Ezequiel 25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVT

Sair da comparação
NVT Nova Versão Transformadora
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
1 Então recebi esta mensagem do S enhor :
2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha.
2 “Filho do homem, volte o rosto para a terra de Amom e profetize contra seus habitantes.
3 Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu,
3 Transmita aos amonitas esta mensagem do S enhor Soberano: Ouçam a palavra do S enhor Soberano! Porque vocês se alegraram quando meu templo foi profanado, zombaram de Israel em sua desolação e riram de Judá quando ele foi enviado para o exílio,
4 nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị.
4 eu os entregarei aos nômades dos desertos do leste. Eles montarão acampamentos em seu meio e armarão tendas em sua terra. Colherão seus frutos e beberão o leite de seu gado.
5 Aga m eme ka obodo Raba ghọọ ebe ịta nri nye ịnyịnya kamel, meekwa ka ala Amọn ghọọ ebe igwe ewu na atụrụ na-amakpu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
5 Transformarei a cidade de Rabá em pasto para camelos e todo o território dos amonitas em lugar de descanso para ovelhas. Então vocês saberão que eu sou o S enhor .
6 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Nʼihi na ị kụrụ aka gị, zọọ ụkwụ gị nʼala gidim, ma sitekwa nʼịkpọ asị nke obi gị ṅụrịa ọṅụ megide ala Izrel,
6 “Assim diz o S enhor Soberano: Porque bateram palmas, dançaram e pularam exultantes com a destruição do povo de Israel,
7 nʼihi ya, lee, aga m esetipụ aka m megide gị, were gị nyefee nʼaka ọtụtụ mba, ndị ga-alụta gị nʼagha. Aga m eme ka ị gwụsịa, mee ka ị hapụ ịdịkwa ọzọ. Aga m ala gị nʼiyi. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
7 levantarei minha mão contra vocês. Eu os entregarei como despojo a muitas nações. Eliminarei vocês dentre os povos e os destruirei completamente. Então vocês saberão que eu sou o S enhor .”
8 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Moab na Sia sịrị, “Lee, Juda adịrịla ka mba ndị ọzọ niile,”
8 “Assim diz o S enhor Soberano: Porque o povo de Moabe disse que Judá é como todas as outras nações,
9 nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ.
9 abrirei seu lado leste e acabarei com as imponentes cidades de sua fronteira: Bete-Jesimote, Baal-Meom e Quiriataim.
10 Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile.
10 Entregarei Moabe aos nômades dos desertos do leste, como entreguei Amom. Os amonitas não serão mais contados entre as nações.
11 Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
11 Da mesma forma, trarei meu julgamento sobre os moabitas. Então eles saberão que eu sou o S enhor .”
12 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara,
12 “Assim diz o S enhor Soberano: O povo de Edom pecou grandemente quando se vingou do povo de Judá.
13 nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo.
13 Portanto, assim diz o S enhor Soberano: Levantarei minha mão contra Edom. Exterminarei seus habitantes e seus animais com a espada. Transformarei a terra em deserto, desde Temã até Dedã.
14 Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
14 Farei isso por meio de meu povo, Israel. Eles executarão minha vingança com terrível ira, e Edom saberá que essa vingança veio de mim. Eu, o S enhor Soberano, falei!”
15 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi.
15 “Assim diz o S enhor Soberano: Os habitantes da Filístia atacaram Judá por vingança amarga e ódio profundo.
16 Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri.
16 Portanto, assim diz o S enhor Soberano: Levantarei minha mão contra os filisteus. Exterminarei os queretitas e destruirei completamente os habitantes do litoral.
17 Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’ ”
17 Executarei vingança terrível contra eles para castigá-los por aquilo que fizeram. E, quando eu tiver me vingado, eles saberão que eu sou o S enhor ”.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Ezequiel 25, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.