Deuteronômio 28
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVT
1 Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu.
1 “Se vocês obedecerem em tudo ao S enhor , seu Deus, e cumprirem fielmente todos estes mandamentos que hoje lhes dou, o S enhor , seu Deus, os colocará muito acima de todas as nações da terra.
2 Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere Onyenwe anyị Chineke gị isi.
2 Se obedecerem ao S enhor , seu Deus, vocês receberão as seguintes bênçãos:
3 Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi.
3 Suas cidades e seus campos serão abençoados.
4 Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị.
4 Seus filhos e suas colheitas serão abençoados. As crias de seu gado e de seus rebanhos serão abençoadas.
5 Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.
5 Seus cestos de frutos e tigelas de amassar pão serão abençoados.
6 Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ.
6 A todo lugar que forem e em tudo que fizerem, serão abençoados.
7 Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga.
7 “O S enhor derrotará seus inimigos quando eles os atacarem. Eles virão contra vocês de uma direção, mas serão dispersados em sete direções.
8 Onyenwe anyị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị.
8 “O S enhor lhes garantirá bênção em tudo que fizerem e encherá seus celeiros de cereais. O S enhor , seu Deus, os abençoará na terra que ele lhes dá.
9 Onyenwe anyị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile.
9 “Se obedecerem aos mandamentos do S enhor , seu Deus, e andarem em seus caminhos, o S enhor os constituirá como seu povo santo, conforme prometeu sob juramento.
10 Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha Onyenwe anyị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu.
10 Assim, todas as nações da terra verão que vocês são um povo que o S enhor tomou para si e os temerão.
11 Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị.
11 “O S enhor lhes dará prosperidade na terra que ele jurou a seus antepassados que daria a vocês, e os abençoará com muitos filhos, rebanhos numerosos e colheitas fartas.
12 Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.
12 No tempo certo, o S enhor enviará chuvas de seu rico tesouro no céu e abençoará todo o trabalho que realizarem. Vocês emprestarão a muitas nações, mas jamais precisarão tomar emprestado delas.
13 Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru.
13 Se derem ouvidos a estes mandamentos que hoje lhes dou e se os cumprirem fielmente, o S enhor os fará cabeça, e não cauda, e vocês estarão sempre por cima, e nunca por baixo.
14 Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.
14 Não se desviem, por menos que seja, de nenhum dos mandamentos que hoje lhes dou, e não sigam outros deuses nem os adorem.”
15 Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị.
15 “Mas, se vocês se recusarem a dar ouvidos ao S enhor , seu Deus, e não cumprirem todos os mandamentos e decretos que hoje lhes dou, as seguintes maldições cairão sobre vocês e os atingirão:
16 Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi,
16 Suas cidades e seus campos serão amaldiçoados.
17 Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ.
17 Seus cestos de frutos e suas tigelas de amassar pão serão amaldiçoados.
18 Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.
18 Seus filhos e suas colheitas serão amaldiçoados. As crias de seu gado e de seus rebanhos serão amaldiçoadas.
19 Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ.
19 A todo lugar que forem e em tudo que fizerem, serão amaldiçoados.
20 Onyenwe anyị ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m.
20 “O próprio S enhor enviará maldições, confusão e frustração em tudo que fizerem, até que, por fim, vocês sejam completamente destruídos por terem praticado o mal e me abandonado.
21 Onyenwe anyị ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta.
21 O S enhor os afligirá com pragas, até fazê-los desaparecer da terra em que estão prestes a entrar para tomar posse.
22 Onyenwe anyị ga-eti unu ọrịa na-eripịa eripịa, ahụ ọkụ na ọrịa na-aza anụ ahụ, oke okpomọkụ na mma agha, ụkọ mmiri ozuzo na ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu ga-abịakwasị gị tutu ruo mgbe i lara nʼiyi.
22 O S enhor os ferirá com doenças debilitantes, com febres e inflamações, com calor ardente e secas, com ferrugem e mofo. Essas calamidades os perseguirão até que vocês morram.
23 Mbara eluigwe nke ị na-ahụ anya ga-aghọ bronz, ala ị na-azọkwasị ụkwụ gị ga-aghọ igwe.
23 O céu sobre sua cabeça será tão duro quanto o bronze, e a terra debaixo de vocês será tão impenetrável quanto o ferro.
24 Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi.
24 O S enhor transformará em pó a chuva que rega sua terra, e cinzas cairão do céu até que vocês sejam destruídos.
25 Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị.
25 “O S enhor fará seus inimigos os derrotarem. Vocês os atacarão de uma direção, mas serão dispersados em sete direções. Serão motivo de horror para todos os reinos da terra.
26 Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
26 Seus cadáveres serão alimento para as aves do céu e para os animais selvagens, e não haverá ninguém para enxotá-los.
27 Onyenwe anyị ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha.
27 “O S enhor os afligirá com as feridas purulentas do Egito e com tumores, sarna e coceira incuráveis.
28 Onyenwe anyị ga-ezitere gị isi mgbaka, na ikpu ìsì, na ọgbaaghara nke obi.
28 O S enhor os castigará com loucura, cegueira e pânico.
29 Ị ga-asọgharị isi nʼetiti ehihie dịka onye kpuru ìsì nʼasọgharị nʼọchịchịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla ga-agara gị nke ọma. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ị ga-abụ onye a na-emegbu emegbu, na onye a na-anapụ ihe ya nʼike oge niile, na-enweghị onye ga-anapụta gị.
29 Andarão tateando em plena luz do dia, como cegos na escuridão, mas não encontrarão o caminho. Serão oprimidos e roubados continuamente, e ninguém virá para socorrê-los.
30 Gị na nwanyị ga-enwe nkwekọrịta ịlụ di na nwunye, ma nwoke ọzọ ga-eduru ya dinaa ya nʼike. Ị ga-ewu ụlọ ma ị gaghị ebi nʼime ya. Ị ga-akụ ubi vaịnị ma ị gaghị eri mkpụrụ si na ya.
30 “Você ficará noivo de uma mulher, mas outro homem dormirá com ela. Construirá uma casa, mas outra pessoa morará nela. Plantará um vinhedo, mas não aproveitará seus frutos.
31 Nʼihu anya gị ka a ga-egbu ehi gị, ma ị gaghị ata iberibe anụ ya. A ga-anapụ gị ịnyịnya ibu gị nʼihu anya gị ma a gaghị eweghachiri gị ya. Atụrụ gị ka a ga-enye ndị iro gị. Ọ dịkwaghị onye ga-anapụta ha.
31 Seu boi será abatido diante de seus olhos, mas você não provará um pedaço sequer da carne. Seu jumento lhe será tomado e não será devolvido. Suas ovelhas serão entregues a seus inimigos, e não haverá quem o ajude.
32 A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka.
32 Você verá seus filhos e filhas serem levados embora como escravos. Sentirá intensa saudade deles, mas nada poderá fazer.
33 Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile.
33 Uma nação estrangeira desconhecida consumirá as colheitas que vocês trabalharam arduamente para produzir. Vocês sofrerão opressão constante e serão tratados com crueldade.
34 Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka.
34 Quando virem as tragédias ao seu redor, acabarão enlouquecendo.
35 Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị.
35 O S enhor lhes cobrirá os joelhos e as pernas com feridas incuráveis. Terão feridas da cabeça aos pés.
36 Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ.
36 “O S enhor enviará vocês e seu rei para o exílio numa nação que vocês e seus antepassados não conheceram. Ali, adorarão deuses de madeira e de pedra!
37 Ị ga-abụ ihe iju anya, na ihe e ji atụ ilu, na ihe akụkọ, nʼetiti mba ahụ niile Onyenwe anyị ga-achụga gị.
37 Serão motivo de horror, de ridículo e de zombaria entre as nações para as quais o S enhor os enviar.
38 Ị ga-akụ ọtụtụ mkpụrụ nʼubi ma ị ga-aghọta ntakịrị mkpụrụ, nʼihi na igurube ga-ericha ihe ị kụrụ nʼubi.
38 “Semearão muito, mas colherão pouco, pois os gafanhotos devorarão suas plantações.
39 Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha.
39 Plantarão vinhedos e cuidarão deles, mas não beberão o vinho nem comerão as uvas, pois vermes devorarão as videiras.
40 Osisi oliv ga na-eto ebe niile, ma mmanụ oliv agaghị adị nke ị ga-ete nʼahụ nʼihi na mkpụrụ oliv ga-adasịsị na-akaghị aka oge ha mara ifuru.
40 Cultivarão oliveiras em todo o seu território, mas nunca usarão azeite, pois os frutos cairão antes de amadurecer.
41 Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha.
41 Terão filhos e filhas, mas os perderão, pois eles serão levados para o cativeiro.
42 Igwe igurube ga-erichasị osisi niile dị nʼubi gị, ya na ihe ị kụrụ nʼubi gị.
42 Enxames de insetos destruirão suas árvores e suas plantações.
43 Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ.
43 “Os estrangeiros que vivem entre vocês se tornarão cada vez mais fortes, enquanto vocês se tornarão cada vez mais fracos.
44 Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ.
44 Eles lhes emprestarão dinheiro, mas vocês não emprestarão a eles. Eles serão a cabeça, e vocês serão a cauda!
45 Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị.
45 “Se vocês se recusarem a dar ouvidos ao S enhor , seu Deus, e a obedecer aos mandamentos e decretos que ele lhes deu, todas estas maldições os perseguirão e os alcançarão até que sejam destruídos.
46 Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi.
46 Estes horrores servirão de sinal e advertência para vocês e seus descendentes para sempre.
47 Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma.
47 Se não servirem ao S enhor , seu Deus, com alegria e entusiasmo pelos muitos benefícios que receberam,
48 Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi.
48 servirão aos inimigos que o S enhor enviará contra vocês. Ficarão famintos, sedentos, despidos e desprovidos de tudo. O S enhor porá um jugo de ferro sobre seu pescoço e os oprimirá severamente até que os tenha destruído.
49 Onyenwe anyị ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha,
49 “Dos confins da terra, o S enhor trará contra vocês uma nação distante que se lançará sobre vocês como um abutre. Será uma nação cuja língua vocês não compreendem,
50 Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị.
50 povo feroz e cruel, que não tem respeito pelos idosos nem pena dos jovens.
51 Ha ga-erichapụ mkpụrụ nke anụ ụlọ gị niile na mkpụrụ nke ihe ubi gị niile tutu ruo mgbe ị ghọrọ ihe e bibiri ebibi. O nwekwaghị ihe ga-afọdụrụ gị, maọbụ ọka, maọbụ mmanya ọhụrụ maọbụ mmanụ oliv, maọbụ ụmụ ehi maọbụ ewu na atụrụ gị mụrụ, ruo mgbe e mere ka ị laa nʼiyi.
51 Os exércitos deles devorarão seus animais e colheitas, e vocês serão destruídos. Não deixarão coisa alguma dos seus cereais, nem vinho novo, azeite, bezerros ou cordeiros, e vocês morrerão de fome.
52 Mba ahụ ga-anọchigide obodo ndị ahụ niile dị nʼala gị tutu ruo mgbe mgbidi ndị ahụ niile e wusiri ike, nke ị na-atụkwasị obi dara. Ọ ga-anọchigide ndị ahụ niile dị nʼala ahụ niile Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
52 Atacarão suas cidades até derrubarem todos os muros fortificados de sua terra, as muralhas nas quais vocês confiavam como proteção. Atacarão todas as cidades da terra que o S enhor , seu Deus, lhes dá.
53 Ị ga-erikwa anụ ahụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom ndị Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼihi oke nnọchigide nke ndị agha nọchigidere gị na nʼihi oke mkpagbu nke ndị iro.
53 “O cerco e a grande aflição que o ataque inimigo causará serão tão terríveis que vocês comerão a carne de seus próprios filhos e filhas, que o S enhor , seu Deus, lhes deu.
54 Ọ bụladị nwoke ahụ dịkasịrịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu ga-aghọ onye afọ tara mmiri nke ukwuu megide nwanne ya nwoke, maọbụ nwunye nke ọ hụrụ nʼanya, maọbụ ụmụ ya, ndị ka dị ndụ.
54 Até o homem de coração mais gentil em seu meio não terá pena do próprio irmão, da esposa amada e dos filhos que sobreviverem.
55 Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere.
55 Ele se recusará a dividir com eles a carne que estiver devorando, a carne de um dos próprios filhos, pois não sobrará outra coisa para ele comer durante o cerco e a grande aflição que o inimigo trará sobre todas as suas cidades.
56 Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị,
56 A mulher de coração mais gentil entre vocês, tão delicada que nem sequer tocaria o chão com o pé, será mesquinha com o marido a quem ama e com o próprio filho ou filha.
57 ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile.
57 Esconderá deles a placenta e o bebê recém-nascido que ela deu à luz para comê-los sozinha em segredo. Não terá outra coisa para comer durante o cerco e a grande aflição que o inimigo trará sobre todas as suas cidades.
58 Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
58 “Se vocês se recusarem a obedecer a todos os termos desta lei escritos neste livro e se não temerem o nome glorioso e terrível do S enhor , seu Deus,
59 Onyenwe anyị ga-ezitere gị na ụmụ ụmụ gị ihe otiti dị oke egwu, oke mbibi nke ga-adị ogologo oge, na ọrịa dị oke njọ nke na-adịghị ala ala.
59 o S enhor oprimirá vocês e seus filhos com pragas indescritíveis. Serão pragas intensas e sem alívio, doenças agonizantes e insuportáveis.
60 Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ.
60 Ele os afligirá com todas as doenças do Egito, que vocês temiam tanto, e não terão alívio.
61 Ọ bụghị naanị nke a! Onyenwe anyị ga-eme ka ụdị ọrịa ọbụla, na ụdị ihe otiti ọbụla, ọ bụladị ndị na-adịghị nʼime Akwụkwọ Iwu a, bịakwasị gị, tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị.
61 O S enhor os afligirá com todas as enfermidades e pragas que existem, mesmo aquelas que não são mencionadas neste Livro da Lei, até que sejam destruídos.
62 Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke eluigwe, maọbụ naanị mmadụ ole na ole nʼime gị ga-afọdụ. Ihe ndị a niile ga-emezu nʼihi na i geghị ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke gị.
62 Ainda que se tornem tão numerosos quanto as estrelas do céu, poucos restarão, pois não deram ouvidos ao S enhor , seu Deus.
63 Dịka mmụba ị mụbara nʼọnụọgụgụ, na ịdị ukwuu nke akụnụba gị si bụrụ ihe nyere Onyenwe anyị obi ụtọ, otu a ka ọ ga-esi tọkwaa ya ụtọ ibibi gị, na ime ka ị daa ụkpa. Ọ ga-esi nʼala ahụ ị na-aga inweta hopu gị.
63 “Assim como o S enhor teve grande prazer em fazê-los prosperar e se multiplicar, também terá prazer em destruí-los. Vocês serão arrancados da terra em que estão prestes a entrar para tomar posse.
64 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ị gbasasịa nʼetiti mba niile, site nʼotu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ nke ọzọ. Nʼebe ahụ, ị ga-efekwa chi ndị ọzọ, nke gị, maọbụ nna nna gị ha, na-amaghị, chi e ji osisi na nkume kpụọ.
64 O S enhor os espalhará entre todas as nações, de uma extremidade à outra do mundo. Ali, adorarão deuses estrangeiros que nem vocês nem seus antepassados conheceram, deuses de madeira e pedra.
65 Nʼetiti mba ndị a, obi agaghị eru gị ala, ọbụ ụkwụ gị agaghị enwe ebe izuike. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị ga-enye gị mkpụrụobi na-ama jijiji, anya nke ike gwụrụ nʼihi enweghị olileanya, na obi na-ada mba.
65 Não encontrarão paz nem lugar de descanso entre essas nações. O S enhor fará seu coração estremecer, sua vista falhar e sua alma desanimar.
66 Ndụ gị ga-ekonye nʼelu nʼihi oke egwu. Ị ga-anọ nʼegwu, ehihie na abalị, ị gaghị ejikwa ndụ gị nʼaka.
66 Sua vida estará sempre por um fio. Passarão os dias e as noites com medo, sem ter certeza se sobreviverão.
67 Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ.
67 Pela manhã dirão: ‘Quem nos dera já fosse noite!’, e à noite: ‘Quem nos dera já fosse dia!’. Pois se encherão de pavor com os horrores que verão ao seu redor.
68 Onyenwe anyị ga-eme ka i soro ụgbọ mmiri lọghachi nʼIjipt, nʼije ahụ m kwuru na ị gaghị ejekwa ọzọ. Nʼebe ahụ ị ga-ewere onwe gị resi ndị iro gị dịka ohu ndị ikom maọbụ ndị inyom, ma ọ dịghị onye ga-achọ ịzụ gị.
68 Então o S enhor os mandará em navios de volta para o Egito, o lugar que eu prometi que nunca mais veriam. Lá, tentarão vender a si mesmos como escravos para seus inimigos, mas ninguém os comprará”.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Deuteronômio 28, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.