Zacarias 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVT

Sair da comparação
NVT Nova Versão Transformadora
1 Nʼọnwa nke asatọ, nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya nwa Berekaya, nwa Ido, bụ onye amụma ntị, na-asị,
1 Em novembro do segundo ano do reinado de Dario, o S enhor deu esta mensagem ao profeta Zacarias, filho de Berequias, neto de Ido:
2 “Onyenwe anyị were oke iwe megide nna unu ha.
2 “Eu, o S enhor , fiquei extremamente irado com seus antepassados.
3 Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
3 Portanto, diga ao povo: ‘Assim diz o S enhor dos Exércitos: Voltem-se para mim, e eu me voltarei para vocês, diz o S enhor dos Exércitos’.
4 Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4 Não sejam como seus antepassados, que não quiseram ouvir nem deram atenção quando os antigos profetas lhes disseram: ‘Assim diz o S enhor dos Exércitos: Deixem seus caminhos maus e abandonem suas práticas perversas’.
5 Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
5 “Onde estão agora seus antepassados? Morreram há muito tempo, assim como os profetas.
6 Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ?
6 Mas tudo que eu disse e ordenei por meio de meus servos, os profetas, aconteceu a seus antepassados. Por isso, eles se arrependeram e disseram: ‘Recebemos do S enhor dos Exércitos o que merecíamos. Ele fez o que havia prometido’”.
7 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:
7 Três meses depois, no dia 15 de fevereiro, o S enhor deu outra mensagem ao profeta Zacarias, filho de Berequias, neto de Ido.
8 Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa.
8 Numa visão durante a noite, vi um homem montado num cavalo vermelho, parado entre algumas murtas num desfiladeiro. Atrás dele, havia cavaleiros montados em cavalos vermelhos, marrons e brancos.
9 Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?”
9 Perguntei ao anjo que falava comigo: “Meu senhor, o que significam estes cavalos?”. “Eu lhe mostrarei”, o anjo respondeu.
10 Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, “Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile.”
10 O cavaleiro que estava entre as murtas explicou: “Eles são aqueles que o S enhor enviou para percorrer a terra”.
11 Ha sịrị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nke na-eguzo nʼetiti osisi mietul ahụ, “Anyị ejegharịala nʼụwa niile, ma lee anyị chọpụtara na ụwa niile nọ nʼudo, dịkwa jụụ.”
11 Então os outros cavaleiros disseram ao anjo do S enhor , que estava entre as murtas: “Percorremos toda a terra, e ela está em paz”.
12 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?”
12 Quando o anjo do S enhor ouviu isso, disse: “Ó S enhor dos Exércitos, durante estes setenta anos tens estado irado com Jerusalém e as cidades de Judá. Quanto tempo levará para voltares a ter compaixão delas?”.
13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara mmụọ ozi ahụ guzo na-agwa m okwu, okwu nkasiobi na okwu ọma dị iche iche.
13 E, ao anjo que falava comigo, o S enhor respondeu com palavras boas e consoladoras.
14 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ,
14 Então o anjo me disse: “Proclame esta mensagem: ‘Assim diz o S enhor dos Exércitos: Tenho grande zelo por Jerusalém e pelo monte Sião,
15 ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’
15 mas estou extremamente irado com as outras nações que agora vivem tranquilas. Eu estava apenas um pouco irado com meu povo, mas as nações fizeram que ele sofresse muito.
16 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
16 “‘Portanto, assim diz o S enhor : Voltei a mostrar compaixão por Jerusalém. Meu templo será reconstruído, diz o S enhor dos Exércitos, e serão tiradas medidas para a reconstrução de Jerusalém’.
17 “Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ.Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’ ”
17 “Diga também: ‘Assim diz o S enhor dos Exércitos: As cidades de Israel voltarão a transbordar de prosperidade, e o S enhor voltará a consolar Sião e escolherá Jerusalém para si’”.
18 Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ.
18 Então levantei os olhos e vi quatro chifres de animais.
19 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, “Gịnị ka ihe ndị a bụ?”
19 “O que significam estes chifres?”, perguntei ao anjo que falava comigo. Ele respondeu: “Estes chifres representam as nações que dispersaram Judá, Israel e Jerusalém”.
20 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ.
20 Então o S enhor me mostrou quatro ferreiros.
21 Asịrị m, “Gịnị ka ndị na-abịa ime?”
21 “O que estes homens vieram fazer?”, perguntei. O anjo respondeu: “Os quatro chifres são as nações que dispersaram e humilharam Judá. Agora, os ferreiros vieram para aterrorizar, derrubar e destruir essas nações”.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Zacarias 1, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.