Lucas 22

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NAA

Sair da comparação
NAA Nova Almeida Atualizada 2017
1 Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso.
1 Estava próxima a Festa dos Pães sem Fermento, chamada Páscoa.
2 Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ.
2 Os principais sacerdotes e os escribas procuravam uma forma de matar Jesus; porque temiam o povo.
3 Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya.
3 Ora, Satanás entrou em Judas, chamado Iscariotes, que era um dos doze.
4 Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha.
4 Judas foi entender-se com os principais sacerdotes e os capitães sobre como lhes entregaria Jesus.
5 Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego.
5 Eles se alegraram e combinaram em lhe dar dinheiro.
6 O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ.
6 Judas concordou e buscava uma boa ocasião para lhes entregar Jesus, longe da multidão.
7 O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja.
7 Chegou o dia da Festa dos Pães sem Fermento, em que era necessário fazer o sacrifício do cordeiro pascal.
8 O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”
8 Então Jesus enviou Pedro e João, dizendo:
9 Ha sịrị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoo maka ya?”
9 Eles lhe perguntaram: — Onde o senhor quer que a preparemos?
10 Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere.
10 Jesus lhes explicou:
11 Sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri Ngabiga?’
11 e digam ao dono da casa: “O Mestre pergunta: ‘Onde fica o aposento no qual comerei a Páscoa com os meus discípulos?’”
12 Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu dị nʼelu ụlọ nke e dozicharala ihe niile, kwadoonụ nri anyị nʼebe ahụ.”
12 Ele lhes mostrará um espaçoso cenáculo mobiliado; ali façam os preparativos.
13 Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ.
13 E, indo, acharam tudo como Jesus lhes tinha dito e prepararam a Páscoa.
14 Mgbe oge awa ahụ ruru, ya na ndị na-eso ụzọ ya gara ebe ahụ nọdụ ala iri ihe.
14 Chegada a hora, Jesus se pôs à mesa, e os apóstolos estavam com ele.
15 Ọ sịrị ha, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ ka mụ na unu rie nri Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.
15 Então Jesus lhes disse:
16 Nʼihi na asị m unu, agaghị m erikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe a ga-emezu ya nʼalaeze Chineke.”
16 Pois eu lhes digo que nunca mais a comerei, até que ela se cumpra no Reino de Deus.
17 O buru iko, mgbe o nyechara ekele ọ sịrị, “Burunu nke a kesaa nʼetiti unu.
17 E, pegando um cálice, depois de ter dado graças, disse:
18 Nʼihi na asị m unu, site ugbu a ga nʼihu, agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.”
18 Pois eu digo a vocês que, de agora em diante, não mais beberei do fruto da videira, até que venha o Reino de Deus.
19 O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, “Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
19 E, pegando um pão, tendo dado graças, o partiu e lhes deu, dizendo:
20 Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu.
20 Do mesmo modo, depois da ceia, pegou o cálice, dizendo:
21 Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.
21 — Mas eis que a mão do traidor está comigo à mesa.
22 Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.”
22 Pois o Filho do Homem vai segundo o que está determinado, mas ai daquele por quem ele está sendo traído!
23 Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.
23 Então começaram a perguntar entre si qual deles seria o que estava para fazer isso.
24 Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya.
24 Houve também entre eles uma discussão sobre qual deles parecia ser o maior.
25 Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.
25 Mas Jesus lhes disse:
26 Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.
26 Mas vocês não são assim; pelo contrário, o maior entre vocês seja como o menor; e aquele que dirige seja como o que serve.
27 Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.
27 Pois qual é maior: aquele que está à mesa ou aquele que serve? Não é verdade que é aquele que está à mesa? Pois, no meio de vocês, eu sou como quem serve.
28 Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
28 Vocês são os que têm permanecido comigo nas minhas tentações.
29 Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.
29 E eu confio a vocês um reino, assim como o meu Pai confiou a mim,
30 Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
30 para que comam e bebam à minha mesa no meu Reino; e vocês se assentarão em tronos para julgar as doze tribos de Israel.
31 “Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti.
31 — Simão, Simão, eis que Satanás pediu para peneirar vocês como trigo!
32 Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.”
32 Eu, porém, orei por você, para que a sua fé não desfaleça. E você, quando voltar para mim, fortaleça os seus irmãos.
33 Ma ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa gị nwụọ.”
33 Porém Pedro respondeu: — Estou pronto para ir com o Senhor, tanto para a prisão como para a morte.
34 Jisọs zara, “Agwa m gị Pita, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ, si na ị maghị onye m bụ.”
34 Mas Jesus lhe disse:
35 Ọ gwara ha, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?”
35 A seguir, Jesus perguntou aos discípulos: Eles responderam: — Não faltou nada!
36 Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu.
36 Então Jesus lhes disse:
37 Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.”
37 Pois eu lhes digo que é preciso que se cumpra em mim o que está escrito: “Ele foi contado com os malfeitores.” Pois o que a mim se refere está sendo cumprido.
38 Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.”
38 Então lhe disseram: — Senhor, aqui estão duas espadas! Jesus lhes respondeu:
39 Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.
39 E, saindo, Jesus foi, como de costume, para o monte das Oliveiras; e os discípulos o acompanharam.
40 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
40 Chegando ao lugar escolhido, Jesus lhes disse:
41 Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị,
41 Ele, por sua vez, se afastou um pouco, e, de joelhos, orava,
42 “Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.”
42 dizendo:
43 Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume.
43 Então lhe apareceu um anjo do céu que o confortava.
44 Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.
44 E, estando em agonia, orava mais intensamente. E aconteceu que o suor dele se tornou como gotas de sangue caindo sobre a terra.
45 Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi.
45 Levantando-se da oração, Jesus foi até onde os discípulos estavam, e os encontrou dormindo de tristeza.
46 Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
46 E disse:
47 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ.
47 Enquanto Jesus ainda falava, eis que chegou uma multidão. E um dos doze, que se chamava Judas, vinha à frente deles e se aproximou de Jesus para o beijar.
48 Ma Jisọs sịrị ya, “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?”
48 Jesus, porém, lhe disse:
49 Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe gaje ime, ha sịrị, “Onyenwe anyị, ọ bụ anyị were mma agha gbuo?”
49 Os que estavam ao redor de Jesus, vendo o que estava por acontecer, perguntaram: — Senhor, devemos atacar com as espadas?
50 Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya.
50 Um deles golpeou o servo do sumo sacerdote e cortou-lhe a orelha direita.
51 Ma Jisọs sịrị, “O zuola!” O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya.
51 Mas Jesus interveio, dizendo: E, tocando na orelha do homem, o curou.
52 Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ndịisi nchụaja, na ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu na ndị okenye, “Gịnị mere unu ji chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m, dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi o ji egbe ezu?
52 Então Jesus disse aos principais sacerdotes, capitães do templo e anciãos que vieram prendê-lo:
53 Mgbe mụ na unu na-anọ kwa ụbọchị nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma ugbu a bụ oge awa unu bụrụkwa mgbe ike ọchịchịrị na-achị achị.”
53 Todos os dias, estando eu com vocês no templo, vocês não tentaram me prender. Esta, porém, é a hora de vocês e a hora do poder das trevas.
54 Mgbe ahụ ha jidere ya duru ya pụọ, gaa nʼụlọ onyeisi nchụaja. Pita sokwara ha nʼazụ kama ọ nọ nʼebe dị anya.
54 Então, prendendo Jesus, levaram-no e o introduziram na casa do sumo sacerdote. Pedro seguia de longe.
55 Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala.
55 Quando acenderam um fogo no meio do pátio e se assentaram juntos, Pedro tomou lugar entre eles.
56 Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.”
56 Uma empregada, vendo-o sentado perto do fogo, fixou os olhos nele e disse: — Este também estava com ele.
57 Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.”
57 Mas Pedro negou, dizendo: — Mulher, não o conheço.
58 Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, “Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha.”
58 Pouco depois, outro homem, ao ver Pedro, disse: — Você também é um deles. Mas Pedro disse: — Homem, eu não sou um deles.
59 Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, “Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na ọ bụ onye Galili.”
59 E, tendo passado cerca de uma hora, outro afirmou, dizendo: — Com certeza este também estava com ele, porque também é galileu.
60 Pita sịrị, “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu maka ya?” Dị ka ọ kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa.
60 Mas Pedro insistiu: — Homem, não sei do que você está falando. E logo, enquanto Pedro ainda falava, o galo cantou.
61 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
61 Então, o Senhor voltou-se e fixou os olhos em Pedro. E Pedro se lembrou da palavra do Senhor, como lhe tinha dito: “Hoje, antes que o galo cante, você me negará três vezes.”
62 Ma ọ pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute.
62 E Pedro, saindo dali, chorou amargamente.
63 Ndị ahụ na-eche ya nche bidoro na-akwa ya emo na-etikwa ya ihe.
63 Os homens que detinham Jesus zombavam dele, davam-lhe pancadas e,
64 Ha jiri akwa kechie ya anya, sị ya, “Buo amụma, onye tiri gị ihe?”
64 colocando uma venda sobre os olhos dele, diziam: — Profetize! Quem foi que bateu em você?
65 Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ na nke mkparị megide ya.
65 E muitas outras coisas diziam contra ele, blasfemando.
66 Mgbe chi bọrọ, nzukọ ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu zukọtara, a kpọtakwara Jisọs nʼihu ha.
66 Logo que amanheceu, reuniu-se a assembleia dos anciãos do povo, tanto os principais sacerdotes como os escribas, e o conduziram ao Sinédrio, onde lhe disseram:
67 Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.”
67 — Se você é o Cristo, diga-nos. Então Jesus lhes respondeu:
68 Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m.
68 E, se eu perguntar, vocês não me darão resposta.
69 Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.”
69 Desde agora, o Filho do Homem estará sentado à direita do Deus Todo-Poderoso.
70 Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?”
70 Todos perguntaram: — Então você é o Filho de Deus? Jesus respondeu:
71 Mgbe ahụ ha sịrị, “Gịnị mere anyị ji na-achọ onye akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ ya site nʼọnụ ya.”
71 Eles disseram: — Que necessidade ainda temos de testemunho? Porque nós mesmos ouvimos o que ele falou.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Lucas 22, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.