Neemias 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ARIB

Sair da comparação
ARIB Almeida Revisada Imprensa Bíblica
1 Nʼọnwa Nisan, nʼiri afọ abụọ nke ọchịchị eze Ataksekses, mgbe e wetaara eze mmanya. E buru m mmanya ahụ bugara ya eze. Ugbu a, o nwebeghị mgbe ọbụla m jirila ihu mgbarụ bịa nʼihu eze.
1 Sucedeu, pois, no mês de nisã, no ano vigésimos do rei Artaxerxes, quando o vinho estava posto diante dele, que eu apanhei o vinho e o dei ao rei. Ora, eu nunca estivera triste na sua presença.
2 Ya mere, eze jụrụ m, “Gịnị mere ihu gị ji gbaruo mgbe ọ dịghị ọrịa ji gị? Nke a na-egosi naanị na obi jọrọ gị njọ.”
2 E o rei me disse: Por que está triste o teu rosto, visto que não estás doente? Não é isto senão tristeza de coração. Então temi sobremaneira.
3 Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?”
3 e disse ao rei: Viva o rei para sempre! Como não há de estar triste o meu rosto, estando na cidade, o lugar dos sepulcros de meus pais, assolada, e tendo sido consumidas as suas portas pelo fogo?
4 Eze sịrị m, “Ọ bụ gịnị ka ị chọrọ?”
4 Então o rei me perguntou: Que me pedes agora? Orei, pois, ao Deus do céu,
5 ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.”
5 e disse ao rei: Se for do agrado do rei, e se teu servo tiver achado graça diante de ti, peço-te que me envies a Judá, à cidade dos sepulcros de meus pais, para que eu a reedifique.
6 Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge.
6 Então o rei, estando a rainha assentada junto a ele, me disse: Quanto durará a tua viagem, e quando voltarás? E aprouve ao rei enviar-me, apontando-lhe eu certo prazo.
7 Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.
7 Eu disse ainda ao rei: Se for do agrado do rei, dêem-se-me cartas para os governadores dalém do Rio, para que me permitam passar até que eu chegue a Judá;
8 Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m.
8 como também uma carta para Asafe, guarda da floresta do rei, a fim de que me dê madeira para as vigas das portas do castelo que pertence à casa, e para o muro da cidade, e para a casa que eu houver de ocupar. E o rei mas deu, graças à mão benéfica do meu Deus sobre mim.
9 Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.
9 Então fui ter com os governadores dalém do Rio, e lhes entreguei as cartas do rei. Ora, o rei tinha enviado comigo oficiais do exército e cavaleiros.
10 Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka.
10 O que ouvindo Sambalate, o horonita, e Tobias, o servo amonita, ficaram extremamente agastados de que alguém viesse a procurar o bem dos filhos de Israel.
11 E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ,
11 Cheguei, pois, a Jerusalém, e estive ali três dias.
12 eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba.
12 Então de noite me levantei, eu e uns poucos homens comigo; e não declarei a ninguém o que o meu deus pusera no coração para fazer por Jerusalém. Não havia comigo animal algum, senão aquele que eu montava.
13 Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa. Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere.
13 Assim saí de noite pela porta do vale, até a fonte do dragão, e até a porta do monturo, e contemplei os muros de Jerusalém, que estavam demolidos, e as suas portas, que tinham sido consumidas pelo fogo.
14 Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee.
14 E passei adiante até a porta da fonte, e à piscina do rei; porém não havia lugar por onde pudesse passar o animal que eu montava.
15 Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu.
15 Ainda de noite subi pelo ribeiro, e contemplei o muro; e virando, entrei pela porta do vale, e assim voltei.
16 Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ.
16 E não souberam os magistrados aonde eu fora nem o que eu fazia; pois até então eu não havia declarado coisa alguma, nem aos judeus, nem aos sacerdotes, nem aos nobres, nem aos magistrados, nem aos demais que faziam a obra.
17 Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.”
17 Então eu lhes disse: Bem vedes vós o triste estado em que estamos, como Jerusalém está assolada, e as suas portas queimadas a fogo; vinde, pois, e edifiquemos o muro de Jerusalém, para que não estejamos mais em opróbrio.
18 Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya.
18 Então lhes declarei como a mão do meu Deus me fora favorável, e bem assim as palavras que o rei me tinha dito. Eles disseram: Levantemo-nos, e edifiquemos. E fortaleceram as mãos para a boa obra.
19 Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?”
19 O que ouvindo Sambalate, o horonita, e Tobias, o servo amonita, e Gesem, o arábio, zombaram de nós, desprezaram-nos e disseram: O que é isso que fazeis? Quereis rebelar-vos contra o rei?
20 Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.”
20 Então lhes respondi: O Deus do céu é que nos fará prosperar; e nós, seus servos, nos levantaremos e edificaremos: mas vós não tendes parte, nem direito, nem memorial em Jerusalém.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Neemias 2, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.