Josué 21

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH

Sair da comparação
NTLH Nova Tradução na Linguagem de Hoje 2000
1 Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
1 — ausente —
2 na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”
2 — ausente —
3 Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
3 E os israelitas, obedecendo à ordem de Deus, o Senhor , deram das suas terras cidades e pastos para os levitas.
4 Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.
4 As famílias dos coatitas foram as primeiras a receber cidades. Os levitas que eram descendentes do sacerdote Arão receberam treze cidades das tribos de Judá, Simeão e Benjamim.
5 Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase.
5 Os outros coatitas receberam dez cidades das famílias das tribos de Efraim e de Dã e da metade oeste da tribo de Manassés.
6 Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ.
6 Os gersonitas receberam treze cidades das famílias das tribos de Issacar, Aser, Naftali e da metade da tribo de Manassés que estava em Basã, a leste do Jordão.
7 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
7 As famílias dos meraritas receberam doze cidades das tribos de Rúben, Gade e Zebulom.
8 Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.
8 O povo de Israel, por meio de sorteio , separou para os levitas essas cidades e os pastos ao redor delas, como o Senhor havia ordenado por meio de Moisés.
9 Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha
9 São citadas a seguir as cidades das tribos de Judá e de Simeão que foram dadas
10 kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.
10 aos descendentes de Arão que eram do grupo de famílias de Coate, filho de Levi. As terras dos coatitas foram as primeiras a serem sorteadas.
11 E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.)
11 Deram a essas famílias a cidade de Quiriate-Arba (Arba foi o pai de Anaque), que é Hebrom, na região montanhosa de Judá, e os pastos ao seu redor.
12 Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
12 Mas os campos em volta da cidade e os seus povoados tinham sido dados a Calebe, filho de Jefoné, como sua propriedade.
13 Ya mere, ụmụ ụmụ Erọn, onye nchụaja, ka e kenyere obodo Hebrọn, nke bụkwa obodo mgbaba, kenyekwa ha obodo ndị a: Libna,
13 Aos descendentes de Arão deram Hebrom com os seus pastos. Esta era uma das cidades para os fugitivos que tivessem matado alguém. Deram também as cidades de Libna,
14 Jatịa, Eshtemoa,
14 Jatir, Estemoa,
15 Họlọn, Debịa,
15 Holom, Debir,
16 Ain, Juta na Bet-Shemesh. E nyekwara ha ala niile gbara obodo ndị a gburugburu ka ọ bụrụ ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ya mere, ọ bụ obodo itoolu ka e si nʼala ebo Juda na Simiọn kenye ha.
16 Aim, Jutá e Bete-Semes, com os seus pastos. Ao todo nove cidades das tribos de Judá e de Simeão.
17 Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a,
17 Da tribo de Benjamim deram quatro cidades: Gibeão, Geba,
18 Anatot, Almon na ala dị ya gburugburu ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri, bụ obodo anọ.
18 Anatote e Almom.
19 Ya mere, obodo niile e nyere ndị nchụaja, ụmụ ụmụ Erọn dị iri na atọ, tinyere ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
19 Ao todo foram dadas treze cidades com os seus pastos aos sacerdotes, que eram descendentes de Arão.
20 Ụmụ Kohat ndị fọdụrụ, ndị agbụrụ Livayị ka e kenyere obodo anọ ndị a site nʼaka ebo Ifrem.
20 Para as outras famílias coatitas, que eram levitas, eles deram algumas cidades da tribo de Efraim.
21 E sitere nʼala ugwu ugwu Ifrem nye ha:
21 Essas famílias receberam Siquém e os seus pastos na região montanhosa de Efraim. Siquém era uma das cidades para os fugitivos que tivessem matado alguém. Os coatitas receberam também Gezer,
22 Kibzaim na Bet-Horon, tinyere ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
22 Quibzaim e Bete-Horom, com os seus pastos. Ao todo quatro cidades.
23 Ha sitere nʼala ndị ebo Dan keta obodo anọ ndị a:
23 Da tribo de Dã eles receberam quatro cidades: Elteque, Gibetom,
24 Aijalon na Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
24 Aijalom e Gate-Rimom, com os seus pastos.
25 Ọkara ebo Manase nyere ha obodo abụọ,
25 Da metade oeste da tribo de Manassés eles receberam duas cidades: Taanaque e Gate-Rimom, com os seus pastos.
26 Ya mere, obodo niile na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ e nyere ndị fọdụrụ nʼikwu Kohat dị iri.
26 Essas famílias coatitas receberam ao todo dez cidades com os seus pastos.
27 Ụmụ Geshọn, ndị agbụrụ Livayị, ketara obodo abụọ ndị a, ya na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
27 Os gersonitas, que eram outra família de levitas, receberam da metade leste da tribo de Manassés a cidade de Golã, em Basã, com os seus pastos. Esta era uma das cidades para os fugitivos que tivessem matado alguém. Os gersonitas receberam também a cidade de Beesterá com os seus pastos.
28 Ebo Isaka nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ,
28 Da tribo de Issacar eles receberam quatro cidades: Quisião, Daberate,
29 Jamut na En-Ganim, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
29 Jarmute e En-Ganim, com os seus pastos.
30 Ebo Asha nyekwara ha obodo anọ. Ha bụ,
30 Da tribo de Aser eles receberam quatro cidades: Misal, Abdom,
31 Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
31 Helcate e Reobe, com os seus pastos.
32 Ebo Naftalị nyere ha obodo atọ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Obodo ndị a bụ,
32 Da tribo de Naftali receberam a cidade de Quedes, na Galileia, com os seus pastos. Quedes era uma cidade para os fugitivos que tivessem matado alguém. Os gersonitas receberam também Hamote-Dor e Cartã, com os seus pastos. Ao todo três cidades.
33 Obodo iri na atọ, na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ka e nyere ikwu Geshọn.
33 As várias famílias dos gersonitas receberam ao todo treze cidades com os seus pastos.
34 Ndị ikwu Merari, bụ ụmụ ụmụ Livayị fọdụrụ nwetara site nʼaka:
34 Os outros levitas, isto é, as famílias meraritas, receberam da tribo de Zebulom quatro cidades: Jocneão, Cartá,
35 Dimna na Nahalal, obodo anọ tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
35 Dimna e Naalal, com os seus pastos.
36 Ebo Ruben nyere ha obodo anọ:
36 Da tribo de Rúben eles receberam quatro cidades: Bezer, Jasa,
37 Kedemot, Mefaat na ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ kpaa nri.
37 Quedemote e Mefaate, com os seus pastos.
38 Ebo Gad nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ,
38 Da tribo de Gade eles receberam Ramote, em Gileade, com os seus pastos. Ramote era uma das cidades para os fugitivos que tivessem matado alguém. Os meraritas receberam também Maanaim,
39 Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
39 Hesbom e Jazer, com os seus pastos. Ao todo quatro cidades.
40 Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.
40 Esses levitas, isto é, as várias famílias meraritas, receberam doze cidades ao todo.
41 Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.
41 Das terras dos israelitas foram dadas aos levitas, ao todo, quarenta e oito cidades com os seus pastos.
42 Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.
42 Cada uma dessas cidades tinha pastos ao seu redor.
43 Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya.
43 Assim o Senhor Deus deu aos israelitas toda a terra que havia prometido aos seus antepassados. E, quando tomaram posse da terra, eles passaram a morar nela.
44 Onyenwe anyị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na Onyenwe anyị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha.
44 O Senhor lhes deu paz com os povos vizinhos, conforme havia prometido aos seus antepassados. Nenhum dos inimigos conseguiu resistir, pois o Senhor deu ao povo de Israel a vitória sobre eles.
45 O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile Onyenwe anyị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.
45 O Senhor cumpriu todas as boas promessas que havia feito ao povo de Israel.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Josué 21, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.