Juízes 18
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC
1 Nʼoge ahụ kwa, ụmụ Izrel enweghị eze ọbụla na-achị ha.
1 Naquele tempo não havia rei em Israel. Por essa mesma época a tribo de Dá buscava uma possessão para habitar nela, porque até então nada tinha recebido entre as tribos de Israel.
2 Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya.
2 Os danitas enviaram cinco dos seus, cinco homens valorosos escolhidos dentre todas as suas famílias de Sorea e de Estaol, para explorarem cuidadosamente a terra: Ide, disseram-lhes, e examinai bem a terra. Foram e chegaram à montanha de Efraim, e entraram na casa de Micas, onde passaram a noite.
3 Mgbe ha nọ nso ụlọ Maịka, ha nụrụ asụsụ nwokorobịa onye Livayị ahụ bụ onye nchụaja. Ha kpọpụtara ya nʼotu akụkụ jụọ ya ajụjụ sị, “Onye kpọtara gị ebe a? Gịnị ka ị na-eme nʼebe a? Gịnị mere i ji bịa nʼebe a?”
3 Perto da casa de Micas ouviram a voz do jovem levita e, aproximando-se dele, disseram-lhe: Quem te trouxe aqui? Que fazes aqui? Por que te encontras neste lugar?
4 Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.”
4 Respondeu-lhes o jovem: Micas fez-me isto e isso; deu-me um salário e eu sirvo-lhe, de sacerdote.
5 Ha sịrị ya, “Ọ dị mma! Biko, jụta Chineke ase, chọpụta ma ije anyị a ọ ga-agakwa nke ọma.”
5 Consulta então, replicaram-lhe, o teu deus a fim de saber se nossa viagem será bem sucedida.
6 Onye nchụaja ahụ zara sị ha, “Gaa nʼudo. Ije unu nwere ngọzị Onyenwe anyị.”
6 O sacerdote respondeu: Ide em paz: vossa viagem está sob o olhar de Deus.
7 Ya mere, ndị ikom ise ndị ahụ biliri ije bịaruo nʼobodo Laish, ebe ha hụrụ na ndị ahụ na-ebi nʼudo, na-enweghị nsogbu ọbụla. Ha dịka ndị obodo Saịdọn, ndị onwe ha juru afọ, ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha bụ ndị bara ụba, ebe ọ dịghị ihe ọbụla kọrọ ụkọ nʼala ahụ. Ọzọ, ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo ndị Saịdọn. Ọ dịkwaghị ihe ha na mmadụ ọbụla nwekọrọ.
7 Os cinco homens puseram-se a caminho e foram até Lais. Viram ali um povo que habitava seguro, pacífico e tranqüilo, segundo o costume dos sidônios. Não havia naquele terra nenhum rei que dominasse sobre os seus habitantes, ou que os molestasse em coisa alguma. Viviam longe dos sidônios e não tinham relações com ninguém.
8 Mgbe ndị nnyocha ahụ laghachiri nʼobodo Zora na Eshtaol, ndị ebo Dan ibe ha jụrụ ha, sị, “Unu si aṅaa jee? Gịnị ka unu chọpụtara?”
8 Voltando para seus irmãos em Sorea e Estaol, estes disseram: Que pudestes fazer?
9 Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya.
9 Eles responderam: Vamos, subamos contra eles. Vimos a sua terra que é excelente. Por que ficais aí sem nada dizer? Não demoreis a pôr-vos em marcha para tomar posse dessa terra.
10 Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.”
10 Quando ali entrardes, encontrareis um povo que vive em segurança e uma terra espaçosa que Deus vos entregará nas mãos, uma região onde nada falta daquilo que a terra produz.
11 Ya mere, narị ndị agha isii ndị si nʼebo Dan biliri gaa ibuso obodo ahụ agha. Ha sikwa Zora na Eshtaol pụọ.
11 Seiscentos homens da família de Dá partiram, pois, de Sorea e de Estaol, munidos com armas de guerra
12 Mgbe ha na-aga, ha rutere Kiriat Jearim, nke dị na Juda, maa ụlọ ikwu ha nʼebe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Kiriat Jearim Mahane Dan ruo taa.
12 e acamparam em Cariatiarim, em Judá. Por isso deu-se àquele lugar o nome de Mahanê-Dã, o qual assim se chama ainda hoje, e está situado ao ocidente de Cariatiarim.
13 Emesịa, ha pụrụ nʼala ugwu ugwu Ifrem, bịarute nʼụlọ Maịka.
13 Dali passaram às montanhas de Efraim e chegaram à casa de Micas.
14 Mmadụ ise ndị ahụ gara nnyochapụta ala (ya bụ ala Laish) ahụ gwara ụmụnna ha sị, “Unu maara na nʼime otu ụlọ ndị a na e nwere efọọd, nʼụfọdụ arụsị ezinaụlọ ndị dị iche iche, na oyiyi a kpụrụ akpụ nke eji ọla wuo? Ugbu a, maranụ ihe unu ga-eme.”
14 E os cinco homens que tinham sido enviados a explorar a terra de Lais disseram aos seus irmãos: Sabeis que há nessa casa um efod, uns terafim e um ídolo fundido? Considerai agora o que tendes a fazer.
15 Ya mere, ha gara nʼebe ahụ, banye nʼụlọ nwokorobịa Livayị ahụ, ebe o bi nʼụlọ Maịka, jụọ ya maka ọdịmma ya.
15 Dirigiram-se para lá e entraram na casa do jovem levita, em casa de Micas, para saudá-lo e informar-se de como ia passando.
16 Narị ndị ikom Dan, ndị jikere ibu agha, guzo nʼọnụ ụzọ ama.
16 Entretanto, os seiscentos danitas, armados como estavam, ficaram à porta.
17 Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama.
17 Os cinco exploradores penetraram {sozinhos} na capela e tomaram o ídolo com o efod e os terafim, enquanto o sacerdote se achava com os seiscentos homens armados à entrada da porta.
18 Mgbe ndị ikom ahụ banyere nʼụlọ Maịka buru arụsị ọla ahụ, efọọd ahụ na arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ, onye nchụaja ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme?”
18 Tiraram, pois, da casa de Micas, o ídolo, o efod e os terafim. O sacerdote disse-lhes: Que fazeis vós?
19 Ha zara sị ya, “Mechie ọnụ gị! Ekwukwala okwu ọbụla. Soro anyị bịa bụrụ nna anyị na onye nchụaja anyị. Ọ ga-abara gị uru karịa ịbụ onye nchụaja nye otu ebo na otu agbụrụ nʼIzrel, karịa ịbụ onye nchụaja nke naanị otu nwoke nʼime ezinaụlọ ya.”
19 Cala-te, responderam-lhe, põe a mão na boca e vem conosco; tu nos servirás de pai e de sacerdote. O que é melhor para ti: ser sacerdote na casa de um particular, ou numa tribo e numa família de Israel?
20 Mgbe ahụ, obi tọrọ nwokorobịa onye nchụaja ahụ ụtọ isoro ha gaa. O buuru efọọd ahụ, arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ na oyiyi ahụ a pịrị apị soro ndị ahụ gawa.
20 Alegrou-se o coração do sacerdote, e ele, tomando o efod, os terafim e o ídolo, foi com a tropa.
21 Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha.
21 Puseram-se de novo a caminho, precedidos das crianças, do gado e das bagagens.
22 Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha.
22 Estando eles já longe da casa de Micas, os vizinhos deste ajuntaram-se e perseguiram os danitas.
23 Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?”
23 Interrogados, os filhos de Dã voltaram-se e disseram a Micas: Que queres tu, e por que trazes toda essa gente?
24 Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’ ”
24 Ele respondeu: Tirastes os meus deuses que fiz para mim, tomastes o sacerdote e partistes. Que me resta agora? E como podeis perguntar o que quero?
25 Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.”
25 Os danitas replicaram: Nem mais uma palavra diante de nós! Não suceda que alguns se impacientem contra vós e percais a vida, tu e tua família!
26 Ya mere, ndị ebo Dan gbara ya nkịtị na-aga ebe ha na-aga. Mgbe Maịka hụrụ na ha dị ọtụtụ karịa ya, ọ hapụrụ ha, tụgharịa laghachi nʼụlọ ya.
26 E os danitas continuaram o seu caminho. Micas, vendo que aqueles homens eram mais fortes que ele, voltou para a sua casa.
27 Ụmụ Dan chịịrị arụsị ahụ niile Maịka mere, durukwa onye nchụaja ya gawa nʼobodo Laish, obodo nọ nʼudo, nke na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha busoro ndị obodo ahụ agha, suo obodo ahụ ọkụ.
27 Desse modo, tomaram os danitas a obra que Micas tinha feito, juntamente com o seu sacerdote. Atacaram então Lais, um povo pacífico e seguro, passaram-no ao fio da espada e queimaram a cidade.
28 Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike bịa inyere ndị obodo ahụ aka nʼihi ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo Saịdọn. O nwekwaghị obodo ọbụla ha na ha na-emekọrịta. Obodo a dị na ndagwurugwu dị nso na Bet-Rehob.
28 Não houve quem a salvasse, porque estava longe de Sidon e não tinham relações com ninguém. Essa cidade estava situada no vale pertencente a Bet-Roob. Os danitas reedificaram a cidade e habitaram-na,
29 Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish.
29 chamando-a cidade de Dã, nome de seu pai, que tinha nascido de Israel; a cidade chamava-se primitivamente Lais.
30 Nʼebe ahụ ndị Dan guzobeere onwe ha arụsị, Jonatan, nwa Geshọm, nwa Mosis, na ụmụ ya ndị ikom niile ghọọrọ ndị nchụaja nye ebo Dan ruo nʼoge a dọtara ala ahụ nʼagha.
30 E erigiram em seguida o ídolo. Jonatã, filho de Gersã filho de Moisés, e seus descendentes foram sacerdotes na tribo de Dã até o dia de sua deportação.
31 Ndị ebo Dan nọgidere na-efe arụsị ndị ahụ Maịka mere oge ahụ niile ụlọ nzute Chineke dị na Shaịlo.
31 O ídolo de Micas foi conservado entre eles durante todo o tempo que o santuário de Deus ficou em Silo.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Juízes 18, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.