Lucas 18
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH
1 Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka,
1 Jesus contou a seguinte parábola , mostrando aos discípulos que deviam orar sempre e nunca desanimar:
2 ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ.
2 — Em certa cidade havia um juiz que não
3 Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’
3 Nessa cidade morava uma viúva que sempre o procurava para pedir justiça, dizendo: “Ajude-me e julgue o meu caso contra o meu adversário!”
4 “Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ.
4 — Durante muito tempo o juiz não quis julgar o caso da viúva, mas afinal pensou assim: “É verdade que eu não temo a Deus e também não respeito ninguém.
5 Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ”
5 Porém, como esta viúva continua me aborrecendo, vou dar a sentença a favor dela. Se eu não fizer isso, ela não vai parar de vir me amolar até acabar comigo.”
6 Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu.
6 E o Senhor continuou:
7 Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka?
7 Será, então, que Deus não vai fazer justiça a favor do seu próprio povo, que grita por socorro dia e noite? Será que ele vai demorar para ajudá-lo?
8 Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
8 Eu afirmo a vocês que ele julgará a favor do seu povo e fará isso bem depressa. Mas, quando o
9 Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya.
9 Jesus também contou esta parábola para os que achavam que eram muito bons e desprezavam os outros:
10 “Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ.
10 — Dois homens foram ao Templo para orar. Um era
11 Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a.
11 O fariseu ficou de pé e orou sozinho, assim: “Ó Deus, eu te agradeço porque não sou avarento, nem desonesto, nem imoral como as outras pessoas. Agradeço-te também porque não sou como este cobrador de impostos.
12 Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’
12 Jejuo duas vezes por semana e te dou a décima parte de tudo o que ganho.”
13 “Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’
13 — Mas o cobrador de impostos ficou de longe e nem levantava o rosto para o céu. Batia no peito e dizia: “Ó Deus, tem pena de mim, pois sou pecador!”
14 “Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
14 E Jesus terminou, dizendo:
15 Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba.
15 Depois disso, algumas pessoas levaram as suas crianças a Jesus para que ele as abençoasse, mas os discípulos viram isso e repreenderam aquelas pessoas.
16 Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.
16 Então Jesus chamou as crianças para perto de si e disse:
17 Nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
17 Eu afirmo a vocês que isto é verdade: quem não receber o Reino de Deus como uma criança nunca entrará nele.
18 Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.”
18 Certo líder judeu perguntou a Jesus: — Bom Mestre, o que devo fazer para conseguir a vida eterna?
19 Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
19 Jesus respondeu:
20 Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.”
20 Você conhece os mandamentos: “Não cometa adultério, não mate, não roube, não dê falso testemunho contra ninguém, respeite o seu pai e a sua mãe.”
21 Ọ sịrị, “Edebezuchaala m iwu ndị a niile site na mgbe m bụ nwata.”
21 O homem respondeu: — Desde criança eu tenho obedecido a todos esses mandamentos.
22 Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”
22 Quando Jesus ouviu isso, disse:
23 Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ.
23 Quando o homem ouviu isso, ficou muito triste, pois era riquíssimo.
24 Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke.
24 Vendo a tristeza dele, Jesus disse:
25 Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
25 É mais difícil um rico entrar no Reino de Deus do que um camelo passar pelo fundo de uma agulha.
26 Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
26 Os que ouviram isso perguntaram: — Então, quem é que pode se salvar?
27 Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”
27 Jesus respondeu:
28 Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!”
28 Aí Pedro disse: — Veja! Nós deixamos a nossa família e seguimos o senhor.
29 Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke
29 Jesus respondeu:
30 nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.”
30 receberá ainda nesta vida muito mais e, no futuro, receberá a vida eterna.
31 Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu.
31 Jesus levou os doze discípulos para um lado e disse:
32 A ga-arara ya nyefee ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, mee ya ihe ihere, bụkwaa ya ọnụ mmiri asụ.
32 Ele será entregue aos não judeus, e estes vão zombar dele, insultá-lo, cuspir nele
33 Ha ga-apịa ya ihe, gbukwaa ya; ma nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie ọzọ.”
33 e bater nele; e depois o matarão. Mas no terceiro dia ele ressuscitará.
34 Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru.
34 Os discípulos não entenderam nada do que Jesus disse. O que essas palavras queriam dizer estava escondido deles, e eles não sabiam do que Jesus estava falando.
35 O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.
35 Jesus já estava chegando perto da cidade de Jericó. Acontece que um cego estava sentado na beira do caminho, pedindo esmola.
36 Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme.
36 Quando ouviu a multidão passando, ele perguntou o que era aquilo.
37 Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.”
37 — É Jesus de Nazaré que está passando! — responderam.
38 O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!”
38 Aí o cego começou a gritar: — Jesus,
39 Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!”
39 As pessoas que iam na frente o repreenderam e mandaram que ele calasse a boca. Mas ele gritava ainda mais: — Filho de Davi, tenha pena de mim!
40 Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya,
40 Jesus parou e mandou que trouxessem o cego. Quando ele chegou perto, Jesus perguntou:
41 “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”
41 — O que é que você quer que eu faça? — Senhor, eu quero ver de novo! — respondeu ele.
42 Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.”
42 Então Jesus disse:
43 Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.
43 No mesmo instante o homem começou a ver e, dando glória a Deus, foi seguindo Jesus. E todos os que viram isso começaram a louvar a Deus.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Lucas 18, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.