Mateus 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ARA

Sair da comparação
ARA Almeida Revista e Atualizada 1993
1 Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.
1 A seguir, foi Jesus levado pelo Espírito ao deserto, para ser tentado pelo diabo.
2 Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
2 E, depois de jejuar quarenta dias e quarenta noites, teve fome.
3 Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”
3 Então, o tentador, aproximando-se, lhe disse: Se és Filho de Deus, manda que estas pedras se transformem em pães.
4 Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịchaka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’”
4 Jesus, porém, respondeu: Está escrito:
5 Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu,
5 Então, o diabo o levou à Cidade Santa, colocou-o sobre o pináculo do templo
6 sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị,
6 e lhe disse: Se és Filho de Deus, atira-te abaixo, porque está escrito: Aos seus anjos ordenará a teu respeito que te guardem; e: Eles te susterão nas suas mãos, para não tropeçares nalguma pedra.
7 Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’”
7 Respondeu-lhe Jesus: Também está escrito:
8 Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.
8 Levou-o ainda o diabo a um monte muito alto, mostrou-lhe todos os reinos do mundo e a glória deles
9 Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”
9 e lhe disse: Tudo isto te darei se, prostrado, me adorares.
10 Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’”
10 Então, Jesus lhe ordenou: Retira-te, Satanás, porque está escrito:
11 Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.
11 Com isto, o deixou o diabo, e eis que vieram anjos e o serviram.
12 Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili.
12 Ouvindo, porém, Jesus que João fora preso, retirou-se para a Galileia;
13 Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị.
13 e, deixando Nazaré, foi morar em Cafarnaum, situada à beira-mar, nos confins de Zebulom e Naftali;
14 Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị,
14 para que se cumprisse o que fora dito por intermédio do profeta Isaías:
15 “Ala Zebụlọn na ala Naftalị,
15 Terra de Zebulom, terra de Naftali, caminho do mar, além do Jordão, Galileia dos gentios!
16 ndị nọ nʼọchịchịrị
16 O povo que jazia em trevas viu grande luz, e aos que viviam na região e sombra da morte resplandeceu-lhes a luz.
17 Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
17 Daí por diante, passou Jesus a pregar e a dizer: Arrependei-vos, porque está próximo o reino dos céus.
18 Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.
18 Caminhando junto ao mar da Galileia, viu dois irmãos, Simão, chamado Pedro, e André, que lançavam as redes ao mar, porque eram pescadores.
19 Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
19 E disse-lhes: Vinde após mim, e eu vos farei pescadores de homens.
20 Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya.
20 Então, eles deixaram imediatamente as redes e o seguiram.
21 Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha,
21 Passando adiante, viu outros dois irmãos, Tiago, filho de Zebedeu, e João, seu irmão, que estavam no barco em companhia de seu pai, consertando as redes; e chamou-os.
22 ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
22 Então, eles, no mesmo instante, deixando o barco e seu pai, o seguiram.
23 Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ.
23 Percorria Jesus toda a Galileia, ensinando nas sinagogas, pregando o evangelho do reino e curando toda sorte de doenças e enfermidades entre o povo.
24 Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile.
24 E a sua fama correu por toda a Síria; trouxeram-lhe, então, todos os doentes, acometidos de várias enfermidades e tormentos: endemoninhados, lunáticos e paralíticos. E ele os curou.
25 Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya.
25 E da Galileia, Decápolis, Jerusalém, Judeia e dalém do Jordão numerosas multidões o seguiam.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Mateus 4, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.