Ester 5

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVT

Sair da comparação
NVT Nova Versão Transformadora
1 Nʼabalị nke atọ ya, Esta yiri uwe eze nwanyị ya, guzo nʼime ime ogige ụlọeze, nke chere ihu nʼụlọ nzukọ ukwu dị nʼụlọeze, ebe eze nọdụ nʼocheeze ya chee ihu nʼọnụ ụzọ.
1 No terceiro dia do jejum, Ester vestiu seus trajes reais e entrou no pátio interno do palácio, em frente do salão do rei. O rei estava sentado no trono, voltado para a entrada.
2 Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka.
2 Quando viu a rainha Ester ali no pátio interno, ele a recebeu de bom grado e lhe estendeu o cetro de ouro. Ester se aproximou e tocou a ponta do cetro.
3 Eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ, eze nwanyị Esta? Gịnị bụ mkpa gị? Aga m emere gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ inye gị otu ọkara alaeze m.”
3 “O que você deseja, rainha Ester?”, perguntou o rei. “Qual é seu pedido? Eu atenderei, mesmo que peça metade do reino!”
4 Esta zara sị, “Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, achọrọ m ka gị na Heman bịa rie oriri m kwadooro unu taa.”
4 Ester respondeu: “Se lhe parecer bem, venha hoje com Hamã a um banquete que preparei para o rei”.
5 Eze tụgharịrị gwa ndị ozi ya sị, “Gwanụ Heman ka o mee ngwangwa bịa ka anyị gaa mee ihe Esta rịọrọ.”
5 O rei se voltou para seus servos e disse: “Digam a Hamã que venha depressa para um banquete, como Ester pediu”. Então o rei e Hamã foram ao banquete que Ester havia preparado.
6 Mgbe ha na-aṅụ mmanya, eze sịrị Esta, “Ugbu a, gwa m ihe ị chọrọ, aga m enye gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ otu ọkara alaeze m.”
6 Enquanto bebiam vinho, o rei disse a Ester: “Agora diga-me o que você deseja. Qual é seu pedido? Eu atenderei, mesmo que peça metade do reino!”.
7 Esta zara sị, “Arịrịọ m na mkpa m bụ nke a,
7 Ester respondeu: “Este é meu pedido e meu desejo:
8 ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu eze nʼezie, ọ bụrụkwa na ọ masịrị eze imere m ihe m na-arịọ, na ime ihe m na-achọ, ka ya na Heman sorokwa bịa echi nʼoriri ọzọ m ga-akwado. Echi ka m ga-akọkwara gị ihe niile.”
8 Se conto com o favor do rei e se lhe parecer bem atender a meu pedido, venha amanhã com Hamã ao banquete que lhes prepararei. Então explicarei do que se trata”.
9 Heman hapụrụ ebe oriri ahụ nʼoke obi ụtọ. Ma mgbe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ama eze, hụkwa na o bilighị maọbụ maa jijiji nʼihu ya, iwe were ya nke ukwuu.
9 Hamã saiu do banquete muito feliz e animado. Contudo, ficou furioso quando viu que Mardoqueu, sentado à porta do palácio, não se levantou nem demonstrou nervosismo em sua presença.
10 Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya.
10 Hamã, porém, se conteve e foi para casa. Então reuniu seus amigos e sua esposa, Zeres,
11 ọ nyara ha isi nʼihi oke akụnụba ya, na ọtụtụ ụmụ ndị ikom ya, nʼụzọ niile nke eze si nye ya nsọpụrụ ma bulikwaa ya elu karịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na ndị ọrụ eze niile.
11 e gabou-se de sua grande riqueza e de seus muitos filhos. Vangloriou-se das honras que o rei lhe havia concedido e de como havia sido promovido acima de todos os outros nobres e oficiais.
12 Heman kwukwara sị, “Nke a abụghị dị okwu, ọ bụ naanị mụ ka Esta nwunye eze, kpọrọ ka m soro eze bịa nʼoriri nke ọ kwadooro. Echi ka ọ kpọrọ m ka m soro eze bịa.
12 Disse também: “Se isso não bastasse, a rainha Ester convidou somente o rei e a mim para um banquete que ela preparou! E ainda me convidou para outro banquete com ela e com o rei amanhã!”.
13 Ma ihe ndị a niile bụ ihe efu mgbe ọbụla m na-ahụ Mọdekai onye Juu ahụ ka ọ na-anọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze.”
13 Depois, acrescentou: “Nada disso, porém, me satisfará enquanto eu vir o judeu Mardoqueu sentado à porta do palácio”.
14 Mgbe ahụ, Zeresh nwunye ya na ndị enyi ya niile, dụrụ ya ọdụ sị ya, “Ihe ị ga-eme bụ nke a: Kwadoo osisi e ji akwụgbu mmadụ, nke ịdị elu ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Nʼụtụtụ echi, rịọ eze ka o nye gị ike ịkwụgbu Mọdekai nʼelu ya. Mgbe e mere nke a, ọṅụ gị ga-ezukwa oke, mgbe ị ga-esorokwa eze gaa rie oriri a kpọrọ unu.” Okwu a masịrị Heman nke ukwuu. O nyere iwu ka a kwadoo osisi ahụ ngwangwa.
14 Então Zeres, esposa de Hamã, e todos os amigos dele sugeriram: “Mande fazer uma forca de mais de vinte metros e, pela manhã, peça ao rei que Mardoqueu seja enforcado nela. Depois disso, você poderá ir alegremente ao banquete com o rei”. A sugestão agradou Hamã, e ele mandou fazer a forca.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Ester 5, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.