Levítico 27
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
1 O Senhor disse a Moisés: "Dize aos israelitas o seguinte:
2 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ e kwee nkwa pụrụ iche iji mmadụ nye Onyenwe anyị onyinye, ihe ndị a ka ọ ga-eji gbara onye ahụ:
2 se alguém fizer um voto, as pessoas serão do Senhor segundo a tua avaliação.
3 nʼisi nwoke ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii, ọ ga-akwụ iri ọlaọcha shekel ise, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị.
3 Se se tratar de um homem de vinte a sessenta anos, o valor será de cinqüenta siclos de prata, segundo o siclo do santuário;
4 Nʼisi nwanyị ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel atọ.
4 se for uma mulher, o valor será de trinta siclos.
5 Nʼisi nwoke gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel abụọ. Nʼisi nwanyị gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye ọlaọcha shekel iri.
5 Para a idade de cinco a vinte anos, o valor será de vinte siclos para o menino, e dez siclos para a menina.
6 A ga-akwụrụ nwantakịrị nwoke gbara site otu ọnwa ruo afọ ise, ọlaọcha shekel ise, kwụọra nwantakịrị nwanyị gbara otu ọnwa ruo afọ ise ọlaọcha shekel atọ.
6 De um mês até cinco anos, o valor será de cinco siclos de prata para um menino, e três para uma menina.
7 Nʼisi nwoke gafere iri afọ isi, a ga-enye ọlaọcha shekel iri na ise. Nʼisi nwanyị gafere iri afọ isi a ga-enye ọlaọcha shekel iri.
7 Aos sessenta anos, e daí para cima, a estimação será de quinze siclos para um homem e dez siclos para uma mulher.
8 Ọ bụrụ na e nwee onye ogbenye na-enweghị ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị a, a ga-akpọtara ya onye nchụaja, onye ga-ekwubi ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụ dịka ego o nwere ruru.
8 Se aquele que tiver feito o voto for demasiado pobre e não puder pagar o valor que avaliaste, apresentar-se-á ao sacerdote, que fixará o valor segundo as posses daquele que fez o voto.
9 “ ‘Ọ bụrụ anụ ụlọ dị mma inye Onyenwe anyị dịka onyinye ka e kwere nkwa inye, anụ ụlọ e nyere Onyenwe anyị ga-aghọ ihe dị nsọ.
9 Se se tratar de animais que se podem oferecer ao Senhor, todo animal que assim se tiver dado ao Senhor será coisa santa.
10 Onye kwere nkwa inye ya enweghị ike iji anụ ụlọ nke ahụ ya na-ezughị oke gbanwere anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ. O nwekwaghị ike iji anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ gbanwere nke anụ ahụ ya na-ezughị oke. Ọ bụrụ na o mee otu a, anụ ụlọ nke mbụ, na nke abụọ, ga-abụ ihe dị nsọ.
10 Não poderá ser trocado nem substituído, bom por mau, ou mau por bom. Mas, se se trocar um animal por outro, eles serão coisa santa, tanto um como o outro.
11 Ọ bụrụ na anụ ụlọ o ji kwee nkwa bụ anụ ụlọ rụrụ arụ, ụdị anụ ụlọ ahụ a jụrụ ịnabata dịka onyinye maka iji ya chụọ aja nye Onyenwe anyị, a ga-akpụtara onye nchụaja anụ ụlọ ahụ.
11 Se se tratar de um animal impuro que não se pode oferecer ao Senhor, será apresentado ao sacerdote:
12 Ọ bụ ya ka ọ dịrị ikpebi ma anụ ụlọ ahụ ọ dị mma, ma ọ jọrọ njọ. Ọnụ ego ọbụla onye nchụaja kpebiri, ka onye wetara anụ ụlọ ahụ ga-akwụ.
12 ele o avaliará, conforme for bom ou mau, e sua estimação determinará o preço.
13 Ọ bụrụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ụgwọ anụ ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa anụ ụlọ ahụ.
13 Se se quiser resgatá-lo, ajuntará uma quinta parte ao que tiver sido avaliado.
14 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ enye ụlọ ya, dịka ihe ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, onye nchụaja ga-ekpebi maọbụ ụlọ dị mma, ma ọ bụkwanụ ụlọ jọrọ njọ. Ọ ga-ekwukwa ihe bụ ọnụahịa ụlọ ahụ.
14 Se alguém consagrar ao Senhor a sua casa fazendo dela coisa santa, o sacerdote a avaliará segundo for boa ou má, e ela será vendida pelo preço dessa avaliação.
15 Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya.
15 Mas, se aquele que consagrou a sua casa quiser resgatá-la, ajuntará um quinto ao preço da avaliação, e ela lhe pertencerá de novo.
16 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ewere mpaghara ala ubi ezinaụlọ ya nye Onyenwe anyị ka ihe ido nsọ, ihe a ga-eji mata ọnụahịa ala ahụ ga-abụ ụdị ihe ubi e nwere ike ịkụ nʼime ya. Ọnụahịa ala ubi e nwere ike ịkụnye ọka balị ruru otu ihe ọtụtụ homa, ga-abụ iri mkpụrụ ego ọlaọcha shekel ise.
16 Se alguém consagrar ao Senhor uma parte da terra que lhe pertence, tu a avaliarás segundo a quantidade de grãos que se pode semear nela, à razão de cinqüenta siclos de prata por homer de cevada.
17 Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya.
17 Se consagrar o seu campo, a partir do ano do jubileu, far-se-á segundo a tua avaliação:
18 Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru.
18 mas, se o tiver feito depois do jubileu, o sacerdote estimará o seu preço segundo o número de anos que restam até o jubileu, e haverá uma redução sobre o preço da avaliação.
19 Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.
19 Se aquele que consagrou o seu campo quiser resgatá-lo, ajuntará um quinto ao preço fixado, e possui-lo-á.
20 Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị ala ahụ, maọbụ na o resila ya onye ọzọ, a gaghị agbapụtakwa ala ahụ ọzọ.
20 Se não o resgatar e o vender a outro, esse campo não poderá mais ser resgatado.
21 Mgbe mmemme afọ inwere onwe ruru, ala ahụ ga-aghọ ala dị nsọ, ala e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ndị nchụaja ga-ewere ya ka ọ bụrụ nke ha.
21 Quando o campo ficar livre no jubileu, será consagrado ao Senhor como um campo votado ao interdito, e tornar-se-á propriedade do sacerdote.
22 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e doro Onyenwe anyị ala ubi ọ zụrụ azụ nsọ, nke na-abụghị ala ezinaụlọ ha,
22 Se alguém consagrar ao Senhor um campo que comprou, o qual não faça parte de seu patrimônio,
23 onye nchụaja ga-agụ afọ ole ọ fọdụrụ ruo mmemme afọ inwere onwe. Ọ ga-agwa onye ahụ ego ole ọ ga-akwụ nʼihi ya. Ego ọbụla ọ kwụrụ nʼụbọchị ahụ ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
23 o sacerdote fixará o seu preço de acordo com a tua avaliação até o ano do jubileu, e esse homem pagará o preço fixado no mesmo dia; é uma coisa consagrada ao Senhor.
24 Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya.
24 No ano jubilar, o campo voltará ao vendedor, como patrimônio que lhe pertence.
25 Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel.
25 Todas as avaliações se farão em siclos do santuário. O siclo vale vinte gueras.
26 “ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke Onyenwe anyị.
26 Entretanto, ninguém poderá consagrar os primogênitos de seu gado, pois pertencem já ao Senhor pelo seu título de primogênito: seja um boi, seja uma ovelha, são propriedade do Senhor.
27 Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru.
27 Se se tratar de um animal impuro, será resgatado pelo preço que fixares, ajuntando-se mais uma quinta parte; se não for resgatado, será vendido segundo a tua avaliação.
28 “ ‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye Onyenwe anyị, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.
28 Se um homem consagrar ao Senhor por interdito alguma coisa que lhe pertence, seja qual for esse objeto - uma pessoa, um animal ou um campo de seu patrimônio - ela não poderá ser vendida, nem resgatada: tudo o que é votado por interdito é coisa consagrada ao Senhor.
29 “ ‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ.
29 Nenhuma pessoa votada ao interdito poderá ser resgatada: ela será morta.
30 “ ‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke Onyenwe anyị. Ha bụ ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
30 Todos os dízimos da terra, tomados das sementes do solo ou dos frutos das árvores são propriedade do Senhor: é uma coisa consagrada ao Senhor.
31 Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya.
31 Se alguém quiser resgatar alguma coisa de seus dízimos, ajuntará uma quinta parte.
32 Otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe ehi na atụrụ niile, anụ nke iri ọbụla nke na-agabiga nʼokpuru mkpanaka onye ọzụzụ atụrụ mgbe a na-agụ ha ọnụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
32 Todos os dízimos do gado maior e menor, os dízimos do que passa sob o cajado do pastor, o décimo {animal} será consagrado ao Senhor.
33 A gaghị ahọ anụ ụlọ a na-enye Onyenwe anyị ahọ, ile ma ha dị mma, maọbụ na ha dị njọ. A gaghị agbanwekwa ha. Ọ bụrụ na a gbanwee ha, ndị e ji gbanwee ha na ndị a na-achọ ịgbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, a gaghị agbarakwa ha.’ ”
33 Não se fará escolha entre bom e mau e não se fará substituição. Se alguém o fizer, tanto o animal substituído como o que substituiu serão coisa consagrada: não poderão ser resgatados."
34 Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis nʼugwu Saịnaị ka ọ nye ụmụ Izrel.
34 Tais são as ordenações que o Senhor deu a Moisés para os israelitas no monte Sinai.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Levítico 27, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.