Esdras 10

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NAA

Sair da comparação
NAA Nova Almeida Atualizada 2017
1 Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu.
1 Enquanto Esdras orava e fazia confissão, chorando prostrado diante da Casa de Deus, uma enorme congregação de israelitas — homens, mulheres e crianças — se reuniu em volta dele. E o povo chorava amargamente.
2 Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel.
2 Então Secanias, filho de Jeiel, um dos filhos de Elão, tomou a palavra e disse a Esdras: — Nós temos transgredido contra o nosso Deus, casando com mulheres estrangeiras, que pertencem aos povos desta terra. Mas, quanto a isto, ainda há esperança para Israel.
3 Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị.
3 Façamos agora uma aliança com o nosso Deus, de que despediremos todas essas mulheres e os seus filhos, segundo o conselho do meu senhor e dos que tremem diante do mandamento do nosso Deus. Que se faça segundo a Lei.
4 Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”
4 Levante-se, pois isto é incumbência sua, e nós o apoiaremos. Seja forte e mãos à obra!
5 Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya.
5 Então Esdras se levantou e fez com que os principais sacerdotes, os levitas e todo o Israel jurassem que fariam segundo esta palavra. E eles juraram.
6 Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.
6 Esdras se retirou de onde estava, diante da Casa de Deus, e foi para a câmara de Joanã, filho de Eliasibe. Ao entrar ali, não comeu pão nem bebeu água, porque pranteava por causa da infidelidade dos que tinham voltado do exílio.
7 E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.
7 Depois anunciaram em Judá e Jerusalém que todos os que tinham voltado do exílio deviam se reunir em Jerusalém
8 Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.
8 e que, se alguém, em três dias, não viesse, segundo o conselho dos chefes e dos anciãos, todos os seus bens seriam totalmente destruídos, e ele mesmo seria excluído da congregação dos que voltaram do exílio.
9 Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ.
9 Então todos os homens de Judá e Benjamim, em três dias, se reuniram em Jerusalém. No dia vinte do nono mês, todo o povo se assentou na praça da Casa de Deus, tremendo por causa daquele assunto e por causa da chuva intensa.
10 Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel.
10 Então o sacerdote Esdras se levantou e lhes disse: — Vocês foram infiéis, casando com mulheres estrangeiras, aumentando a culpa de Israel.
11 Ugbu a, sọpụrụnụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.”
11 Portanto, façam confissão ao Senhor , Deus dos seus pais, e façam o que lhe agrada. Separem-se dos povos desta terra e das mulheres estrangeiras.
12 Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
12 E toda a congregação respondeu em voz alta: — Que assim seja! Faremos segundo as suas palavras.
13 Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya.
13 Porém o povo é muito e, sendo a época das chuvas, não podemos ficar aqui do lado de fora. E isto não é coisa que se faça em um ou dois dias, pois somos muitos os que transgredimos neste assunto.
14 Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.”
14 Que os nossos chefes decidam por toda a congregação, e que todos os que em nossas cidades casaram com mulheres estrangeiras venham a eles num dia marcado, acompanhados dos anciãos e dos juízes de cada cidade, até que se afaste de nós o furor da ira do nosso Deus, por causa desta situação.
15 Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị.
15 Apenas Jônatas, filho de Asael, e Jazeías, filho de Ticvá, se opuseram a isso, apoiados por Mesulão e pelo levita Sabetai.
16 Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a.
16 Os que voltaram do exílio fizeram assim. Então o sacerdote Esdras escolheu nominalmente os chefes de famílias, segundo a casa de seus pais; e se sentaram no primeiro dia do décimo mês para examinar essa questão.
17 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ.
17 E, no primeiro dia do primeiro mês, concluíram o exame de todos os casos de homens que haviam casado com mulheres estrangeiras.
18 A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ.
18 Dentre os filhos dos sacerdotes, foram encontrados os seguintes que tinham casado com mulheres estrangeiras: dos filhos de Jesua, filho de Jozadaque, e de seus irmãos: Maaseias, Eliézer, Jaribe e Gedalias.
19 Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma.
19 Com um aperto de mão, prometeram mandar embora as suas mulheres e, por serem culpados, ofereceram um carneiro do rebanho pela sua culpa.
20 Ndị si nʼikwu Imea bụ
20 Dos filhos de Imer: Hanani e Zebadias.
21 Ikwu Harim:
21 Dos filhos de Harim: Maaseias, Elias, Semaías, Jeiel e Uzias.
22 Ndị si nʼikwu Pashua:
22 Dos filhos de Pasur: Elioenai, Maaseias, Ismael, Natanael, Jozabade e Elasa.
23 Nʼime ndị Livayị:
23 Dos levitas: Jozabade e Simei, Quelaías, também chamado de Quelita, Petaías, Judá e Eliézer.
24 Nʼime ndị na-abụ abụ,
24 Dos cantores: Eliasibe; dos porteiros: Salum, Telém e Uri.
25 Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ:
25 E de Israel, dos filhos de Parós: Ramias, Jezias, Malquias, Miamim, Eleazar, Malquias e Benaia.
26 Site nʼikwu Elam:
26 Dos filhos de Elão: Matanias, Zacarias, Jeiel, Abdi, Jerimote e Elias.
27 Site nʼikwu Zatu:
27 Dos filhos de Zatu: Elioenai, Eliasibe, Matanias, Jerimote, Zabade e Aziza.
28 Site nʼikwu Bebai:
28 Dos filhos de Bebai: Joanã, Hananias, Zabai e Atlai.
29 Site nʼikwu Bani,
29 Dos filhos de Bani: Mesulão, Maluque, Adaías, Jasube, Seal e Jerimote.
30 Site nʼikwu Pahat-Moab,
30 Dos filhos de Paate-Moabe: Adna, Quelal, Benaia, Maaseias, Matanias, Bezalel, Binui e Manassés.
31 Site nʼikwu Harim:
31 Dos filhos de Harim: Eliézer, Issias, Malquias, Semaías, Simeão,
32 Benjamin, Maluk na Shemaraya.
32 Benjamim, Maluque e Semarias.
33 Site nʼikwu Hashum,
33 Dos filhos de Hasum: Matenai, Matatá, Zabade, Elifelete, Jeremai, Manassés e Simei.
34 Site nʼikwu Bani,
34 Dos filhos de Bani: Maadai, Anrão, Uel,
35 Benaya, Bedeia, Keluhi
35 Benaia, Bedias, Queluí,
36 Venaya, Meremot, Eliashib
36 Vanias, Meremote, Eliasibe,
37 Matanaya, Matenai na Jaasu.
37 Matanias, Matenai, Jaasai,
38 Site nʼikwu Bani:
38 Bani, Binui, Simei,
39 Shelemaya, Netan, Adaya,
39 Selemias, Natã, Adaías,
40 Maknadebai, Shashai, Sharai,
40 Macnadbai, Sasai, Sarai,
41 Azarel, Shelemaya, Shemaraya,
41 Azarel, Selemias, Semarias,
42 Shalum, Amaraya na Josef.
42 Salum, Amarias e José.
43 Site nʼikwu Nebo:
43 Dos filhos de Nebo: Jeiel, Matitias, Zabade, Zebina, Jadai, Joel e Benaia.
44 Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.
44 Todos estes tinham casado com mulheres estrangeiras, e alguns deles tinham filhos destas mulheres.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Esdras 10, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.