Jeremias 42

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NAA

Sair da comparação
NAA Nova Almeida Atualizada 2017
1 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere
1 Então todos os capitães dos exércitos e Joanã, filho de Careá, e Jezanias, filho de Hosaías, e todo o povo, desde o menor até o maior, se aproximaram
2 Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo Onyenwe anyị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole.
2 e disseram ao profeta Jeremias: — Apresentamos a você a nossa humilde súplica, para que você ore ao
3 Kpee ekpere ka Onyenwe anyị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.”
3 Ore, pedindo que o Senhor , seu Deus, nos mostre o caminho que devemos seguir e o que devemos fazer.
4 Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.”
4 O profeta Jeremias respondeu: — Eu ouvi o pedido de vocês. Vou orar ao
5 Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị.
5 Então eles disseram a Jeremias: — Que o
6 Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.”
6 Seja ela boa ou má, obedeceremos à voz do Senhor , nosso Deus, a quem pedimos que você ore por nós, para que tudo corra bem conosco, ao obedecermos à voz do Senhor , nosso Deus.
7 Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị.
7 Depois de dez dias, a palavra do Senhor veio a Jeremias.
8 Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
8 Então ele chamou Joanã, filho de Careá, todos os capitães dos exércitos que estavam com ele e todo o povo, desde o menor até o maior,
9 Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị:
9 e lhes disse: — Assim diz o
10 ‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu.
10 “Se vocês permanecerem nesta terra, então eu os edificarei e não os derrubarei; eu os plantarei e não os arrancarei, porque estou triste pelo mal que lhes fiz.
11 Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya.
11 Não tenham medo do rei da Babilônia, de quem agora vocês estão com medo. Não tenham medo dele, diz o Senhor , porque eu estou com vocês, para os salvar e livrar das mãos dele.
12 Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’
12 Terei misericórdia de vocês, para que ele tenha misericórdia de vocês e os faça voltar a esta terra.”
13 “Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ;
13 — Mas, se vocês disserem: “Não ficaremos nesta terra”; se desobedecerem à voz do Senhor , seu Deus,
14 ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’
14 e disserem: “Não! Preferimos ir à terra do Egito, onde não veremos guerra, nem ouviremos som de trombeta, nem passaremos fome, e ali vamos morar”,
15 mgbe ahụ, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị fọdụrụ na Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike na mkpebi unu ịga Ijipt ibiri nʼebe ahụ, ọ bụrụkwa na unu agaa biri nʼIjipt nʼeziokwu,
15 nesse caso, ouça a palavra do Senhor , ó remanescente de Judá. Assim diz o Senhor dos Exércitos, o Deus de Israel: “Se tiverem o firme propósito de entrar no Egito para morar,
16 mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ.
16 então a guerra da qual vocês têm medo os alcançará, e a fome que vocês receiam irá no encalço de vocês até o Egito, onde vocês morrerão.
17 Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’
17 Assim será com todos os que tiverem o propósito de entrar no Egito para morar: morrerão à espada, de fome e de peste. Não haverá um só que sobreviva ou escape do mal que trarei sobre eles.”
18 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’
18 — Porque assim diz o Senhor dos Exércitos, o Deus de Israel: “Assim como se derramou a minha ira e o meu furor sobre os moradores de Jerusalém, o meu furor se derramará sobre vocês, quando entrarem no Egito. Vocês serão objeto de maldição, de horror, de zombaria e de deboche, e nunca mais verão este lugar.”
19 “Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị,
19 — O Senhor disse a vocês, que são o remanescente de Judá: “Não vão para o Egito.” Estejam certos de que hoje eu faço esta advertência:
20 na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’
20 Vocês estão se enganando, à custa da própria vida. Porque me enviaram ao Senhor , seu Deus, dizendo: “Ore por nós ao Senhor , nosso Deus. Depois, conte-nos tudo o que o Senhor , nosso Deus, disser, e nós o faremos.”
21 Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile Onyenwe anyị Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru.
21 Mas, agora que eu lhes contei tudo isso, vocês não deram ouvidos à voz do Senhor , seu Deus, não fazendo nada do que ele me mandou dizer.
22 Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”
22 Agora, pois, estejam certos de que morrerão à espada, de fome e de peste no mesmo lugar aonde desejaram ir para morar.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Jeremias 42, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.