Levítico 26

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 “ ‘Unu emerela onwe unu arụsị ọbụla, maọbụ guzobe oyiyi apịrị apị, maọbụ ogidi nkume ọbụla ọtọ, nye onwe unu. Unu edokwala nkume a pịrị apị ọbụla nʼala unu maka ịkpọ isiala nye ya. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
1 "Não fareis ídolos. Não levantareis estátuas nem estelas, e não poreis em vossa terra pedra alguma adornada de figuras, para vos prostrardes diante dela, porque eu sou o Senhor, vosso Deus.
2 “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị Izuike m, sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
2 Guardareis os meus sábados e reverenciareis o meu santuário. Eu sou o Senhor.
3 “ ‘Ọ bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile,
3 Se seguirdes minhas leis e guardardes os meus preceitos e os praticardes, eu vos darei as chuvas nos seus tempos.
4 aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile.
4 A terra dará o seu produto e as árvores da terra se carregarão de frutos.
5 Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu.
5 A debulha do trigo prolongar-se-á até a vindima, e a vindima até a sementeira; comereis o vosso pão à saciedade, e habitareis em segurança na vossa terra.
6 “ ‘Aga m eme ka udo dịrị nʼala ahụ, unu ga-edina ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka unu tụọ egwu ọbụla. Aga m ewezuga site nʼetiti unu ajọ anụ ọhịa, mma agha agaghị esitekwa nʼala unu bi nʼime ya gafee.
6 Darei paz à vossa terra, e vosso sono não será perturbado. Afastarei da terra os animais nocivos, e a espada não passará pela vossa terra.
7 Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
7 Quando perseguirdes os vossos inimigos, cairão sob vossa espada.
8 Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
8 Cinco dentre vós perseguirão um cento, e cem dos vossos perseguirão dez mil, e os vossos inimigos cairão sob vossa espada.
9 “ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide.
9 Eu me voltarei para vós, e vos farei crescer; multiplicar-vos-ei e ratificarei a minha aliança convosco.
10 Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ.
10 Comereis as colheitas antigas, bem conservadas, e lançareis fora as velhas, para dar lugar às novas.
11 Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi.
11 Porei o meu tabernáculo no meio de vós, e a minha alma não vos rejeitará.
12 Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.
12 Andarei entre vós: serei o vosso Deus e vós sereis o meu povo.
13 Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.
13 Eu sou o Senhor, vosso Deus, que vos tirei do Egito para livrar-vos da escravidão. Quebrei as cadeias de vosso jugo, e vos fiz andar com a cabeça erguida.
14 “ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya,
14 Mas se não me escutardes e não guardardes os meus mandamentos,
15 ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m,
15 se desprezardes os meus preceitos e vossa alma aborrecer as minhas leis, de sorte que não pratiqueis todos os meus mandamentos e violeis minha aliança, eis como vos hei de tratar:
16 mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha.
16 enviarei terríveis flagelos sobre vós: a tísica e a febre que empanarão vosso olhar e vos farão desfalecer. Debalde semeareis a vossa semente, porque vossos inimigos a comerão.
17 Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu.
17 Voltarei minha face contra vós e sereis vencidos pelos vossos inimigos: eles vos dominarão, e fugireis sem que ninguém vos persiga.
18 “ ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
18 Se nem ainda assim me ouvirdes, castigar-vos-ei sete vezes mais pelos vossos pecados.
19 Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz.
19 Quebrarei o orgulho de vosso poder, tornarei o vosso céu como ferro e a vossa terra como bronze.
20 Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.
20 Inutilmente se gastará a vossa força, pois vossa terra não dará os seus produtos, e as árvores da terra não produzirão os seus frutos.
21 “ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.
21 Se me puserdes obstáculos e não quiserdes ouvir-me, ferir-vos-ei sete vezes mais, conforme os vossos pecados.
22 Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole.
22 Mandarei contra vós as feras do campo, que devorarão vossos filhos, matarão vossos animais e vos reduzirão a um pequeno número, de modo que os vossos caminhos se tornarão desertos.
23 “ ‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m,
23 Se apesar desses castigos não vos quiserdes corrigir, e vos obstinardes em resistir-me,
24 mụ onwe m ga-ebu agha megide unu. Aga m eti unu ugbo ihe otiti asaa, nʼihi mmehie unu.
24 eu vos resistirei por minha vez e vos ferirei sete vezes mais, por causa dos vossos pecados.
25 Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.
25 Farei cair sobre vós a espada para vingar a minha aliança. Se vos ajuntardes em vossas cidades, lançarei a peste no meio de vós e sereis entregues nas mãos de vossos inimigos.
26 Aga m eme ka unu hapụ inwe ihe oriri ga-ezuru unu. Otu ite nri naanị ka ndị inyom iri ga-eji sie nri ha nwere. Ha ga-eji ihe ọtụtụ tụọ ya mgbe ha na-eke ya. Unu ga-eri ya, ma afọ agaghị eju unu.
26 Tirar-vos-ei o pão, vosso sustentáculo, de tal sorte que dez mulheres o cozerão em um só forno e vo-lo entregarão por peso; comereis e não ficareis saciados.
27 “ ‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m,
27 Se, apesar disso, não me ouvirdes, e me resistirdes ainda,
28 mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
28 marcharei contra vós em meu furor e vos castigarei sete vezes mais, por causa dos vossos pecados.
29 Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom.
29 Comereis a carne de vossos filhos e de vossas filhas.
30 Aga m ebibikwa ụlọ arụsị unu niile dị nʼelu ugwu, gbutuo ebe ịchụ aja niile unu na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi. Aga m atụkọta ozu unu nʼelu arụsị unu na-enweghị ume ndụ, ka unu bụrụ ihe m na-asọ oyi.
30 Destruirei vossos lugares altos e quebrarei vossas estelas solares; amontoarei vossos cadáveres sobre os de vossos ídolos, e minha alma vos abominará.
31 Aga m eme ka obodo unu niile tọgbọrọ nʼefu, kụdasịakwa ebe nsọ unu niile. Agaghị m anabatakwa isisi ụtọ nke aja unu.
31 Reduzirei a deserto as vossas cidades, devastarei vossos santuários e não aspirarei mais o suave odor de vossos perfumes.
32 Aga m eme ka ala unu tọgbọrọ nʼefu, mee ka ọnọdụ ịdị ala unu bụrụ ihe ga-eju ndị iro unu ga-ebi nʼime ya anya.
32 Desolarei vossa terra e vossos inimigos ficarão estupefatos com ela quando a habitarem.
33 Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile.
33 Eu vos dispersarei entre as nações, e desembainharei a espada atrás de vós; vossa terra será devastada e vossas cidades se tornarão desertas.
34 Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile.
34 Então gozará a terra os seus sábados enquanto durar a sua solidão, quando estiverdes na terra de vossos inimigos; então a terra gozará os seus sábados e repousará.
35 Ogologo oge niile ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ala ahụ ga-ezu ike, ụdị izuike ọ na-enweghị nʼafọ izuike ndị ahụ unu bi nʼime ya.
35 Nos dias em que for devastada, ela terá o repouso que não gozou nos sábados do tempo em que a habitáveis.
36 “ ‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ.
36 Naqueles dentre vós que sobreviverem, porei tal espanto em seus corações na terra de seus inimigos, que o ruído de uma folha agitada pelo vento os porá em fuga: fugirão como se foge diante da espada e cairão sem que ninguém os persiga.
37 Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu.
37 Sem que ninguém os persiga, tropeçarão uns sobre os outros, como diante da espada. Não podereis resistir aos vossos inimigos.
38 Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu.
38 Perecereis entre as nações e a terra inimiga vos consumirá.
39 Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.
39 Os que sobreviverem consumir-se-ão por causa de suas iniqüidades na terra de seus inimigos, e serão também consumidos por causa das iniqüidades de seus pais, que levarão sobre si.
40 “ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m,
40 Eles confessarão, então, as suas iniqüidades e as de seus pais, as transgressões cometidas contra mim, porque me resistiram;
41 nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha
41 e, por isso, eu também lhes resisti e os levei para a terra de seus inimigos. Se, então, humilharem o seu coração incircunciso e sofrerem a pena de sua iniqüidade,
42 aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ.
42 eu me lembrarei de minha aliança com Jacó, de minha aliança com Isaac e com Abraão, e lembrar-me-ei dessa terra.
43 Ma ala ahụ aghaghị ịtọgbọrọ nʼefu. Ọ ghakwaghị inwezu izuike ruuru ya, oge ndị ahụ ọ tọgbọrọ nʼefu, mgbe ha na-ebighị nʼime ya. Ha ga-anata ntaramahụhụ ruuru ha nʼihi na ha jụrụ iwu m, sọọkwa ụkpụrụ m oyi.
43 E, depois que eles a tiverem deixado, esta terra gozará os seus sábados enquanto for devastada longe deles; eles sofrerão a pena de suas iniqüidades, porque desprezaram os meus mandamentos e a sua alma feriu as minhas leis.
44 Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha, maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.
44 Apesar de tudo isso, quando estiverem na terra de seus inimigos, não os rejeitarei, nem os abominarei a ponto de exterminá-los e de romper minha aliança com eles; porque eu sou o Senhor, seu Deus.
45 Kama nʼihi ha, aga m echeta ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, ịbụ Chineke ha, ndị ahụ m kpọpụtara site nʼala Ijipt nʼihu mba niile. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
45 Lembrar-me-ei de minha aliança com seus pais, quando os tirei do Egito à vista das nações, para ser o seu Deus. Eu sou o Senhor."
46 Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ na ndụmọdụ Onyenwe anyị guzobere nʼugwu Saịnaị, nʼetiti ya onwe ya, na ụmụ Izrel, site nʼaka Mosis.
46 Tais são as ordenações, os mandamentos e as leis que o Senhor estabeleceu entre ele e os israelitas, por intermédio de Moisés, no monte Sinai.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Levítico 26, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.