Êxodo 12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI

Sair da comparação
NVI Nova Versão Internacional
1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha,
1 O Senhor disse a Moisés e a Arão, no Egito:
2 “Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu.
2 "Este deverá ser o primeiro mês do ano para vocês.
3 Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla.
3 Digam a toda a comunidade de Israel que no décimo dia deste mês todo homem deverá separar um cordeiro ou um cabrito, para a sua família, um para cada casa.
4 Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ.
4 Se uma família for pequena demais para um animal inteiro, deve dividi-lo com seu vizinho mais próximo, conforme o número de pessoas e conforme o que cada um puder comer.
5 Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu.
5 O animal escolhido será macho de um ano, sem defeito, e pode ser cordeiro ou cabrito.
6 Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya.
6 Guardem-no até o décimo quarto dia do mês, quando toda a comunidade de Israel irá sacrificá-lo, ao pôr-do-sol.
7 Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ.
7 Passem, então, um pouco do sangue nas laterais e nas vigas superiores das portas das casas nas quais vocês comerão o animal.
8 Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu.
8 Naquela mesma noite comerão a carne assada no fogo, juntamente com ervas amargas e pão sem fermento.
9 A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.
9 Não comam a carne crua, nem cozida em água, mas assada no fogo: cabeça, pernas e vísceras.
10 Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.
10 Não deixem sobrar nada até pela manhã; caso isso aconteça, queimem o que restar.
11 Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
11 Ao comerem, estejam prontos para sair: cinto no lugar, sandálias nos pés e cajado na mão. Comam apressadamente. Esta é a Páscoa do Senhor.
12 “Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.
12 "Naquela mesma noite passarei pelo Egito e matarei todos os primogênitos, tanto dos homens como dos animais, e executarei juízo sobre todos os deuses do Egito. Eu sou o Senhor!
13 Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt.
13 O sangue será um sinal para indicar as casas em que vocês estiverem; quando eu vir o sangue, passarei adiante. A praga de destruição não os atingirá quando eu ferir o Egito.
14 “Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
14 "Este dia será um memorial que vocês e todos os seus descendentes o comemorarão como festa ao Senhor. Comemorem-no como decreto perpétuo.
15 Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel.
15 Durante sete dias comam pão sem fermento. No primeiro dia tirem de casa o fermento, porque quem comer qualquer coisa fermentada, do primeiro ao sétimo dia, será eliminado de Israel.
16 Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri.
16 Convoquem uma reunião santa no primeiro dia e outra no sétimo. Não façam nenhum trabalho nesses dias, exceto o da preparação da comida para todos. É só o que poderão fazer.
17 “Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ
17 "Celebrem a festa dos pães sem fermento, porque foi nesse mesmo dia que eu tirei os exércitos de vocês do Egito. Celebrem esse dia como decreto perpétuo por todas as suas gerações.
18 Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu.
18 No primeiro mês comam pão sem fermento, desde o entardecer do décimo quarto dia até o entardecer do vigésimo primeiro.
19 Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị Izrel bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala Izrel, dịkwara ndị nwa afọ ala.
19 Durante sete dias vocês não deverão ter fermento em casa. Quem comer qualquer coisa fermentada será eliminado da comunidade de Israel, seja estrangeiro, seja natural da terra.
20 Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.”
20 Não comam nada fermentado. Onde quer que morarem, comam apenas pão sem fermento".
21 Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a.
21 Então Moisés convocou todas as autoridades de Israel e lhes disse: "Escolham um cordeiro ou um cabrito para cada família. Sacrifiquem-no para celebrar a Páscoa!
22 Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ.
22 Molhem um feixe de hissopo no sangue que estiver na bacia e passem o sangue na viga superior e nas laterais das portas. Nenhum de vocês poderá sair de casa até o amanhecer.
23 Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.
23 Quando o Senhor passar pela terra para matar os egípcios, verá o sangue na viga superior e nas laterais da porta e passará sobre aquela porta; e não permitirá que o destruidor entre na casa de vocês para matá-los.
24 “Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu.
24 "Obedeçam a estas instruções como decreto perpétuo para vocês e para os seus descendentes.
25 Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a.
25 Quando entrarem na terra que o Senhor prometeu lhes dar, celebrem essa cerimônia.
26 Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’
26 Quando os seus filhos lhes perguntarem: ‘O que significa esta cerimônia? ’,
27 Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ”
27 respondam-lhes: É o sacrifício da Páscoa ao Senhor, que passou sobre as casas dos israelitas no Egito e poupou nossas casas quando matou os egípcios". Então o povo curvou-se em adoração.
28 Ụmụ Izrel mezuru ihe niile Onyenwe anyị gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn.
28 Depois os israelitas se retiraram e fizeram conforme o Senhor tinha ordenado a Moisés e a Arão.
29 Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.
29 Então, à meia-noite, o Senhor matou todos os primogênitos do Egito, desde o filho mais velho do faraó, herdeiro do trono, até o filho mais velho do prisioneiro que estava no calabouço, e também todas as primeiras crias do gado.
30 Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị.
30 No meio da noite o faraó, todos os seus conselheiros e todos os egípcios se levantaram. E houve grande pranto no Egito, pois não havia casa que não houvesse um morto.
31 Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee Onyenwe anyị unu ofufe dịka unu rịọrọ.
31 Naquela mesma noite o faraó mandou chamar Moisés e Arão e lhes disse: "Saiam imediatamente do meio do meu povo, vocês e os israelitas! Vão prestar culto ao Senhor, como vocês pediram.
32 Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.”
32 Levem os seus rebanhos, como tinham dito, e abençoem a mim também".
33 Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.”
33 Os egípcios pressionavam o povo para que se apressasse em sair do país, dizendo: "Todos nós morreremos! "
34 Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha.
34 Então o povo tomou a massa de pão ainda sem fermento e a carregou nos ombros, nas amassadeiras embrulhadas em suas roupas.
35 Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe.
35 Os israelitas obedeceram à ordem de Moisés e pediram aos egípcios objetos de prata e de ouro, bem como roupas.
36 Onyenwe anyị nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ.
36 O Senhor concedeu ao povo uma disposição favorável da parte dos egípcios, de modo que lhes davam o que pediam; assim eles despojaram os egípcios.
37 Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị.
37 Os israelitas foram de Ramessés até Sucote. Havia cerca de seiscentos mil homens a pé, além de mulheres e crianças.
38 Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ.
38 Grande multidão de estrangeiros de todo tipo seguiu com eles, além de grandes rebanhos, tanto de bois como de ovelhas e cabras.
39 Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri.
39 Com a massa que haviam trazido do Egito, fizeram pães sem fermento. A massa não tinha fermentado, pois eles foram expulsos do Egito e não tiveram tempo de preparar comida.
40 Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ.
40 Ora, o período que os israelitas viveram no Egito foi de quatrocentos e trinta anos.
41 Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt.
41 No dia quando se completaram os quatrocentos e trinta anos, todos os exércitos do Senhor saíram do Egito.
42 Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.
42 Assim como o Senhor passou em vigília aquela noite para tirar do Egito os israelitas, estes também devem passar em vigília essa mesma noite, para honrar ao Senhor, por todas as suas gerações.
43 Onyenwe anyị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga:
43 Disse o Senhor a Moisés e a Arão: "Estas são as leis da Páscoa: Nenhum estrangeiro poderá comê-la.
44 Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu.
44 O escravo comprado poderá comer da Páscoa, depois de circuncidado,
45 Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya.
45 mas o residente temporário e o trabalhador contratado dela não comerão.
46 “A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ.
46 "Vocês a comerão numa só casa; não levem nenhum pedaço de carne para fora da casa, nem quebrem nenhum dos ossos.
47 Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a.
47 Toda a comunidade de Israel terá que celebrar a Páscoa.
48 “Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ.
48 "Qualquer estrangeiro residente entre vocês que quiser celebrar a Páscoa do Senhor terá que circuncidar todos os do sexo masculino da sua família; então poderá participar como o natural da terra. Nenhum incircunciso poderá participar.
49 Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.”
49 A mesma lei se aplicará ao natural da terra e ao estrangeiro residente".
50 Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn.
50 Todos os israelitas fizeram como o Senhor tinha ordenado a Moisés e a Arão.
51 Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị.
51 No mesmo dia o Senhor tirou os israelitas do Egito, organizados segundo as suas divisões.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Êxodo 12, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.