Números 16
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH
1 Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi
1 — ausente —
2 bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel.
2 — ausente —
3 Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”
3 Eles foram juntos falar com Moisés e Arão e disseram: — Agora chega! Todo o povo pertence a Deus, o
4 Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.
4 Quando Moisés ouviu isso, ajoelhou-se, encostou o rosto no chão
5 Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
5 e disse o seguinte a Corá e a todos os seus seguidores: — Amanhã cedo o
6 Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
6 — ausente —
7 mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”
7 — ausente —
8 Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị!
8 Moisés disse também a Corá: — Agora escutem, levitas!
9 Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi?
9 O Deus de Israel os separou do resto do povo para poderem chegar perto dele, para fazerem o seu serviço na Tenda do Senhor e para realizarem as cerimônias em favor do povo. Será que isso não basta para vocês?
10 Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja?
10 Deus deu a você e a todos os outros levitas esse privilégio, e agora vocês estão querendo também ser sacerdotes?
11 Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?”
11 Quando vocês reclamam contra Arão, na verdade é contra o Senhor que você e os seus seguidores estão se revoltando.
12 Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.
12 Então Moisés mandou chamar Datã e Abirão, filhos de Eliabe, mas eles responderam aos mensageiros: — Nós não vamos!
13 Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
13 Será que não basta você nos ter tirado de uma terra boa e rica a fim de nos fazer morrer neste deserto? E além disso ainda quer mandar em nós?
14 Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
14 Na verdade você não nos trouxe para uma terra boa e rica, nem nos deu campos e plantações de uvas para serem nossa propriedade; e ainda por cima está querendo nos enganar. Nós não vamos!
15 Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”
15 Então Moisés ficou muito zangado e disse a Deus, o Senhor : — Não aceites as ofertas desses homens. Eu nunca prejudiquei a nenhum deles, nem tirei deles nem mesmo um jumento!
16 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
16 Aí Moisés disse a Corá: — Amanhã você e os seus duzentos e cinquenta seguidores venham até a Tenda Sagrada. Arão também estará ali.
17 Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
17 Cada um de vocês pegará o seu queimador de incenso, colocará incenso nele e o levará até o altar.
18 Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
18 Assim, cada homem pegou o seu queimador de incenso, pôs brasas e incenso nele, e todos ficaram na entrada da Tenda Sagrada com Moisés e Arão.
19 Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
19 Então Corá reuniu todo o povo, e eles ficaram diante de Moisés e Arão na entrada da Tenda. De repente, a glória do Senhor apareceu a todo o povo,
20 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
20 e o Senhor disse a Moisés e a Arão:
21 “Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”
21 — Saiam do meio dessa gente, pois eu vou acabar com eles agora mesmo.
22 Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?”
22 Mas Moisés e Arão se ajoelharam, encostaram o rosto no chão e disseram: — Ó Deus, tu dás vida a todos. Será que por causa do pecado de uma só pessoa vais ficar
23 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya,
23 Então o Senhor respondeu a Moisés:
24 “Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ”
24 — Diga ao povo que saia de perto das barracas de Corá, Datã e Abirão.
25 Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.
25 Aí Moisés saiu e, junto com os líderes do povo, foi para onde estavam Datã e Abirão.
26 Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”
26 E Moisés disse ao povo: — Afastem-se das barracas desses homens maus e não toquem em nada que seja deles; se não, vocês também serão destruídos por causa dos pecados deles.
27 Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.
27 Aí o povo se afastou das barracas de Corá, Datã e Abirão. Datã e Abirão saíram e ficaram na entrada da sua barraca, com as suas mulheres e filhos.
28 Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.
28 Então Moisés disse ao povo: — Eu vou dizer como vocês vão ficar sabendo que não fui eu quem resolveu fazer tudo isso. Fiz todas essas coisas porque o
29 Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.
29 Se estes homens tiverem morte natural como todos os outros, sem nenhum castigo de Deus, então o Senhor não me enviou.
30 Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.”
30 Mas, se ele fizer acontecer alguma coisa fora do comum, e se a terra se abrir e engolir essa gente com tudo o que eles têm, e eles descerem vivos para o mundo dos mortos , vocês ficarão sabendo que estes homens rejeitaram o Senhor .
31 Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ,
31 E aconteceu que, assim que Moisés acabou de falar, a terra se abriu debaixo deles
32 ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
32 e os engoliu com as suas famílias, junto com todos os seguidores de Corá e tudo o que eles tinham.
33 Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi.
33 Assim, desceram vivos para o mundo dos mortos, eles e tudo o que possuíam. A terra os cobriu, e eles desapareceram.
34 Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”
34 Ao ouvirem os gritos deles, todos os israelitas que estavam ali saíram correndo e gritando: — A terra vai engolir a gente também!
35 Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
35 Então o Senhor enviou fogo e matou os duzentos e cinquenta homens que haviam oferecido incenso.
36 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
36 Aí o Senhor Deus disse a Moisés:
37 “Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.
37 — Diga a Eleazar, filho do sacerdote Arão, que pegue os queimadores de incenso do meio dos restos do incêndio e espalhe para longe as brasas que ainda estiverem neles, pois os queimadores de incenso são sagrados.
38 Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”
38 Eles ficaram sagrados quando foram oferecidos no altar do Senhor . Portanto, pegue os queimadores de incenso desses homens que foram mortos por causa dos seus pecados e deles faça folhas finas de metal. E com essas folhas prepare uma cobertura para o altar. Isso será um aviso para o povo de Israel.
39 Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,
39 Então o sacerdote Eleazar pegou os queimadores de incenso de metal que os homens que tinham sido mortos haviam trazido e mandou que deles fossem feitas folhas de metal para cobrir o altar.
40 dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.
40 Conforme o Senhor tinha dito a Moisés, isso ficou sendo um aviso para os israelitas a fim de que nenhuma pessoa que não seja descendente de Arão venha a queimar incenso diante do Senhor e seja castigada, como aconteceu com Corá e com os seus seguidores.
41 Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”
41 Mas no dia seguinte todos os israelitas começaram a reclamar contra Moisés e Arão, dizendo assim: — Vocês mataram o povo de Deus, o
42 Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.
42 Depois que todos se reuniram para protestar contra Moisés e Arão, eles se viraram para a Tenda Sagrada e viram que a nuvem a estava cobrindo. Então a glória do Senhor apareceu.
43 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ.
43 Moisés e Arão foram até a frente da Tenda,
44 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
44 e o Senhor disse a Moisés:
45 “Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.
45 — Saiam do meio desse povo, pois vou destruí-lo agora mesmo! Aí Moisés e Arão se ajoelharam e encostaram o rosto no chão.
46 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”
46 E Moisés disse a Arão: — Pegue o seu queimador de incenso, ponha nele algumas brasas do altar e jogue incenso em cima delas. E vá depressa até o lugar onde o povo está e ofereça o
47 Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.
47 Então Arão pegou o queimador de incenso, conforme Moisés havia mandado, e correu para o meio do povo. Quando viu que a epidemia já havia começado, Arão jogou o incenso nas brasas e ofereceu o sacrifício para conseguir o perdão dos pecados do povo.
48 O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.
48 Com isso a epidemia parou, e Arão ficou de pé entre os vivos e os mortos.
49 Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa (14,700). A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga.
49 Naquela epidemia morreram catorze mil e setecentas pessoas, fora as que morreram na revolta de Corá.
50 Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.
50 Quando acabou a epidemia, Arão voltou para a entrada da Tenda, onde Moisés estava.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Números 16, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.