Juízes 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI
1 Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna.
1 Jefté, o gileadita, era um guerreiro valente. Sua mãe era uma prostituta; seu pai foi Gileade.
2 Nwunye Gilead mụtaara ya ọtụtụ ụmụ ndị ikom ọzọ. Mgbe ha tolitere, ha chụpụrụ Jefta site nʼobodo ahụ, sị ya, “Ị gaghị eketa ihe ọbụla nʼezi nna anyị, nʼihi na nwa nwanyị ọzọ ka ị bụ.”
2 A mulher de Gileade também lhe deu filhos, que quando já estavam grandes, expulsaram Jefté, dizendo: "Você não vai receber nenhuma herança de nossa família, pois é filho de outra mulher".
3 Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya.
3 Então Jefté fugiu dos seus irmãos e se estabeleceu em Tobe. Ali um bando de vadios uniu-se a ele e o seguia.
4 O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha.
4 Algum tempo depois, quando os amonitas entraram em guerra contra Israel,
5 Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob.
5 os líderes de Gileade foram buscar Jefté em Tobe.
6 Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.”
6 "Venha", disseram. "Seja nosso comandante, para que possamos combater os amonitas. "
7 Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?”
7 Disse-lhes Jefté: "Vocês não me odiavam e não me expulsaram da casa de meu pai? Por que me procuram agora, quando estão em dificuldades? "
8 Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.”
8 "Apesar disso, agora estamos apelando para você", responderam os líderes de Gileade. "Venha combater conosco os amonitas, e você será o chefe de todos os que vivem em Gileade. "
9 Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?”
9 Jefté respondeu: "Se vocês me levarem de volta para combater os amonitas e o Senhor os entregar a mim, serei o chefe de vocês? "
10 Ndị okenye Gilead zara, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
10 Os líderes de Gileade responderam: "O Senhor é nossa testemunha; faremos conforme você diz".
11 Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu Onyenwe anyị nʼobodo Mizpa.
11 Assim Jefté foi com os líderes de Gileade, e o povo o fez chefe e comandante sobre todos. E ele repetiu perante o Senhor, em Mispá, todas as palavras que tinha dito.
12 Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?”
12 Jefté enviou mensageiros ao rei amonita com a seguinte pergunta: "Que é que tens contra nós, para ter atacado a nossa terra? "
13 Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”
13 O rei dos amonitas respondeu aos mensageiros de Jefté: "Quando Israel veio do Egito tomou as minhas terras, desde o Arnom até o Jaboque e até o Jordão. Agora, devolvam-me essas terras pacificamente".
14 Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,
14 Jefté mandou de novo mensageiros ao rei amonita,
15 na-asị,
15 dizendo: "Assim diz Jefté: Israel não tomou a terra de Moabe, e tampouco a terra dos amonitas.
16 Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh.
16 Quando veio do Egito, Israel foi pelo deserto até o mar Vermelho e daí para Cades.
17 Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh.
17 Então Israel enviou mensageiros ao rei de Edom, dizendo: ‘Deixa-nos atravessar a tua terra’, mas o rei de Edom não quis ouvi-lo. Enviou o mesmo pedido ao rei de Moabe, e ele também não consentiu. Assim Israel permaneceu em Cades.
18 “Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya.
18 "Em seguida os israelitas viajaram pelo deserto e contornaram Edom e Moabe; passaram a leste de Moabe e acamparam do outro lado do Arnom. Não entraram no território de Moabe, pois o Arnom era a sua fronteira.
19 “Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’
19 "Depois Israel enviou mensageiros a Seom, rei dos amorreus, em Hesbom, e lhe pediu: ‘Deixa-nos atravessar a tua terra para irmos ao lugar que nos pertence! ’
20 Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha.
20 Seom, porém, não acreditou que Israel fosse apenas atravessar o seu território; assim convocou todos os seus homens, acampou em Jaza e lutou contra Israel.
21 “Mgbe ahụ, Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ.
21 "Então o Senhor, o Deus de Israel, entregou Seom e todos os seus homens nas mãos de Israel, e este os derrotou. Israel tomou posse de todas as terras dos amorreus que viviam naquela região,
22 Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan.
22 conquistando-a por inteiro, desde o Arnom até o Jaboque, e desde o deserto até o Jordão.
23 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ?
23 "Agora que o Senhor, o Deus de Israel, expulsou os amorreus da presença do seu povo Israel, queres tu tomá-la?
24 Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta.
24 Acaso não tomas posse daquilo que o teu deus Camos te dá? Da mesma forma tomaremos posse do que o Senhor nosso Deus nos deu.
25 Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha?
25 És tu melhor do que Balaque, filho de Zipor, rei de Moabe? Entrou ele alguma vez em conflito com Israel ou lutou com ele?
26 Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ?
26 Durante trezentos anos Israel ocupou Hesbom, Aroer, os povoados ao redor e todas as cidades às margens do Arnom. Por que não os reconquistaste todo esse tempo?
27 Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka Onyenwe anyị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.”
27 Nada fiz contra ti, mas tu estás cometendo um erro, lutando contra mim. Que o Senhor, o Juiz, julgue hoje a disputa entre os israelitas e os amonitas".
28 Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.
28 Entretanto, o rei de Amom não deu atenção à mensagem de Jefté.
29 Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha.
29 Então o Espírito do Senhor se apossou de Jefté. Este atravessou Gileade e Manassés, passou por Mispá de Gileade, e daí avançou contra os amonitas.
30 Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m,
30 E Jefté fez este voto ao Senhor: "Se entregares os amonitas nas minhas mãos,
31 ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke Onyenwe anyị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.”
31 aquele que vier saindo da porta da minha casa ao meu encontro, quando eu retornar da vitória sobre os amonitas, será do Senhor, e eu o oferecerei em holocausto".
32 Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu.
32 Então Jefté foi combater os amonitas, e o Senhor os entregou nas suas mãos.
33 O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn.
33 Ele conquistou vinte cidades, desde Aroer até as vizinhanças de Minite, chegando a Abel-Queramim. Assim os amonitas foram subjugados pelos Israelitas.
34 Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.
34 Quando Jefté chegou à sua casa em Mispá, sua filha saiu ao seu encontro, dançando ao som de tamborins. E ela era filha única. Ele não tinha outro filho ou filha.
35 Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m Onyenwe anyị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.”
35 Quando a viu, rasgou suas vestes e gritou: "Ah, minha filha! Estou angustiado e desesperado por tua causa, pois fiz ao Senhor um voto que não posso quebrar".
36 Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ.
36 "Meu pai", respondeu ela, "sua palavra foi dada ao Senhor. Faça comigo o que prometeu, agora que o Senhor o vingou dos seus inimigos, os amonitas. "
37 Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.”
37 E prosseguiu: "Mas conceda-me dois meses para vagar pelas colinas e chorar com as minhas amigas, porque jamais me casarei".
38 Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru.
38 "Vá! ", disse ele. E deixou que ela fosse por dois meses. Ela e suas amigas foram para as colinas e choraram porque ela jamais se casaria.
39 Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke.
39 Passados os dois meses, ela voltou a seu pai, e ele fez com ela o que tinha prometido no voto. Assim, ela nunca deixou de ser virgem. Daí vem o costume em Israel
40 na ụmụ agbọghọ na-apụ kwa afọ, gaa, nọọ abalị anọ nʼihi icheta ada Jefta, onye Gilead.
40 de saírem as moças durante quatro dias, todos os anos, para celebrar a memória da filha de Jefté, o gileadita.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Juízes 11, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.