Êxodo 30
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI
1 “Jiri osisi akashia rụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
1 "Faça um altar de madeira de acácia para queimar incenso.
2 Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya ga-adị iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya ga-adị iri sentimita itoolu. Mpi ya niile ga-esi na ya pụta.
2 Será quadrado, com quarenta e cinco centímetros de cada lado e noventa centímetros de altura; suas pontas formarão com ele uma só peça.
3 Jiri ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya, akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
3 Revista de ouro puro a parte superior, todos os lados e as pontas, e faça uma moldura de ouro ao seu redor.
4 Kpụnye mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọbụla, ebe ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
4 Faça duas argolas de ouro de cada lado do altar, abaixo da moldura, que sustentem as varas utilizadas para carregá-lo,
5 Ị ga-eji osisi akashia mee mkpara, jiri ọlaedo machie ha.
5 e use madeira de acácia para fazer as varas e revista-as de ouro.
6 Ị ga-adọba ebe ịchụ aja ahụ nʼihu akwa mgbochi nke kpuchiri igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihu oche ebere ahụ dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ, nʼebe m ga-ezute gị.
6 Coloque o altar em frente do véu que se encontra diante da arca da aliança, diante da tampa que está sobre ele, onde me encontrarei com você.
7 “Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
7 "Arão queimará incenso aromático sobre o altar todas as manhãs, quando vier cuidar das lâmpadas,
8 Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu Onyenwe anyị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
8 e também quando acendê-las ao entardecer. Será queimado incenso continuamente perante o Senhor, pelas suas gerações.
9 Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya.
9 Não ofereçam nesse altar nenhum outro tipo de incenso nem holocausto nem oferta de cereal nem derramem sobre ele ofertas de bebidas.
10 Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie, nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.”
10 Uma vez por ano, Arão fará propiciação sobre as pontas do altar. Essa propiciação anual será realizada com o sangue da oferta para propiciação pelo pecado, geração após geração. Esse altar é santíssimo ao Senhor. "
11 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
11 Disse então o Senhor a Moisés:
12 “Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ.
12 "Quando você fizer o recenseamento dos israelitas, cada um deles terá que pagar ao Senhor um preço pelo resgate por sua vida quando for contado. Dessa forma nenhuma praga virá sobre eles quando você os contar.
13 Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.
13 Cada recenseado contribuirá com seis gramas, com base no peso padrão do santuário, que tem doze gramas. As seis gramas são uma oferta ao Senhor.
14 Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a.
14 Todos os alistados, da idade de vinte anos para cima, darão ao Senhor essa oferta.
15 Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie.
15 Os ricos não contribuirão com mais, nem os pobres darão menos que seis gramas, quando apresentarem a oferta ao Senhor como propiciação por suas vidas.
16 Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche Onyenwe anyị nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.”
16 Receba dos israelitas o preço da propiciação e use-o para o serviço da Tenda do Encontro. Será um memorial perante o Senhor em favor dos israelitas, para fazerem propiciação por suas vidas".
17 Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
17 Disse então o Senhor a Moisés:
18 “Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja.
18 "Faça uma bacia de bronze com uma base de bronze, para se lavarem. Coloque-a entre a Tenda do Encontro e o altar, e mande enchê-la de água.
19 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya.
19 Arão e seus filhos lavarão as mãos e os pés com a água da bacia.
20 Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ,
20 Toda vez que entrarem na Tenda do Encontro, terão que lavar-se com água, para que não morram. Quando também se aproximarem do altar para ministrar ao Senhor, apresentando uma oferta preparada no fogo,
21 ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
21 lavarão as mãos e os pés para que não morram. Esse é um decreto perpétuo, para Arão e os seus descendentes, geração após geração".
22 Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
22 Em seguida o Senhor disse a Moisés:
23 “Were eso osisi na-esi isi ụtọ ndị a dị iche iche: máá, nke ọtụtụ ya ruru kilo isii, na ihe ruru kilo sinamọn abụọ na ụma itoolu, na kilo kalamus atọ,
23 "Junte as seguintes especiarias: seis quilos de mirra líquida, a metade disso, ou seja, três quilos de canela, três quilos de cana aromática,
24 na kilo kashia isii, na lita anọ na ụma asatọ nke mmanụ oliv, dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ ahụ si dị.
24 seis quilos de cássia, com base no peso padrão do santuário, e um galão de azeite de oliva.
25 Ị ga-eji ya mepụta mmanụ nsọ, nke dị nsọ, nke a gwakọtara nke ọma dịka nke onye na-eme mmanụ na-esi isi ụtọ mere. Ọ ga-abụ mmanụ otite dị nsọ.
25 Faça com eles o óleo sagrado para as unções, uma mistura de aromas, obra de perfumista. Este será o óleo sagrado para as unções.
26 Ị ga-ewere mmanụ ahụ tee ụlọ nzute ahụ niile na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ,
26 Use-o para ungir a Tenda do Encontro, a arca da aliança,
27 na tebul ahụ, na ngwongwo ya niile, na nʼihe ịdọsa oriọna, na nʼihe niile dị ya nʼahụ, na nʼebe ịdọsa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
27 a mesa e todos os seus utensílios, o candelabro e os seus utensílios, o altar do incenso,
28 na nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya niile, na nʼite ịsa ụkwụ na aka, na nʼebe a na-adọba ya.
28 o altar do holocausto e todos os seus utensílios, e a bacia com a sua base.
29 Ị ga-edo ha nsọ, ka ha bụrụ ihe dịkarịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-adịkwa nsọ.
29 Você os consagrará e serão santíssimos, e tudo o que neles tocar se tornará santo.
30 “Ị ga-eji mmanụ otite a tee Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha niile ga-adịkwa nsọ, bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
30 "Unja Arão e seus filhos e consagre-os para que me sirvam como sacerdotes.
31 Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
31 Diga aos israelitas: Este será o meu óleo sagrado para as unções, geração após geração.
32 Agaghị awụsa ya nʼahụ mmadụ. O nwekwaghị onye kwesiri imepụta mmanụ otite dị otu a. Ọ dị nsọ, unu kwesikwara ido ya nsọ.
32 Não o derramem sobre nenhum outro homem, e não façam nenhum outro óleo com a mesma composição. É óleo sagrado, e assim vocês devem considerá-lo.
33 A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ”
33 Quem fizer óleo como esse ou usá-lo em alguém que não seja sacerdote, será eliminado do meio do seu povo".
34 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe.
34 Disse ainda o Senhor a Moisés: "Junte as seguintes essências: bálsamo, ônica, gálbano e incenso puro, todos em quantidades iguais,
35 Mee ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke a gwakọtara nke ọma, bụ ọrụ onye na-eme mmanụ isi ụtọ. Tinyekwa ya nnu, ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ a nụchara anụcha, nke dịkwa nsọ.
35 e faça um incenso de mistura aromática, obra de perfumista. Levará sal, será puro e santo.
36 Gwerie ụfọdụ nʼime ya ka ọ dịka uzuzu. Wụsa ya nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ nʼime ụlọ nzute, ebe m ga-ezute gị. Ọ ga-abụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye unu.
36 Moa parte dele, até virar pó, e coloque-o diante das tábuas da aliança, na Tenda do Encontro, onde me encontrarei com você. O incenso lhes será santíssimo.
37 Unu emerela onwe unu nke dịka ọtụtụ ụdị ihe nsure ọkụ a. Hụta ya ka ihe dị nsọ nʼebe Onyenwe anyị nọ.
37 Não façam nenhum outro incenso com a mesma composição para uso pessoal; considerem-no sagrado, reservado para o Senhor.
38 Onye ọbụla meere onwe ya ụdị ihe nsure ọkụ a, ịnụ isisi ya, a ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ụmụnna ya.”
38 Quem fizer um incenso semelhante, para usufruir sua fragrância, será eliminado do seu povo".
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Êxodo 30, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.