Jeremias 16
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC
1 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
1 Foi-me dirigida a palavra do Senhor nestes termos:
2 “Ị gaghị alụtara onwe gị nwunye, ị gaghị amụtakwa ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼebe a.”
2 Não tomarás esposa, nem terás filho ou filha neste lugar,
3 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a.
3 porquanto eis o que diz o Senhor a respeito dos filhos e das filhas que nasceram neste lugar, das mães que os conceberam e dos pais a quem devem a vida nesta terra:
4 “Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.”
4 perecerão todos de moléstias mortais, sem pranto nem sepulturas. Qual esterco jazerão sobre o solo; perecerão pela espada e pela fome, e seus cadáveres servirão de pasto às aves do céu e aos animais da terra.
5 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ, maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
5 E disse, ainda, o Senhor: Não entres em casa em que haja luto, para chorar com seus moradores, porque - oráculo do Senhor - desse povo retiro a minha paz, minha proteção e minha misericórdia.
6 “Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha.
6 Grandes e pequenos morrerão nesta terra, e ficarão sem lamentações e sem sepulturas, e não se farão incisões, nem rasparão os cabelos.
7 O nweghị onye ga-eweta ihe oriri nye ndị zukọrọ maka ịkasị ndị na-eru ụjụ obi. Nri agaghị adị ọ bụladị nye ndị na-eru ụjụ, nʼihi ọnwụ nna ha maọbụ ọnwụ nne ha. Ọ dịkwaghị onye ga-enye ha ihe ọṅụṅụ nʼihi ịkasị ha obi.
7 O pão não será repartido para consolar o enlutado que chora um defunto, nem se lhe oferecerá a taça do consolo pela morte de seus pais.
8 “Abanyekwala nʼụlọ ebe e nwere oriri soro ndị nọ nʼebe ahụ nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ
8 Não entrarás, igualmente, na casa em que houver uma festa, sentando-te à mesa com os convivas.
9 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụkwa Chineke Izrel kwuru, ‘Nʼihu gị, na nʼoge ndị a niile ị dị ndụ, ka m ga-eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na nke ndị inyom na-alụ di na nwunye kwụsị.’
9 Pois assim fala o Senhor dos exércitos, o Deus de Israel: Vou abafar em tal lugar, ante vossos olhos, diante de vós, os gritos de alegria, cânticos de júbilo e os hinos do esposo e a canção da esposa.
10 “Mgbe ị gwara ndị a ihe ndị a, ha ga-ajụ gị ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji kpebie izitere anyị ụdị oke ịla nʼiyi dị otu a? Gịnị bụ ihe ọjọọ anyị mere? Gịnị bụ mmehie anyị mere megide Onyenwe anyị Chineke anyị?’
10 Assim que tiveres levado ao povo essa mensagem e te perguntarem: Por que decretou o Senhor contra nós todos esses flagelos? Qual é o pecado, qual o crime que cometemos contra o Senhor, nosso Deus?
11 Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu.
11 Tu lhe dirás: é porque vossos pais me abandonaram - oráculo do Senhor -, para correr atrás de outros deuses, rendendo-lhes um culto e ante eles se prosternando, porque me abandonaram e deixaram de observar a minha lei; e
12 Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi.
12 porque vós mesmos fizestes pior que vossos pais, cada qual, sem me ouvir, obstinando-se em seguir as más tendências de seus corações.
13 Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’
13 Assim, expulsar-vos-ei desta terra para vos lançar numa terra que não conhecestes, nem vós nem vossos pais. Lá, dia e noite, rendereis culto aos deuses estranhos, porque eu não vos perdoarei.
14 “Otu ọ dị, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na adị ndụ, bụ onye ahụ sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.’
14 Eis por que virão dias - oráculo do Senhor - em que não mais se dirá: Viva Deus, que tirou do Egito os israelitas!
15 Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha.
15 Mas sim: Viva Deus, que fez com que regressassem os israelitas do norte e de todos os países pelos quais os havia dispersado! Fá-los-ei regressar à terra que dei a seus pais.
16 “Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha.
16 Vou mandar - oráculo do Senhor - pescadores em grande número para que pesquem. Depois enviarei numerosos caçadores para que cacem pelas montanhas e colinas e até nas cavidades dos rochedos.
17 Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile.
17 Porquanto, sob o meu olhar tenho seus atos que não me são ocultos, e suas iniqüidades não se podem esquivar a meus olhares.
18 Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.”
18 Primeiramente, pagar-lhes-ei em dobro o salário de sua iniqüidade e do seu pecado, por haverem profanado a minha terra com os restos imundos de seus ídolos e enchido minha herança de abominações.
19 Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike,
19 Senhor, minha força e amparo, refúgio no dia da desgraça, virão nações dos confins do mundo, exclamando: o que nossos pais receberam em partilha não passa de um nada, vaidades que para nada poderão servir.
20 Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi?
20 Poderá o homem fabricar deuses para si? Não serão deuses, porém!
21 “Ya mere, aga m eme ka ha mata.
21 Então, vou mostrar-lhes, sim, desta feita vou mostrar-lhes minha mão e meu poder, a fim de que saibam que o meu nome é Senhor.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Jeremias 16, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.