Ezequiel 26

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ARC

Sair da comparação
ARC Almeida Revista e Corrigida 2009
1 Nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa, nʼafọ nke iri na otu, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị,
1 E sucedeu, no undécimo ano, ao primeiro do mês, que veio a mim a palavra do Senhor , dizendo:
2 “Nwa nke mmadụ, Taịa aṅụrịala ọṅụ nʼihi ọdịda Jerusalem. Ọ na-ekwukwa na-asị, ‘Ahaa, agbajiela obodo ahụ bụ ọnụ ụzọ e si eje mba dị iche iche. Ọnụ ụzọ ama ya niile egherekwala oghe nye m. Ugbu a, e mebirila ya, ihe ga-agara m nke ọma karịa.’
2 Filho do homem, visto como Tiro disse no tocante a Jerusalém: Ah! Ah! Está quebrada a porta dos povos; virou-se para mim; eu me encherei, agora que ela está assolada,
3 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, ana m eguzo imegide gị Taịa. Aga m emekwa ka ọtụtụ mba bilie bịakwasị gị dịka ebili mmiri nke oke osimiri.
3 portanto, assim diz o Senhor Jeová : Eis que eu estou contra ti, ó Tiro, e farei subir contra ti muitas nações, como se o mar fizesse subir as suas ondas.
4 Ha ga-etida mgbidi Taịa niile, kwadakwa ụlọ elu ya niile. Aga m akọchapụ aja mgbidi ya dakpọrọ adakpọ mee ka ala ahụ ghọọ ala nkume nkume.
4 Elas destruirão os muros de Tiro e derribarão as suas torres; e eu varrerei o seu pó e dela farei uma penha descalvada.
5 Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha.
5 No meio do mar, virá a ser um enxugadouro das redes; porque eu o anunciei, diz o Senhor Jeová ; e ela servirá de despojo para as nações.
6 Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
6 E suas filhas, que estão no campo, serão mortas, à espada; e saberão que eu sou o Senhor .
7 “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa.
7 Porque assim diz o Senhor Jeová : Eis que eu trarei contra Tiro a Nabucodonosor, rei de Babilônia, desde o Norte, o rei dos reis, com cavalos, e com carros, e com cavaleiros, e companhias, e muito povo.
8 Ọ ga-ebu ụzọ jiri mma agha bibie ndị gị bi nʼelu ala. Ọ ga-agbakwa obodo gị gburugburu, wulie mgbidi agha ya elu, imegide mgbidi obodo gị. Ọ ga-ewelikwa ọta agha ya elu.
8 As tuas filhas, no campo ele as matará à espada, e fará um baluarte contra ti, e fundará uma tranqueira contra ti, e levantará rodelas contra ti.
9 Ọ ga-echezikwa ihe agha e ji akwatu mgbidi nʼebe mgbidi gị dị, jiri ngwa agha ya kwada ụlọ elu gị niile.
9 E porá trabucos em frente de ti contra os teus muros e derribará as tuas torres com os seus machados.
10 Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke ga-eme ka ha jiri uzuzu kpuchie gị. Mgbidi gị ga-ama jijiji nʼihi oke ụzụ nke ịnyịnya agha ndị a, na ụgbọ agha, na wagọn ịnyịnya na-adọkpụ ga-eme, mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama gị, dị ka mgbe ọtụtụ mmadụ na-abanye nʼime obodo e tidara mgbidi ya.
10 Pela multidão de seus cavalos te cobrirá de pó; os teus muros tremerão com o estrondo dos cavaleiros, e das rodas, e dos carros, quando ele entrar pelas tuas portas, como pelas entradas de uma cidade em que se fez brecha.
11 Ọ ga-eji ụkwụ ịnyịnya ya niile zọtọọ okporoụzọ gị niile, jirikwa mma agha gbuchapụ ndị gị niile. Ogidi niile nke ike gị ga-adaru ala.
11 Com as unhas dos seus cavalos pisará todas as tuas ruas; ao teu povo matará à espada, e as colunas da tua fortaleza cairão por terra.
12 Ha ga-akwara akụ gị niile, na ihe ahịa gị niile dịka ihe ha dọtara nʼagha. Ha ga-akwatu mgbidi gị niile, na ụlọ ọma gị niile, kpokọtaa osisi gị niile, na nkume niile, na ngwongwo niile nʼabaghị uru wụnye ha nʼime osimiri.
12 E roubarão as tuas riquezas, e saquearão as tuas mercadorias, e derribarão os teus muros, e arrasarão as tuas casas preciosas; e as tuas pedras, e as tuas madeiras, e o teu pó lançarão no meio das águas.
13 Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ.
13 E farei cessar o arruído das tuas cantigas, e o som das tuas harpas não se ouvirá mais.
14 Aga m emekwa ka ala gị ghọọ ala nkume nkume, nke ihe na-adịghị nʼime ya. Ị ga-abụkwa ebe ndị ọkụ azụ ga na-agbasa ụgbụ ha. Ọ dịghị onye ga-ewuzi gị ọzọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
14 E farei de ti uma penha descalvada; virás a ser um enxugadouro das redes, nunca mais serás edificada; porque eu, o Senhor , o falei, diz o Senhor Jeová .
15 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Taịa, Ọ bụ na agaghị anụ mkpọtụ ọdịda gị na mba ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri, mgbe ndị e merụrụ ahụ ga na-asụ ude nʼoge a na-egbu ndị bi nʼime gị?
15 Assim diz o Senhor Jeová a Tiro: Não tremerão as ilhas com o estrondo da tua queda, quando gemerem os traspassados, quando se fizer uma espantosa matança no meio de ti?
16 Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị.
16 E todos os príncipes do mar descerão dos seus tronos, e tirarão de si os seus mantos, e despirão as suas vestes bordadas; de tremores se vestirão, sobre a terra se assentarão e estremecerão a cada momento; e, por tua causa, pasmarão.
17 Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị,
17 E levantarão uma lamentação sobre ti e te dirão: Como pereceste, ó bem-povoada e afamada cidade, que foste forte no mar; tu e os teus moradores, que atemorizaram a todos os teus visitantes!
18 Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri
18 Agora, estremecerão as ilhas no dia da tua queda; as ilhas, que estão no mar, turbar-se-ão com tua saída.
19 “Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị,
19 Porque assim diz o Senhor Jeová : Quando eu te tiver feito uma cidade assolada, como as cidades que se não habitam, quando fizer sobre ti um abismo, e as muitas águas te cobrirem,
20 mgbe ahụ ka m ga-eme ka ị rịdaruo nʼala mmụọ, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka i jekwuru ndị mgbe ochie. Aga m eme ka ebe obibi gị bụrụ nʼokpuru ime ime ala, ka ị dịrị ka obodo ndị ochie ahụ e tikpọrọ etikpọ. Gị na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ị gaghị esitekwa nʼebe ahụ lọghachi ịbịa isoro ndị dị ndụ birikwa.
20 então, te farei descer com os que descem à cova, ao povo antigo, e te deitarei nas mais baixas partes da terra, em lugares desertos antigos, com os que descem à cova, para que não sejas habitada; e estabelecerei a glória na terra dos viventes.
21 Aga m eme ka ọgwụgwụ gị bụrụ ihe a ga-atụ egwu. Ị gaghị adịkwa. A ga-achọ gị, ma agaghị achọta gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
21 Farei de ti um grande espanto, e não serás mais; quando te buscarem, nunca mais serás achada, diz o Senhor Jeová .

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Ezequiel 26, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.