da idade de vinte anos para cima:
28 Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.
28 Porque o seu cargo era assistir aos filhos de Arão no ministério da casa do Senhor, nos átrios, e nas câmaras, e na purificação de todas as coisas sagradas, e na obra do ministério da casa de Deus.
29 Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
29 A saber: para os pães da proposição, e para a flor de farinha, para a oferta de alimentos, e para os coscorões ázimos, e para as sertãs, e para o tostado, e para todo o peso e medida;
30 Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
30 E para estarem cada manhã em pé para louvarem e celebrarem ao Senhor; e semelhantemente à tarde;
31 Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.
31 E para oferecerem os holocaustos do Senhor, aos sábados, nas luas novas, e nas solenidades, segundo o seu número e costume, continuamente perante o Senhor;
32 Ya mere, e tinyere ọrụ ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, na ụlọnsọ ukwu ahụ nʼaka ha. Ha ka ọ dịkwara inyere ndị ikwu ha, bụ ndị nchụaja ahụ, ụmụ Erọn, aka nʼọrụ ha niile nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
32 E para que tivessem cuidado da guarda da tenda da congregação, e da guarda do santuário, e da guarda dos filhos de Arão, seus irmãos, no ministério da casa do Senhor.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Crônicas 23, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.