Hebreus 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ARIB

Sair da comparação
ARIB Almeida Revisada Imprensa Bíblica
1 Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo.
1 Ora, também o primeiro pacto tinha ordenanças de serviço sagrado, e um santuário terrestre.
2 E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ.
2 Pois foi preparada uma tenda, a primeira, na qual estavam o candeeiro, e a mesa, e os pães da proposição; a essa se chama o santo lugar;
3 Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ,
3 mas depois do segundo véu estava a tenda que se chama o santo dos santos,
4 nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ.
4 que tinha o incensário de ouro, e a arca do pacto, toda coberta de ouro em redor; na qual estava um vaso de ouro, que continha o maná, e a vara de Arão, que tinha brotado, e as tábuas do pacto;
5 Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.
5 e sobre a arca os querubins da glória, que cobriam o propiciatório; das quais coisas não falaremos agora particularmente.
6 Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ.
6 Ora, estando estas coisas assim preparadas, entram continuamente na primeira tenda os sacerdotes, celebrando os serviços sagrados;
7 Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.
7 mas na segunda só o sumo sacerdote, uma vez por ano, não sem sangue, o qual ele oferece por si mesmo e pelos erros do povo;
8 Site na nke a, Mmụọ Nsọ na-egosi na ụzọ e si abanye nʼEbe Kachasị Nsọ ahụ bụ ihe na a ka apụtabeghị ihe, ebe ọ bụ na ụlọ ikwu nke mbụ ahụ ka na-eguzo.
8 dando o Espírito Santo a entender com isso, que o caminho do santuário não está descoberto, enquanto subsiste a primeira tenda,
9 Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke.
9 que é uma parábola para o tempo presente, conforme a qual se oferecem tanto dons como sacrifícios que, quanto à consciência, não podem aperfeiçoar aquele que presta o culto;
10 Kama ha bụ naanị usoro iwu metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ụdị baptizim dị iche iche nke anụ ahụ, bụ nke e nyere ka a na-eme ya ruo mgbe a ga-edozigharị ihe niile.
10 sendo somente, no tocante a comidas, e bebidas, e várias abluções, umas ordenanças da carne, impostas até um tempo de reforma.
11 Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke,
11 Mas Cristo, tendo vindo como sumo sacerdote dos bens já realizados, por meio do maior e mais perfeito tabernáculo {não feito por mãos, isto é, não desta criação},
12 o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi.
12 e não pelo sangue de bodes e novilhos, mas por seu próprio sangue, entrou uma vez por todas no santo lugar, havendo obtido uma eterna redenção.
13 Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ.
13 Porque, se a aspersão do sangue de bodes e de touros, e das cinzas duma novilha santifica os contaminados, quanto à purificação da carne,
14 Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.
14 quanto mais o sangue de Cristo, que pelo Espírito eterno se ofereceu a si mesmo imaculado a Deus, purificará das obras mortas a vossa consciência, para servirdes ao Deus vivo?
15 Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.
15 E por isso é mediador de um novo pacto, para que, intervindo a morte para remissão das transgressões cometidas debaixo do primeiro pacto, os chamados recebam a promessa da herança eterna.
16 Ọ bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe ọ nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ ọ nwụọla.
16 Pois onde há testamento, necessário é que intervenha a morte do testador.
17 Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ.
17 Porque um testamento não tem torça senão pela morte, visto que nunca tem valor enquanto o testador vive.
18 Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya.
18 Pelo que nem o primeiro pacto foi consagrado sem sangue;
19 Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile.
19 porque, havendo Moisés anunciado a todo o povo todos os mandamentos segundo a lei, tomou o sangue dos novilhos e dos bodes, com água, lã purpúrea e hissopo e aspergiu tanto o próprio livro como todo o povo,
20 Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.”
20 dizendo: este é o sangue do pacto que Deus ordenou para vós.
21 Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe.
21 Semelhantemente aspergiu com sangue também o tabernáculo e todos os vasos do serviço sagrado.
22 Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị.
22 E quase todas as coisas, segundo a lei, se purificam com sangue; e sem derramamento de sangue não há remissão.
23 O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa.
23 Era necessário, portanto, que as figuras das coisas que estão no céu fossem purificadas com tais sacrifícios, mas as próprias coisas celestiais com sacrifícios melhores do que estes.
24 Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke.
24 Pois Cristo não entrou num santuário feito por mãos, figura do verdadeiro, mas no próprio céu, para agora comparecer por nós perante a face de Deus;
25 Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ.
25 nem também para se oferecer muitas vezes, como o sumo sacerdote de ano em ano entra no santo lugar com sangue alheio;
26 Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja.
26 doutra forma, necessário lhe fora padecer muitas vezes desde a fundação do mundo; mas agora, na consumação dos séculos, uma vez por todas se manifestou, para aniquilar o pecado pelo sacrifício de si mesmo.
27 Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,
27 E, como aos homens está ordenado morrerem uma só vez, vindo depois o juízo,
28 otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.
28 assim também Cristo, oferecendo-se uma só vez para levar os pecados de muitos, aparecerá segunda vez, sem pecado, aos que o esperam para salvação.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Hebreus 9, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.