Êxodo 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NAA

Sair da comparação
NAA Nova Almeida Atualizada 2017
1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.”
1 O Senhor disse a Moisés: — Apresente-se a Faraó e diga-lhe: Assim diz o
2 Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha,
2 Porque, se você se recusar a deixá-los ir e ainda por força quiser detê-los,
3 aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu.
3 eis que a mão do Senhor trará uma terrível peste sobre o seu rebanho, que está no campo, sobre os cavalos, sobre os jumentos, sobre os camelos, sobre o gado e sobre as ovelhas.
4 Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ”
4 E o Senhor fará distinção entre os rebanhos de Israel e o rebanho do Egito, para que nada morra de tudo o que pertence aos filhos de Israel.
5 Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.”
5 O Senhor designou certo tempo, dizendo: Amanhã o Senhor fará isto na terra.”
6 Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ.
6 E o Senhor o fez no dia seguinte, e todo o rebanho dos egípcios morreu; porém, do rebanho dos israelitas, não morreu um único animal.
7 Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.
7 Faraó mandou verificar, e eis que do rebanho de Israel não havia morrido nem um sequer. Mas o coração de Faraó se endureceu, e ele não deixou o povo ir.
8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero.
8 Então o Senhor disse a Moisés e a Arão: — Peguem mãos cheias de cinza de um forno, e que Moisés atire essa cinza para o ar diante de Faraó.
9 Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.”
9 Ela se transformará em pó fino sobre toda a terra do Egito e em tumores que se arrebentem em úlceras nas pessoas e nos animais, por toda a terra do Egito.
10 Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.
10 Eles pegaram cinza de um forno e se apresentaram a Faraó. Moisés atirou a cinza para o ar, e ela se transformou em tumores que se arrebentavam em úlceras nas pessoas e nos animais.
11 Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ.
11 Os magos não puderam permanecer diante de Moisés, por causa dos tumores, porque havia tumores nos magos e em todos os egípcios.
12 Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.
12 Porém o Senhor endureceu o coração de Faraó, e este não os ouviu, como o Senhor tinha dito a Moisés.
13 Onyenwe anyị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
13 O Senhor disse a Moisés: — Levante-se de manhã cedo, apresente-se a Faraó e diga-lhe: Assim diz o
14 Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.
14 Pois desta vez enviarei todas as minhas pragas sobre o seu coração, sobre os seus oficiais e sobre o seu povo, para que você saiba que em toda a terra não há ninguém que seja semelhante a mim.
15 Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa.
15 Pois eu já poderia ter estendido a mão para ferir você e o seu povo com peste, e você teria sido cortado da terra.
16 Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.
16 Mas, em verdade, foi para isso que eu o mantive: para mostrar a você o meu poder, e para que o meu nome seja anunciado em toda a terra.
17 Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala.
17 Você ainda vai se levantar contra o meu povo, para não deixá-lo ir?
18 Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a.
18 Eis que amanhã, por este tempo, farei cair uma forte chuva de pedras, como nunca houve no Egito, desde o dia em que foi fundado até hoje.
19 Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’ ”
19 Agora, pois, mande recolher o seu gado e tudo o que você tem no campo. Todas as pessoas e os animais que estiverem no campo e não forem levados para casa morrerão ao cair sobre eles a chuva de pedras.”
20 Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu Onyenwe anyị egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha.
20 Aqueles oficiais de Faraó que temiam a palavra do Senhor fizeram com que os seus servos e o seu gado fugissem para as casas;
21 Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu Onyenwe anyị hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa.
21 aqueles, porém, que não se importavam com a palavra do Senhor deixaram que os seus servos e o seu gado ficassem no campo.
22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.”
22 Então o Senhor disse a Moisés: — Estenda a mão para o céu, e cairá chuva de pedras em toda a terra do Egito, sobre as pessoas, sobre animais e sobre toda planta do campo na terra do Egito.
23 Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, Onyenwe anyị zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, Onyenwe anyị zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt.
23 E Moisés estendeu o seu bordão para o céu e o Senhor deu trovões e chuva de pedras, e fogo desceu sobre a terra. E o Senhor fez cair chuva de pedras sobre a terra do Egito.
24 Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba.
24 De maneira que havia chuva de pedras e fogo misturado com a chuva de pedras tão grave, como nunca houve em toda a terra do Egito, desde que veio a ser uma nação.
25 Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.
25 Por toda a terra do Egito a chuva de pedras destruiu tudo o que havia no campo, tanto pessoas como animais. A chuva de pedras destruiu também todas as plantas do campo e quebrou todas as árvores do campo.
26 Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.
26 Somente na terra de Gósen, onde estavam os filhos de Israel, não houve chuva de pedras.
27 Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.
27 Então Faraó mandou chamar Moisés e Arão e lhes disse: — Desta vez pequei. O
28 Kpee ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.”
28 Orem ao Senhor , pois já bastam estes grandes trovões e a chuva de pedras. Eu os deixarei ir, e vocês não ficarão mais aqui.
29 Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị.
29 Moisés respondeu: — Quando eu sair da cidade, estenderei as mãos ao
30 Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ Onyenwe anyị Chineke egwu.”
30 Mas quanto a você e aos seus oficiais, eu sei que ainda não temem o Senhor Deus.
31 Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru.
31 O linho e a cevada foram destruídos, pois a cevada já estava na espiga e o linho estava em flor.
32 Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị.
32 Porém o trigo e o centeio não sofreram dano, porque ainda não haviam nascido.
33 Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ.
33 Moisés saiu da presença de Faraó e da cidade e estendeu as mãos ao Senhor . Cessaram os trovões e a chuva de pedras, e não caiu mais chuva sobre a terra.
34 Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.
34 Quando Faraó viu que cessaram as chuvas, as pedras e os trovões, tornou a pecar e endureceu o coração, ele e os seus oficiais.
35 Ya mere, Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ jụrụ ikwere ka ụmụ Izrel pụọ, dịka Onyenwe anyị gwararịị Mosis.
35 E assim Faraó, de coração endurecido, não deixou ir os filhos de Israel, como o Senhor tinha dito a Moisés.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Êxodo 9, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.