Ezequiel 39

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH

Sair da comparação
NTLH Nova Tradução na Linguagem de Hoje 2000
1 “Ma gị, nwa nke mmadụ buo amụma megide Gog, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m emegide gị, Gog, onyeisi nke Meshek na Tubal.
1 O Senhor Deus disse: —
2 Aga m echigharị gị, kpụrụ gị na-aga. Aga m esi nʼebe dịkarịsịrị anya nʼakụkụ ugwu kpọta gị, ziga gị ka i buso ugwu niile nke Izrel agha.
2 Eu o farei virar para outra direção e o guiarei do Norte distante até que chegue às montanhas de Israel.
3 Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ.
3 Aí arrancarei o arco da mão esquerda dele; e as flechas, da mão direita.
4 Nʼelu ugwu niile nke Izrel ka ị ga-ada, gị onwe gị, na usuu ndị agha gị niile, na mba niile dị iche iche ndị na-eso gị. Udele niile dị iche iche na anụ ọhịa niile ka m ga-enyefe anụ ahụ unu ka ha were unu mere ihe oriri.
4 Gogue e o seu exército e as nações que estão do lado dele cairão mortos nas montanhas de Israel. E eu deixarei que os seus corpos sejam comidos por todas as aves e animais ferozes.
5 Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
5 Eles cairão mortos em campo aberto. Sou eu, o Senhor Deus, quem está falando.
6 Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
6 Começarei um incêndio na terra de Magogue e no litoral, onde o povo vive seguro, e todos ficarão sabendo que eu sou o Senhor .
7 “ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ. Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel.
7 Farei com que o meu povo de Israel conheça o meu santo nome e nunca mais deixarei que o meu nome seja profanado . Então as nações ficarão sabendo que eu, o Senhor , sou o Deus Santo de Israel.
8 Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya.
8 O Senhor Deus disse: — O dia do qual eu falei vai chegar mesmo.
9 “ ‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ.
9 O povo que vive nas cidades de Israel sairá e ajuntará as armas abandonadas, para fazer fogo com elas. E durante sete anos acenderão fogo com os escudos , arcos, flechas, porretes e lanças.
10 Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
10 Não terão de ajuntar lenha nos campos, nem de cortar árvores na floresta, pois terão as armas abandonadas para queimar. Eles roubarão e tirarão as coisas daqueles que os roubaram e tiraram as suas coisas. O
11 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog.
11 O Senhor disse: — Quando tudo isso acontecer, darei a
12 “ ‘Ọnwa asaa ka ọ ga-ewe ndị Izrel ili ozu ahụ niile, ime ka ala ahụ dị ọcha.
12 Os israelitas levarão sete meses para sepultar todos os mortos e purificar de novo a terra.
13 Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
13 Todos na terra de Israel ajudarão a sepultá-los e, por causa disso, receberão homenagens no dia da minha vitória. Sou eu, o Senhor Deus, quem está falando.
14 A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala.
14 Depois de passarem esses sete meses, serão escolhidos homens encarregados de andarem pelo país a fim de achar e sepultar os corpos que ficaram no chão. Assim eles deixarão a terra pura .
15 Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha.
15 Andarão pelo país e, toda vez que encontrarem um osso humano, porão um sinal ao lado até que os coveiros cheguem e sepultem o osso no vale do Exército de Gogue.
16 Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’
16 Haverá ali perto uma cidade que terá o nome desse exército. E assim a terra ficará pura de novo.
17 “Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara.
17 O Senhor Deus me disse o seguinte: —
18 Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan.
18 Eles comerão a carne dos soldados e beberão o sangue dos governadores da terra. Todos esses governadores serão mortos como se fossem carneiros, carneirinhos, bodes ou bois gordos.
19 Unu ga-erijukwa abụba afọ, ṅụbigakwa ọbara oke ruo mgbe ọ ga-ebu unu, site nʼaja mmemme nke m na-achụ nʼihi unu.
19 Quando eu matar essa gente como se fossem sacrifícios, as aves e os animais comerão gordura até não quererem mais e beberão sangue até ficarem bêbados.
20 Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
20 Sentados à minha mesa, eles comerão à vontade a carne dos cavalos e dos seus cavaleiros, dos soldados e dos guerreiros. Eu, o Senhor Deus, estou falando.
21 “Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha.
21 O Senhor disse: — Eu vou deixar que as nações vejam a minha
22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.
22 Daquele dia em diante, os israelitas ficarão sabendo que eu sou o Senhor , seu Deus.
23 Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.
23 E as nações ficarão sabendo que os israelitas foram levados presos para fora do seu país por causa dos pecados que cometeram contra mim. Eu me afastei deles e deixei que os seus inimigos os derrotassem e os matassem na guerra.
24 Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.
24 Eu os tratei de acordo com o que as suas ações nojentas e as suas maldades mereciam e me afastei deles.
25 “Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.
25 O Senhor Deus disse: — Agora, terei misericórdia dos descendentes de Jacó, que são o povo de Israel, e farei com que prosperem de novo. E protegerei o meu santo nome.
26 Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu.
26 Quando estiverem outra vez vivendo em segurança na sua própria terra, sem ninguém para ameaçá-los, aí serão capazes de esquecer a desgraça em que caíram por terem me traído.
27 Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche.
27 Para mostrar a muitas nações que eu sou santo, eu os trarei de volta de todos os países onde os seus inimigos vivem.
28 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Ha ga-amata na ọ bụ ezie na ọ bụ m mere ka a dọta ha nʼagha buru ha jee mba dị iche iche, na m ga-achịkọta ha mee ka ha lọghachi nʼala nke aka ha. Ọ dịkwaghị onye a ga-ahapụ na mba ọzọ.
28 Então o meu povo ficará sabendo que eu sou o Senhor , seu Deus, pois os levei presos para fora do seu país e agora os ajuntei e trouxe de volta, sem deixar nenhum deles longe da sua própria terra.
29 Agaghị m ezokwa ihu m ọzọ nʼebe ha nọ, nʼihi na aga m awụkwasị ụlọ Izrel Mmụọ m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
29 Derramarei o meu Espírito sobre o povo de Israel e nunca mais me afastarei deles. Eu, o Senhor Deus, falei.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Ezequiel 39, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.