Jeremias 25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI

Sair da comparação
NVI Nova Versão Internacional
1 Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn.
1 A palavra veio a Jeremias a respeito de todo o povo de Judá no quarto ano de Jeoaquim, filho de Josias, rei de Judá, que foi o primeiro ano de Nabucodonosor, rei da Babilônia.
2 Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:
2 O que o profeta Jeremias anunciou a todo o povo de Judá e aos habitantes de Jerusalém foi isto:
3 Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu.
3 Durante vinte e três anos a palavra do Senhor tem vindo a mim, desde o décimo terceiro ano de Josias, filho de Amom, rei de Judá, até o dia de hoje. E eu a tenho anunciado a vocês, dia após dia, mas vocês não me deram ouvidos.
4 Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.
4 Embora o Senhor tenha enviado a vocês os seus servos, os profetas, dia após dia, vocês não os ouviram nem lhes deram atenção,
5 Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.
5 quando disseram: "Converta-se cada um do seu caminho mau e de suas más obras, e vocês permanecerão na terra que o Senhor deu a vocês e aos seus antepassados para sempre.
6 Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.
6 Não sigam outros deuses para prestar-lhes culto e adorá-los; não provoquem a minha ira com ídolos feitos por vocês. E eu não trarei desgraça sobre vocês".
7 “Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”
7 "Mas vocês não me deram ouvidos e me provocaram à ira com os ídolos que vocês fizeram, trazendo desgraça sobre si mesmos", declara o Senhor.
8 Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.
8 Portanto, assim diz o Senhor dos Exércitos: "Visto que vocês não ouviram as minhas palavras,
9 Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
9 convocarei todos os povos do norte e o meu servo Nabucodonosor, rei da Babilônia", declara o Senhor, "e os trarei para atacar esta terra, os seus habitantes e todas as nações ao redor. Eu os destruirei completamente e os farei um objeto de pavor e de zombaria, e uma ruína permanente.
10 Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.
10 Darei fim às vozes de júbilo e de alegria, às vozes do noivo e da noiva, ao som do moinho e à luz das candeias.
11 Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.
11 Toda esta terra se tornará uma ruína desolada, e essas nações estarão sujeitas ao rei da Babilônia durante setenta anos.
12 “Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
12 "Quando se completarem os setenta anos, castigarei o rei da Babilônia e a sua nação, a terra dos babilônios, por causa de suas iniqüidades", declara o Senhor, "e a deixarei arrasada para sempre.
13 Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.
13 Cumprirei naquela terra tudo o que falei contra ela, tudo o que está escrito neste livro e que Jeremias profetizou contra todas as nações.
14 A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”
14 Porque os próprios babilônios serão escravizados por muitas nações e grandes reis; eu lhes retribuirei conforme as suas ações e as suas obras".
15 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.
15 Assim me disse o Senhor, o Deus de Israel: "Pegue de minha mão este cálice com o vinho da minha ira e faça com que bebam dele todas as nações a quem eu o envio.
16 Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”
16 Quando o beberem, ficarão cambaleando, enlouquecidos por causa da espada que enviarei entre elas".
17 Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
17 Então peguei o cálice da mão do Senhor, e fiz com que dele bebessem todas as nações às quais o Senhor me enviou:
18 Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.
18 Jerusalém e as cidades de Judá, seus reis e seus líderes, para fazer deles uma desolação e um objeto de pavor, zombaria e maldição, como hoje acontece;
19 Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile,
19 o faraó, o rei do Egito, seus conselheiros e seus líderes, todo o seu povo,
20 na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ;
20 e todos os estrangeiros que lá residem; todos os reis de Uz; todos os reis dos filisteus: de Ascalom, Gaza, Ecrom e o povo que restou em Asdode;
21 Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn;
21 Edom, Moabe e os amonitas,
22 na ndị eze Taịa na Saịdọn,
22 os reis de Tiro e de Sidom; os reis das ilhas e das terras de além do mar;
23 na ala Dedan, na Tema, na Buz, na ndị niile bi nʼebe dị anya.
23 Dedã, Temá, Buz e todos os que rapam a cabeça;
24 Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara;
24 e os reis da Arábia e todos os reis dos estrangeiros que vivem no deserto;
25 na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia;
25 todos os reis de Zinri, de Elão e da Média;
26 na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa.
26 e todos os reis do norte, próximos ou distantes, um após outro; e todos os reinos da face da terra. Depois de todos eles, o rei de Sesaque também beberá do cálice.
27 “Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
27 "A seguir diga-lhes: ‘Assim diz o Senhor dos Exércitos, o Deus de Israel: Bebam, embriaguem-se, vomitem, caiam e não mais se levantem, por causa da espada que envio no meio de vocês’.
28 Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
28 Mas se eles se recusarem a beber, diga-lhes: ‘Assim diz o Senhor dos Exércitos: Vocês vão bebê-lo!
29 Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
29 Começo a trazer desgraça sobre a cidade que leva o meu nome; e vocês sairiam impunes? Sem dúvida não ficarão sem castigo! Estou trazendo a espada contra todos os habitantes da terra’, declara o Senhor dos Exércitos.
30 “Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha,
30 "E você, profetize todas estas palavras contra eles, dizendo: " ‘O Senhor ruge do alto; troveja de sua santa morada; ruge poderosamente contra a sua propriedade. Ele grita como os que pisam as uvas; grita contra todos os habitantes da terra.
31 Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa,
31 Um tumulto ressoa até os confins da terra, pois o Senhor faz acusações contra as nações, e julga toda a humanidade: ele entregará os ímpios à espada’, declara o Senhor. "
32 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
32 Assim diz o Senhor: "Vejam! A desgraça está se espalhando de nação em nação; uma terrível tempestade se levanta desde os confins da terra".
33 Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
33 Naquela dia, os mortos pelo Senhor estarão em todo lugar, de um lado ao outro da terra. Ninguém pranteará por eles, e não serão recolhidos e sepultados, mas servirão de esterco sobre o solo.
34 Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa;
34 Lamentem-se e gritem, pastores! Rolem no pó, chefes do rebanho! Porque chegou para vocês o dia da matança e da sua dispersão; vocês cairão e serão esmigalhados como vasos finos.
35 Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ;
35 Não haverá refúgio para os pastores nem escapatória para os chefes do rebanho.
36 Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ,
36 Ouvem-se os gritos dos pastores e o lamento dos chefes do rebanho, pois o Senhor está destruindo as pastagens deles.
37 Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,
37 Os pastos tranqüilos estão devastados por causa do fogo da ira do Senhor.
38 Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa.
38 Como um leão, ele saiu de sua toca; a terra deles ficou devastada, por causa da espada do opressor e do fogo de sua ira.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Jeremias 25, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.