Gálatas 5

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ACF

Sair da comparação
ACF Almeida Corrigida Fiel
1 Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ.
1 Estai, pois, firmes na liberdade com que Cristo nos libertou, e não torneis a colocar-vos debaixo do jugo da servidão.
2 Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla.
2 Eis que eu, Paulo, vos digo que, se vos deixardes circuncidar, Cristo de nada vos aproveitará.
3 Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ.
3 E de novo protesto a todo o homem, que se deixa circuncidar, que está obrigado a guardar toda a lei.
4 E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya.
4 Separados estais de Cristo, vós os que vos justificais pela lei; da graça tendes caído.
5 Nʼihi na anyị onwe anyị nwere olileanya na site nʼike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe anyị.
5 Porque nós pelo Espírito da fé aguardamos a esperança da justiça.
6 Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.
6 Porque em Jesus Cristo nem a circuncisão nem a incircuncisão tem valor algum; mas sim a fé que opera pelo amor.
7 Unu na-agbabu ọsọ nke ọma, onye gbochiri unu ikwenyere eziokwu ahụ?
7 Corríeis bem; quem vos impediu, para que não obedeçais à verdade?
8 Ụdị nkwagide ahụ esiteghị nʼebe Onye ahụ kpọrọ unu bịa.
8 Esta persuasão não vem daquele que vos chamou.
9 Nwantịntị ihe na-eko achịcha na-eme ka ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ koo.
9 Um pouco de fermento leveda toda a massa.
10 Enwere m ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị na unu agaghị eche echiche nʼụdị a ọzọ, ma ikpe ọmụma ga-adịrị onye ọbụla na-eduhie unu ọzọ.
10 Confio de vós, no Senhor, que nenhuma outra coisa sentireis; mas aquele que vos inquieta, seja ele quem for, sofrerá a condenação.
11 Ụmụnna m, ọ bụrụ nʼezie na m na-ekwusa mkpa obibi ugwu dị, gịnị mere e ji nọgide na-akpagbu m? Ọ bụrụ na m mee otu ahụ, ewepụla m ihe ọdachi ahụ dị nʼobe.
11 Eu, porém, irmãos, se prego ainda a circuncisão, por que sou, pois, perseguido? Logo o escândalo da cruz está aniquilado.
12 Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ahụ na-esogbu unu ga-eme onwe ha ndị onozi.
12 Eu quereria que fossem cortados aqueles que vos andam inquietando.
13 Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo.
13 Porque vós, irmãos, fostes chamados à liberdade. Não useis então da liberdade para dar ocasião à carne, mas servi-vos uns aos outros pelo amor.
14 Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”
14 Porque toda a lei se cumpre numa só palavra, nesta: Amarás ao teu próximo como a ti mesmo.
15 Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kpacharanụ anya ka unu hapụ ịla onwe unu nʼiyi.
15 Se vós, porém, vos mordeis e devorais uns aos outros, vede não vos consumais também uns aos outros.
16 Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.
16 Digo, porém: Andai em Espírito, e não cumprireis a concupiscência da carne.
17 Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.
17 Porque a carne cobiça contra o Espírito, e o Espírito contra a carne; e estes opõem-se um ao outro, para que não façais o que quereis.
18 Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu.
18 Mas, se sois guiados pelo Espírito, não estais debaixo da lei.
19 Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.
19 Porque as obras da carne são manifestas, as quais são: adultério, fornicação, impureza, lascívia,
20 Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.
20 Idolatria, feitiçaria, inimizades, porfias, emulações, iras, pelejas, dissensões, heresias,
21 Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.
21 Invejas, homicídios, bebedices, glutonarias, e coisas semelhantes a estas, acerca das quais vos declaro, como já antes vos disse, que os que cometem tais coisas não herdarão o reino de Deus.
22 Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
22 Mas o fruto do Espírito é: amor, gozo, paz, longanimidade, benignidade, bondade, fé, mansidão, temperança.
23 ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.
23 Contra estas coisas não há lei.
24 Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.
24 E os que são de Cristo crucificaram a carne com as suas paixões e concupiscências.
25 Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
25 Se vivemos em Espírito, andemos também em Espírito.
26 Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị.
26 Não sejamos cobiçosos de vanglórias, irritando-nos uns aos outros, invejando-nos uns aos outros.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Gálatas 5, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.