Gênesis 16
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs BKJ
1 Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega.
1 Ora, Sarai, esposa de Abrão, não lhe gerava filhos, mas ela tinha uma serva, uma egípcia, cujo nome era Agar.
2 Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ. Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.”
2 E Sarai disse a Abrão: Eis que o SENHOR me tem impedido de gerar; suplico-te, entra na minha serva; pode ser que eu possa obter filhos por ela. E Abrão ouviu à voz de Sarai.
3 Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.
3 E Sarai, esposa de Abrão, tomou Agar, sua serva, a egípcia, depois de Abrão ter habitado dez anos na terra de Canaã, e a deu por mulher a seu marido.
4 Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime.
4 E ele entrou em Agar, e ela concebeu. E vendo ela que tinha concebido, sua senhora foi desprezada a seus olhos.
5 Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
5 E Sarai disse a Abrão: Meu erro seja sobre ti; eu dei minha serva em teu seio, e quando ela viu que havia concebido, fui desprezada aos seus olhos; o SENHOR julgue entre mim e ti.
6 Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
6 Mas Abrão disse a Sarai: Eis que tua serva está em tua mão. Faze a ela como te apraz. E quando Sarai a tratou severamente, ela fugiu da sua face.
7 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua,
7 E o anjo do SENHOR a achou junto a uma fonte de água no deserto, junto à fonte no caminho para Sur.
8 jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?”
8 E ele disse: Agar, serva de Sarai, de onde tu vieste? E para onde vais? E ela disse: Eu fujo da face da minha senhora Sarai.
9 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.”
9 E o anjo do SENHOR lhe disse: Volta a tua senhora, e sujeita-te debaixo das suas mãos.
10 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
10 E o anjo do SENHOR lhe disse: Eu multiplicarei a tua semente tão excessivamente, que não será contada por seu grande número.
11 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị,
11 E o anjo do SENHOR lhe disse: Eis que tu estás com filho, e gerarás um filho, e chamarás seu nome Ismael; porque o SENHOR ouviu a tua aflição.
12 Nwoke dịka ịnyịnya ibu a na-azụghị azụ ka ọ ga-abụ.
12 E ele será homem selvagem; sua mão será contra todo homem, e a mão de todo homem contra ele; e ele habitará na presença de todos os seus irmãos.
13 Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.”
13 E ela invocou o nome do SENHOR que com ela falava: Tu és Deus que me vê; pois ela disse: Não olhei eu também para aquele que me vê?
14 Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.
14 Portanto o poço foi chamado Beer-Laai-Roi; e eis que ele está entre Cades e Berede.
15 Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel.
15 E Agar gerou um filho a Abrão; e Abrão chamou o nome de seu filho, que Agar lhe gerou, Ismael.
16 Ebram gbara iri afọ asatọ na isii mgbe Hega mụtaara ya Ishmel.
16 E era Abrão da idade de oitenta e seis anos quando Agar gerou Ismael a Abrão.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Gênesis 16, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.