Ezequiel 42
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH
1 Nwoke ahụ duuru m gaa nʼakụkụ ugwu, banye nʼime ogige ahụ dị nʼezi, kpọbata m nʼime ọnụụlọ ndị ahụ dị na ncherita ihu nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
1 Então o homem me fez sair para o pátio de fora e me levou para o lado norte do Templo, a um edifício que não ficava longe do edifício construído na ponta oeste do Templo.
2 Ụlọ ahụ nke ọnụ ụzọ ya chere ihu nʼebe ugwu dị iri mita ise na atọ nʼogologo, ebe obosara ya dị iri mita abụọ na asaa.
2 Esse edifício do lado norte media cinquenta metros de comprimento por vinte e cinco de largura.
3 Ma nʼakụkụ nke dị iri mita na otu, site nʼime ogige nakwa nʼakụkụ nke dị na ncherita ihu pevumentị nke ogige dị nʼezi, ebe njegharị chere ebe njegharị ọzọ ihu, nʼokpukpu atọ ahụ.
3 De um lado, dava frente para o espaço de dez metros ao longo do Templo e, do outro lado, dava frente para a calçada do pátio de fora. Tinha três andares, e cada um deles ficava mais para dentro do que o de baixo.
4 Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu.
4 No lado norte desse edifício havia uma passagem de cinco metros de largura por cinquenta de comprimento, com entradas desse lado.
5 Okpukpu ụlọ nke dị nʼelu asaghị mbara dịka nke dị nʼala, nʼihi na ebe njegharị ndị ahụ weere ọtụtụ oghere karịa ka ọ dị nʼọnụụlọ ndị dị okpukpu nke dị nʼala na nke etiti ụlọ ahụ.
5 Os cômodos do andar de cima eram mais estreitos do que os do andar do meio e do térreo porque ficavam mais para dentro.
6 Ebe a na-ejighị ogidi wuo ụlọ a, dịka e si wuo ndị dị nʼogige, nke a mere ka ụlọ ndị dị nʼelu na-akpa nkpa karịa ndị nke dị nʼala, na ndị dị nʼetiti.
6 Nos três andares, os cômodos ficavam em terraços e não eram sustentados por colunas como os outros edifícios do pátio. No andar térreo, a parede de fora do edifício media cinquenta metros. Numa metade dessa parede havia cômodos; na outra metade não havia. Todo o andar de cima era dividido em cômodos. Na ponta leste do edifício, onde começava a parede, havia, debaixo dos cômodos, uma entrada que dava para o pátio de fora. No lado sul do Templo havia um edifício igual ao anterior, perto do prédio que ficava na ponta oeste do Templo.
7 E nwere mgbidi aja nke dị nʼezi nʼakụkụ ọnụụlọ niile, nʼụzọ ogige nke dị nʼezi. Ọ mapụtara nʼihu ọnụụlọ ndị ahụ, ogologo ihe dị iri mita abụọ na asaa.
7 — ausente —
8 Nʼọtụtụ ogologo ọnụụlọ ndị a, ndị dị nso nʼogige mpụta, ruru mita iri abụọ na itoolu, ebe ogologo ndị nke dịkarịsịrị nso ebe nsọ ahụ, ruru mita iri ise na asatọ.
8 — ausente —
9 Nʼokpuru ọnụụlọ ndị a, e nwere ụzọ mbata nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka mmadụ na-abata ha site nʼogige dị na mpụta.
9 — ausente —
10 Nʼakụkụ ndịda, nʼogologo aja ụlọ dị nʼogige mpụta, nke dị nʼakụkụ ogige ụlọnsọ ukwu, nke chere aja ụlọ mpụta ihu, ọtụtụ ọnụụlọ dị ya.
10 — ausente —
11 Ụzọ njegharị dị nʼetiti akụkụ abụọ ụlọ ahụ, ha dịkwa ka ọnụụlọ ndị ahụ nke dị nʼụzọ ugwu. Ogologo ha na obosara ha bụ otu; ha niile yiri onwe ha. Ọnụ ụzọ ya dịkwa ka ọnụ ụzọ dị nʼugwu.
11 Na frente dos cômodos havia uma passagem igual à do lado norte. Tinha as mesmas medidas, o mesmo desenho e o mesmo tipo de entradas.
12 Otu a ka ọnụ ụzọ e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị a dị na ndịda si dị. E nwere ọnụ ụzọ na mpụta, nke dị na mgbidi ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. Ebe a ka e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị ahụ.
12 Havia, debaixo dos cômodos, uma porta no lado sul do edifício, na ponta leste onde começava a parede.
13 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ime ọnụụlọ niile dị nʼugwu, na ime ọnụụlọ ndị dị na ndịda, bụ ndị a chere ogige ụlọnsọ ahụ ihu, bụ ime ụlọ dị nsọ, nke ndị nchụaja. Ebe ndị nchụaja ndị na-abịa nso Onyenwe anyị ịchụ aja ga-anọ rie nri niile nke kachasị nsọ, nʼebe ahụ ka ha ga-edebekwa aja ịnata ihuọma, aja mmehie na aja ikpe ọmụma, nʼihi na ụlọ ndị a dị nsọ.
13 O homem me disse: — Estes dois edifícios são sagrados. Neles, os sacerdotes que entram na presença do
14 Mgbe ndị nchụaja bara nʼime ebe nsọ ahụ nke e kewapụrụ iche, ha aghaghị esikwa nʼebe ahụ pụta nʼogige mpụta ezi, tupu ruo mgbe ha yisara uwe ha yii jee ozi, nʼihi na uwe ndị a dị nsọ. Ha ga-eyiri uwe ọzọ, tupu ha abanye nʼakụkụ ụlọ ndị ahụ dịịrị ndị ọzọ.”
14 Quando os sacerdotes estiverem no Templo e quiserem sair para o pátio de fora, terão de deixar nesses cômodos as roupas santas que tiverem usado durante o culto religioso. Eles terão de vestir outras roupas antes de saírem para o lugar onde o povo se reúne.
15 Mgbe ọ tụchara ihe ndị dị nʼime ebe ụlọnsọ ahụ, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼọwụwa anyanwụ pụta, tụkwaa nʼakụkụ niile gburugburu.
15 Quando acabou de medir por dentro a área do Templo, o homem me fez sair pelo portão do lado leste e então mediu a área por fora.
16 O ji ihe ọtụtụ dị ogologo tụọ akụkụ ọwụwa anyanwụ, ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
16 Com a vara de medir, ele mediu o lado leste: tinha duzentos e cinquenta metros. Aí ele mediu os lados norte, sul e oeste, e cada lado tinha a mesma largura, isto é, duzentos e cinquenta metros.
17 O ji mkpirisi osisi ahụ e ji atụ ihe tụọ akụkụ nke ugwu ma chọpụta na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
17 — ausente —
18 Ọ tụkwara akụkụ nke ndịda, chọpụtakwa na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
18 — ausente —
19 Mgbe ahụ, ọ tụgharịrị jirikwa ihe ọtụtụ ahụ tụọkwa akụkụ nke ọdịda anyanwụ. Ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
19 — ausente —
20 Ya mere, ọ tụrụ akụkụ anọ niile nke ebe ahụ. Mgbidi gbara ya gburugburu. Ọtụtụ ha dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, nʼogologo, obosara ya dịkwa ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, iji kewapụta ebe dị nsọ site nʼebe ndị ọzọ.
20 Assim o muro cercava uma área quadrada que tinha duzentos e cinquenta metros de cada lado. O muro servia para separar o que era santo do que não era.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Ezequiel 42, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.