Neemias 11

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 Ugbu a, ndịisi Izrel bi nʼobodo nsọ Jerusalem nʼoge a, ma e sitere nʼife nza họpụta otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ndị bi nʼobodo ndị ọzọ niile ka ha bịa biri na Jerusalem, bụ obodo nsọ ahụ, ebe ụzọ itoolu fọdụrụ bikwa nʼobodo nke aka ha.
1 Estabeleceram-se os chefes do povo em Jerusalém. O resto dos israelitas tirou a sorte, a fim de que um entre dez viesse habitar em Jerusalém, na cidade santa, enquanto que os nove outros ficariam nas demais cidades.
2 Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem.
2 O povo abençoou todos aqueles que se decidiram espontaneamente a vir habitar em Jerusalém.
3 Ndị a bụ ndịisi ala ahụ a na-achị achị ndị bịara biri na Jerusalem (ma ọtụtụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi biiri nʼobodo Juda, onye ọbụla nʼihe onwunwe ya nʼobodo ha dị iche iche.
3 Eis os chefes de família da colônia que se estabeleceu em Jerusalém. Nas cidades de Judá, israelitas, sacerdotes, levitas, natineus e os filhos dos escravos de Salomão estabeleceram-se cada um em sua propriedade, na sua cidade.
4 Ebe ndị ọzọkwa bụ ndị sitere na Juda na Benjamin, biiri na Jerusalem).
4 Estabeleceram-se em Jerusalém filhos de Judá e filhos de Benjamim. Entre os filhos de Judá: Ataías, filho de Azião, filho de Zacarias, filho de Amarias, filho de Safatias, filho de Malaleel, dos filhos de Fares;
5 na Maaseia nwa Baruk, nwa Kol-Hoze, nwa Hazaia, nwa Adaya, nwa Joiarib, nwa Zekaraya, nwa onye Shilo.
5 e Maasias, filho de Baruc, filho de Colhosa, filho de Hazias, filho de Adaías, filho de Joiarib, filho de Zacarias, filho de Sela.
6 Ọnụọgụgụ ụmụ Perez niile bi na Jerusalem dị narị anọ, na iri isii na asatọ (468). Ha bụ ndị ikom gbara dimkpa.
6 Total dos filhos de Fares que habitaram em Jerusalém: 468 homens valentes.
7 Ndị sitere nʼagbụrụ Benjamin bụ,
7 Eis os filhos de Benjamim: Selum, filho de Mosolão, filho de Joed, filho de Fadaías, filho de Colaías, filho de Maasias, filho de Eteel, filho de Isaías,
8 ya na ndị na-eso ya bụ ụmụ Gabai na Salai. Ọnụọgụgụ ha dị narị itoolu na iri abụọ na asatọ (928).
8 e depois dele Gebai, Selai. Ao todo, 928.
9 Juel nwa Zikri bụ onyeisi ha. Juda nwa Hasenua bụ onye na-eso ya, na onye na-achị akụkụ ọhụrụ nke obodo ahụ.
9 Joel, filho de Zecri, era o chefe e Judá, filho de Senua, o segundo comandante da cidade.
10 Ndị sitere nʼetiti ndị nchụaja bụ,
10 Entre os sacerdotes: Idaías, filho de Joiarib, Jaquin,
11 na Seraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, nwa Meraiot, nwa Ahitub onye na-elekọta ụlọ ukwuu Chineke.
11 Saraías, filho de Helcias, filho de Mosolão, filho de Sadoc, filho de Meraiot, filho de Aquitob, príncipe da casa de Deus,
12 Ọnụọgụgụ ndị ikom ha na ha na-arụkọ ọrụ nʼụlọ ukwu ahụ bụ narị asatọ na iri abụọ na abụọ (822).
12 e seus irmãos que trabalhavam no serviço do templo: 822; Adaías, filho de Jeroão, filho de Felelias, filho de Amsi, filho de Zacarias, filho de Fasur, filho de Melquias,
13 na ndị ikom bụ ndịisi ezinaụlọ ndị so ya rụọ ọrụ dị narị abụọ na iri anọ na abụọ (242) nʼọnụọgụgụ,
13 e seus irmãos, chefes de família: 242; e Amassai, filho de Azrael, filho Aazi, filho de Mosolamot, filho de Emmer,
14 na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ (128) nʼọnụọgụgụ.
14 e seus irmãos, fortes e valentes, em número de 128. Zabdiel, filho de Hagdolim, era o seu chefe.
15 Site na ndị Livayị:
15 Entre os levitas: Semeías, filho de Hasub, filho de Azaricã, filho de Hasabias, filho de Boni;
16 na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;
16 Sabatai e Jozabed, superintendentes dos trabalhos exteriores da casa de Deus, entre os chefes dos levitas;
17 Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele.
17 Matanias, filho de Mica, filho de Zebedeu, filho de Asaf, o chefe que entoava o cântico de louvores no tempo da oração; Becbecias, o segundo entre os seus irmãos, e Abda, filho de Samua, filho de Galal, filho de Iditum.
18 Ọnụọgụgụ ndị Livayị niile nọ na obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ (284).
18 Total dos levitas residentes na cidade santa: 284.
19 Ndị nche ọnụ ụzọ ama,
19 E os porteiros: Acub, Telmon e seus irmãos, guardiães das portas: 172.
20 Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya.
20 O restante dos israelitas, sacerdotes e levitas, estabeleceu-se em todas as outras cidades de Judá, cada um em sua propriedade.
21 Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa.
21 Os natineus estabeleceram-se no quarteirão de Ofel, tendo à frente Sia e Gasfa.
22 Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke.
22 O chefe dos levitas de Jerusalém era Azi, filho de Bani, filho de Hasabias, filho de Matanias, filho de Mica, um dos cantores filho de Asaf, encarregado do serviço da casa de Deus.
23 Eze họpụtara ndị ọbụ abụ nyekwa ha ọrụ ha kwesiri ịrụ ụbọchị niile.
23 Havia uma ordem do rei concernente a eles, e um salário determinado era entregue quotidianamente aos seus cantores.
24 Petahaya nwa Meshezabel, onye bụ otu nʼagbụrụ Zera, nwa Juda, bụ onyeozi eze banyere ihe niile gbasara ndị mmadụ ahụ.
24 Fataías, filho de Mesezebel, da linhagem de Zara, filho de Judá, era comissário do rei para todos os negócios civis.
25 Obodo ụfọdụ ebe ndị Juda bi bụ ndị a: Kiriat Aba, Dibọn, Jekabzeel na obodo nta ndị dị ha gburugburu,
25 Quanto às pequenas cidades e seus arredores, descendentes de Judá, estabeleceram-se em Cariat-Arbé e em suas aldeias, em Dibon e em suas aldeias, em Cabseel e em suas aldeias;
26 Jeshua, Molada, Bet-Pelet,
26 em Jesué, em Molada, em Bet-Falet,
27 Haza Shual, Bịasheba na obodo ya niile,
27 em Hasersual, em Bersabéia e em suas aldeias;
28 Ziklag, Mekona na obodo ya niile,
28 em Siceleg, em Mocona e em suas aldeias;
29 En-Rimọn, Zora, Jamut,
29 em En-Remon, em Saraá, em Jerimut,
30 Zanoa, Adulam na obodo nta dị ha gburugburu, Lakish, ala dị ya gburugburu, Azeka na obodo ya niile. Nke a pụtara na ndị mmadụ bi site na Bịasheba ruo na Ndagwurugwu Hinom.
30 em Zanoé, em Odolão e em suas aldeias, em Laquis e no seu território; em Azeca e nas suas aldeias. Estabeleceram-se desde Bersabéia até o vale de Enom.
31 Ndị agbụrụ Benjamin biri na Geba, Mikmash, Aija, Betel na obodo dị ya gburugburu,
31 Descendentes de Benjamim estabeleceram-se desde Geba, até Macmas, Hai, Betel e em suas aldeias,
32 Anatot, Nob, Ananaya,
32 em Anatot, em Nobe, em Anania,
33 Hazọ, Rema, Gitaim,
33 em Asor, em Rama, Getaim,
34 Hadid, Zeboim, Nebalat,
34 em Hadid, em Seboim, em Nebalat,
35 Lod, Ono na Ge Harashim.
35 em Lod e em Ono, no vale dos operários.
36 Ụfọdụ nʼotu ndị Livayị, ndị ebe obibi ha dị na Juda ka e zigara isoro biri nʼebo Benjamin.
36 Entre os levitas, houve classes pertencentes a Judá que se uniram à tribo de Benjamim.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Neemias 11, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.