Gênesis 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI
1 Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu.
1 No mundo todo havia apenas uma língua, um só modo de falar.
2 Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ.
2 Saindo os homens do Oriente, encontraram uma planície em Sinear e ali se fixaram.
3 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ.
3 Disseram uns aos outros: "Vamos fazer tijolos e queimá-los bem". Usavam tijolos em lugar de pedras, e piche em vez de argamassa.
4 Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.”
4 Depois disseram: "Vamos construir uma cidade, com uma torre que alcance os céus. Assim nosso nome será famoso e não seremos espalhados pela face da terra".
5 Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu.
5 O Senhor desceu para ver a cidade e a torre que os homens estavam construindo.
6 Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime.
6 E disse o Senhor: "Eles são um só povo e falam uma só língua, e começaram a construir isso. Em breve nada poderá impedir o que planejam fazer.
7 Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.”
7 Venham, desçamos e confundamos a língua que falam, para que não entendam mais uns aos outros".
8 Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ.
8 Assim o Senhor os dispersou dali por toda a terra, e pararam de construir a cidade.
9 Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.
9 Por isso foi chamada Babel, porque ali o Senhor confundiu a língua de todo o mundo. Dali o Senhor os espalhou por toda a terra.
10 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem.
10 Este é o registro da descendência de Sem: Dois anos depois do Dilúvio, aos 100 anos de idade, Sem gerou Arfaxade.
11 Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
11 E depois de ter gerado Arfaxade, Sem viveu 500 anos e gerou outros filhos e filhas.
12 Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela.
12 Aos 35 anos, Arfaxade gerou Salá.
13 Mgbe ọ mụchara Shela, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
13 Depois que gerou Salá, Arfaxade viveu 403 anos e gerou outros filhos e filhas.
14 Shela gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke Eba.
14 Aos 30 anos, Salá gerou Héber.
15 Mgbe ọ ghọrọ nna Eba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
15 Depois que gerou Héber, Salá viveu 403 anos e gerou outros filhos e filhas.
16 Eba gbara iri afọ atọ na anọ mgbe ọ mụrụ Peleg.
16 Aos 34 anos, Héber gerou Pelegue.
17 Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
17 Depois que gerou Pelegue, Héber viveu 430 anos e gerou outros filhos e filhas.
18 Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu.
18 Aos 30 anos, Pelegue gerou Reú.
19 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
19 Depois que gerou Reú, Pelegue viveu 209 anos e gerou outros filhos e filhas.
20 Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug.
20 Aos 32 anos, Reú gerou Serugue.
21 Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
21 Depois que gerou Serugue, Reú viveu 207 anos e gerou outros filhos e filhas.
22 Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ.
22 Aos 30 anos, Serugue gerou Naor.
23 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
23 Depois que gerou Naor, Serugue viveu 200 anos e gerou outros filhos e filhas.
24 Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera.
24 Aos 29 anos, Naor gerou Terá.
25 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
25 Depois que gerou Terá, Naor viveu 119 anos e gerou outros filhos e filhas.
26 Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.
26 Aos 70 anos, Terá havia gerado Abrão, Naor e Harã.
27 Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera.
27 Esta é a história da família de Terá: Terá gerou Abrão, Naor e Harã. E Harã gerou Ló.
28 Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa.
28 Harã morreu em Ur dos caldeus, sua terra natal, quando ainda vivia Terá, seu pai.
29 Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
29 Tanto Abrão como Naor casaram-se. O nome da mulher de Abrão era Sarai, e o nome da mulher de Naor era Milca; esta era filha de Harã, pai de Milca e de Iscá.
30 Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
30 Ora, Sarai era estéril; não tinha filhos.
31 Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran, na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.
31 Terá tomou seu filho Abrão, seu neto Ló, filho de Harã, e sua nora Sarai, mulher de seu filho Abrão, e juntos partiram de Ur dos caldeus para Canaã. Mas, ao chegarem a Harã, estabeleceram-se ali.
32 Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.
32 Terá viveu 205 anos e morreu em Harã.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Gênesis 11, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.