Jeremias 33

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ARIB

Sair da comparação
ARIB Almeida Revisada Imprensa Bíblica
1 Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya,
1 E veio a palavra do Senhor a Jeremias, segunda vez, estando ele ainda encarcerado no pátio da guarda, dizendo:
2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:
2 Assim diz o Senhor que faz isto, o Senhor que forma isto, para o estabelecer; o Senhor é o seu nome.
3 ‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’
3 Clama a mim, e responder-te-ei, e anunciar-te-ei coisas grandes e ocultas, que não sabes.
4 Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha
4 Pois assim diz o Senhor, o Deus de Israel, acerca das casas desta cidade, e acerca das casas dos reis de Judá, que foram demolidas para fazer delas uma defesa contra os valados e contra a espada;
5 nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.
5 entrementes os caldeus estão entrando a pelejar para os encher de cadáveres de homens que ferirei na minha ira e no meu furor; porquanto escondi o meu rosto desta cidade, por causa de toda a sua maldade.
6 “ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.
6 Eis que lhe trarei a ela saúde e cura, e os sararei, e lhes manifestarei abundância de paz e de segurança.
7 Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ.
7 E farei voltar do cativeiro os exilados de Judá e de Israel, e os edificarei como ao princípio.
8 Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.
8 E os purificarei de toda a iniqüidade do seu pecado contra mim; e perdoarei todas as suas iniqüidades, com que pecaram e transgrediram contra mim.
9 Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’
9 E esta cidade me servirá de nome de gozo, de louvor e de glória, diante de todas as nações da terra que ouvirem de todo o bem que eu lhe faço; e espantar-se-ão e perturbar-se-ão por causa de todo o bem, e por causa de toda a paz que eu lhe dou.
10 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa
10 Assim diz o Senhor: Neste lugar do qual vós dizeis: E uma desolação, sem homens nem animais, sim, nas cidades de Judá, e nas ruas de Jerusalém, que estão assoladas, sem homens, sem moradores e sem animais, ainda se ouvira
11 olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị,
11 a voz de gozo e a voz de alegria, a voz de noivo e a voz de noiva, e a voz dos que dizem: Dai graças ao Senhor dos exércitos, porque bom é o Senhor, porque a sua benignidade dura para sempre; também se ouvirá a voz dos que trazem à casa do Senhor sacrifícios de ação de graças. Pois farei voltar a esta terra os seus exilados como no princípio, diz o Senhor.
12 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.
12 Assim diz o Senhor dos exércitos: Ainda neste lugar, que está deserto, sem homens, e sem animais, e em todas as suas cidades, haverá uma morada de pastores que façam repousar aos seus rebanhos.
13 Nʼime obodo niile nke dị nʼala ugwu ugwu, na nʼobodo niile nke dị na mgbada ugwu niile nke Negev, nʼoke ala Benjamin, nʼime obodo nta niile nke gbara Jerusalem gburugburu, na nʼime obodo niile nke Juda. Igwe ewu na atụrụ ga-agabigakwa ọzọ nʼokpuru aka abụọ nke onye na-agụ ha ọnụ.’ Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu.
13 Nas cidades da região montanhosa, nas cidades das planícies, e nas cidades do sul, e na terra de Benjamim, e nos contornos de Jerusalém, e nas cidades de Judá, ainda passarão os rebanhos pelas mãos dos contadores, diz o Senhor.
14 “ ‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda.
14 Eis que vêm os dias, diz o Senhor, em que cumprirei a boa palavra que falei acerca da casa de Israel e acerca da casa de Judá.
15 “ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ,
15 Naqueles dias e naquele tempo farei que brote a Davi um Renovo de justiça; ele executará juízo e justiça na terra.
16 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda,
16 Naqueles dias Judá será salvo e Jerusalém habitará em segurança; e este é o nome que lhe chamarão: O SENHOR É NOSSA JUSTIÇA.
17 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel.
17 Pois assim diz o Senhor: Nunca faltará a Davi varão que se assente sobre o trono da casa de Israel;
18 Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ”
18 nem aos sacerdotes levíticos faltará varão diante de mim para oferecer holocaustos, e queimar ofertas de cereais e oferecer sacrifícios continuamente.
19 Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
19 E veio a palavra do Senhor a Jeremias, dizendo:
20 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha,
20 Assim diz o Senhor: se puderdes invalidar o meu pacto com o dia, e o meu pacto com a noite, de tal modo que não haja dia e noite a seu tempo,
21 mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
21 também se poderá invalidar o meu pacto com Davi, meu servo, para que não tenha filho que reine no seu trono; como também o pacto com os sacerdotes levíticos, meus ministros.
22 Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
22 Assim como não se pode contar o exército dos céus, nem medir-se a areia do mar, assim multiplicarei a descendência de Davi, meu servo, e os levitas, que ministram diante de mim.
23 Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
23 E veio ainda a palavra do Senhor a Jeremias, dizendo:
24 “Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.
24 Acaso não observaste o que este povo está dizendo: As duas famílias que o Senhor escolheu, agora as rejeitou? Assim desprezam o meu povo, como se não fora um povo diante deles.
25 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na m emeghị ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti mụ na ehihie na abalị, meekwa ka iwu na-achị eluigwe na ụwa guzosie ike,
25 Assim diz o Senhor: Se o meu pacto com o dia e com a noite não permanecer, e se eu não tiver determinado as ordenanças dos céus e da terra,
26 mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’ ”
26 também rejeitarei a descendência de Jacó, e de Davi, meu servo, de modo que não tome da sua descendência os que dominem sobre a descendência de Abraão, Isaque, e Jacó; pois eu os farei voltar do seu cativeiro, e apiedar-me-ei deles.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Jeremias 33, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.