Ezequiel 24

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI

Sair da comparação
NVI Nova Versão Internacional
1 O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
1 No décimo dia do décimo mês do nono ano, a palavra do Senhor veio a mim. Disse ele:
2 “Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu.
2 "Filho do homem, registre esta data, a data de hoje, porque o rei da Babilônia sitiou Jerusalém exatamente neste dia.
3 Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
3 Conte a essa nação rebelde uma parábola e diga-lhes: ‘Assim diz o Soberano Senhor: " ‘Ponha a panela para esquentar; ponha-a para esquentar e coloque água nela.
4 Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya.
4 Ponha dentro dela pedaços de carne, os melhores pedaços da coxa e da espádua. Encha-a com o melhor desses ossos;
5 Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ,
5 apanhe o melhor do rebanho. Empilhe lenha debaixo dela para os cozinhar; faça-a ferver a água e cozinhe tudo o que está na panela.
6 “ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
6 " ‘Porque assim diz o Soberano Senhor: " ‘Ai da cidade sanguinária, da panela que agora tem uma crosta, cujo resíduo não desaparecerá! Esvazie-a pedaço por pedaço, sem sorteá-los.
7 “ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya.
7 " ‘Pois o sangue que ela derramou está no meio dela: Ela o derramou na rocha nua; não o derramou no chão, onde o pó o cobriria.
8 Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ
8 Para atiçar a minha ira e me vingar, pus o sangue dela sobre a rocha nua, para que ele não fosse coberto.
9 “ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
9 " ‘Portanto assim diz o Soberano Senhor: " ‘Ai da cidade sanguinária! Eu também farei uma pilha de lenha, uma pilha bem alta.
10 Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,
10 Por isso amontoem a lenha e acendam o fogo. Cozinhem bem a carne, misturando os temperos; e reduzam os ossos a cinzas.
11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,
11 Ponham depois a panela vazia sobre as brasas para que se esquente até que o seu bronze fique incandescente, e as suas impurezas se derretam, e o seu resíduo seja queimado e desapareça.
12 Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.
12 Mas ela frustrou todos os esforços; nem o fogo pôde eliminar seu resíduo espesso!
13 “ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
13 " ‘Ora, a sua impureza é a lascívia. Como eu desejei purificá-la mas você não quis ser purificada de sua impureza, você não voltará a estar limpa, enquanto não se abrandar a minha ira contra você.
14 “ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
14 " ‘Eu, o Senhor, falei. Chegou a hora de eu agir. Não me conterei; não terei piedade, nem voltarei atrás. Você será julgada de acordo com o seu comportamento e com as suas ações, palavra do Soberano Senhor’ ".
15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
15 Veio a mim esta palavra do Senhor:
16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.
16 "Filho do homem, com um único golpe estou para tirar de você o prazer dos seus olhos. Contudo não lamente nem chore nem derrame nenhuma lágrima.
17 I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”
17 Não permita que ninguém ouça o seu gemer; não pranteie pelos mortos. Mantenha apertado o seu turbante e as sandálias nos pés; não cubra o rosto nem coma a comida costumeira dos pranteadores".
18 Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.
18 Por isso falei de manhã ao povo, e à tarde a minha mulher morreu. No dia seguinte fiz o que me havia sido ordenado.
19 Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”
19 Então o povo me perguntou: "Você não vai nos dizer que relação essas coisas têm conosco? "
20 Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
20 E eu lhes respondi: "Esta palavra do Senhor veio a mim:
21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.
21 Diga à nação de Israel: ‘Assim diz o Soberano Senhor: Estou a ponto de profanar o meu santuário, a fortaleza de que vocês se orgulham, o prazer dos seus olhos, o objeto da sua afeição. Os filhos e as filhas que vocês deixaram lá, cairão pela espada.
22 Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri.
22 E vocês farão o que eu fiz. Vocês não cobrirão o rosto nem comerão a comida costumeira dos pranteadores.
23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.
23 Vocês manterão os turbantes na cabeça e as sandálias nos pés. Não prantearão nem chorarão, mas irão consumir-se por causa de suas iniqüidades e gemerão uns pelos outros.
24 Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’
24 Ezequiel será um sinal para vocês; vocês farão o que ele fez. Quando isso acontecer, vocês saberão que eu sou o Soberano Senhor’.
25 “Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,
25 "E você, filho do homem, no dia em que eu tirar deles a sua fortaleza, sua alegria e sua glória, o prazer dos seus olhos, e também os seus filhos e as suas filhas, o maior desejo de suas vidas,
26 nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere.
26 naquele dia um fugitivo virá dar-lhe a notícia.
27 Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
27 Naquela hora sua boca será aberta; você falará com ele e não ficará calado. E assim você será um sinal para eles, e eles saberão que eu sou o Senhor".

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Ezequiel 24, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.