Deuteronômio 27

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa.
1 Moisés e os anciães de Israel deram ao povo a seguinte ordem: Observareis todos os mandamentos que hoje vos prescrevo.
2 Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
2 Quando tiverdes passado o Jordão e entrado na terra que te dá o Senhor, teu Deus, levantarás umas pedras grandes que revestirás de cal.
3 Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị.
3 Escreverás nelas o texto desta lei, depois que tiveres passado e entrado na terra que mana leite e mel, terra que te dá o Senhor, teu Deus, como prometeu a teus pais.
4 Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
4 Quando, pois, tiveres passado o Jordão, levantareis essas pedras no monte Ebal, revestindo-as de cal, como hoje vos ordeno.
5 Wuokwara Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya.
5 Construir ás ali um altar de pedras ao Senhor, teu Deus, com pedras que o ferro não tenha tocado.
6 Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị.
6 Construirás, pois o altar do Senhor, teu Deus, com pedras brutas, e oferecerás nele holocaustos ao Senhor, teu Deus.
7 Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
7 Oferecerás também sacrifícios pacífico s dos quais comerás no mesmo lugar, alegrando-te diante do Senhor, teu Deus.
8 Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”
8 Escreverás nas pedras o texto completo desta lei, em caracteres distintos e claros.
9 Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu.
9 Moisés e os sacerdotes levíticos dirigiram então a palavra a todo o Israel nestes termos: Guarda silêncio, e ouve, ó Israel! Hoje te tornaste o povo do Senhor, teu Deus.
10 Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”
10 Obedece, pois, à sua voz e guarda os seus mandamentos e suas leis que hoje te prescrevo.
11 Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,
11 No mesmo dia, Moisés ordenou ao povo o seguinte:
12 Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel
12 Quando tiverdes passado o Jordão, estarão sobre o monte Garizim para abençoar o povo: Simeão, Levi, Judá, Issacar, José e Benjamim;
13 Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
13 e sobre o monte Ebal, para amaldiçoar: Rubem, Gad, Aser, Zabulon, Dá e Neftali.
14 Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,
14 E os levitas tomarão a palavra e dirão em alta voz a todos os homens de Israel:
15 “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.”
15 Maldito o homem que fabrica ídolo de madeira ou metal {abominação para o Senhor, obra de mãos de artesão}, e o erige mesmo que seja em lugar escondido! E todo o povo responderá: Amém!
16 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.”
16 Maldito o que despreza o pai e a mãe! E todo o povo dirá: Amém!
17 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.”
17 Maldito o que desloca o marco do vizinho! E todo o povo dirá: Amém!
18 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.”
18 Maldito o que desvia o cego do caminho! E todo o povo dirá: Amém!
19 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.”
19 Maldito o que viola o direito do estrangeiro, do órfão e da viúva! E todo o povo dirá: Amém!
20 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.”
20 Maldito o que se deita com a mulher de seu pai, porque levanta a coberta do leito paterno! E todo o povo dirá: Amém!
21 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.”
21 Maldito o que peca com um animal qualquer! E todo o povo dirá: Amém!
22 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.”
22 Maldito o que se deita com sua irmã, filha de seu pai ou de sua mãe! E todo o povo dirá: Amém!
23 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.”
23 Maldito o que se deita com a sua sogra! E todo o povo dirá: Amém!
24 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.”
24 Maldito o que se oculta para matar o próximo! E todo o povo dirá: Amém!
25 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
25 Maldito o que aceita gratificação para levar à morte o inocente! E todo o povo dirá: Amém!
26 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.”
26 Maldito o que não conserva as palavras desta lei e não a cumpre! E todo o povo dirá: Amém!

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Deuteronômio 27, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.