Jeremias 37

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn mere Zedekaya nwa Josaya eze Juda, nʼọnọdụ Konaya nwa Jehoiakim.
1 O rei Sedecias, filho de Josias, sucedeu a {Je} Conias, filho de Joaquim, tendo sido proclamado rei da terra de Judá por Nabucodonosor, rei de Babilônia.
2 Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.
2 Nem ele, porém, nem seus súditos e a população da terra escutaram os oráculos que lhes transmitia o Senhor, por intermédio do profeta Jeremias.
3 Zedekaya bụ eze, ziri Jehukal nwa Shelemaya, na Zefanaya onye nchụaja, bụ nwa Maaseia ozi sị ha, jekwuru Jeremaya onye amụma gwa ya okwu sị, “Biko, kpeere anyị ekpere, rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ.”
3 O rei Sedecias enviou, entretanto, Jucal, filho de Selemias, e o sacerdote Sofonias, filho de Maasias, ao profeta Jeremias, a fim de lhe dizer: Intercede por nós junto ao Senhor, nosso Deus.
4 Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ.
4 Jeremias, que ainda não havia sido aprisionado, andava entre o povo.
5 Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.
5 Partira então do Egito o exército do faraó. Ao receberem tal notícia, os caldeus, que sitiavam Jerusalém, abandonaram a cidade.
6 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya,
6 Nestes termos foi a palavra do Senhor dirigida ao profeta Jeremias: Eis o que diz o Senhor Deus de Israel:
7 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt.
7 assim falarás ao rei de Judá que te envia seus delegados para interrogar-me: o exército do faraó que saiu para vos dar socorro vai regressar ao Egito.
8 Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’
8 Voltarão os caldeus a sitiar a cidade, tomá-la-ão de assalto e a entregarão às chamas.
9 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ.
9 Oráculo do Senhor: não queirais enganar-vos, julgando que os caldeus se irão definitivamente. Eles não irão embora.
10 A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”
10 Ainda que derrotásseis todo o exército dos caldeus que combate contra vós, e que dele só restassem feridos sob as tendas, cada um deles ainda se levantaria para incendiar a cidade.
11 Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa,
11 Quando as tropas dos caldeus se afastaram de Jerusalém, ante a aproximação do exército do faraó,
12 Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ.
12 quis Jeremias sair da cidade para dirigir-se à terra de Benjamim, a fim de lá se reabastecer com o resto do povo.
13 Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!”
13 Encontrava-se porém um guarda às portas de Benjamim, chamado Jerias, filho de Selemias, filho de Ananias, o qual, ao chegar o profeta, deteve-o, dizendo: tu foges para os caldeus.
14 Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị.
14 É falso! retorquiu o profeta, eu não passo para os caldeus. Não quis porém Jerias ouvi-lo; prendeu-o e levou-o à presença dos chefes.
15 Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.
15 E estes, enfurecendo-se contra Jeremias, açoitaram-no e prenderam-no na casa do escriba Jonatã, transformada em prisão.
16 E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge.
16 Foi então o profeta atirado num calabouço, onde permaneceu vários dias.
17 Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka Onyenwe anyị?”
17 O rei Sedecias, porém, mandou-o buscar, a fim de interrogá-lo secretamente em seu palácio. Tens, porventura, perguntou-lhe, algum oráculo do Senhor? Sim, respondeu-lhe Jeremias. Serás entregue nas mãos do rei de Babilônia.
18 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ?
18 E acrescentou ao rei Sedecias: em que te ofendi, a ti, aos teus servos e a teu povo, para que me lançasses na prisão?
19 Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’
19 Onde estão os profetas que vos prediziam não dever mais voltar o rei de Babilônia contra vós e contra a terra?
20 Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”
20 Escuta-me, agora, ó meu rei e digna-te acolher minha súplica: não permitas que seja eu reconduzido à casa do escriba Jonatã, para que eu não morra lá.
21 Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.
21 Ordenou então o rei Sedecias que Jeremias fosse retido no pátio do cárcere e que lhe dessem todos os dias uma torta de pão, da rua dos Padeiros, enquanto na cidade houvesse pão. E assim permaneceu Jeremias no pátio do cárcere.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Jeremias 37, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.