Colossenses 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs BKJ

Sair da comparação
1 Unu ndị nwe odibo, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na ikpe ziri ezi na-emeso ndị ohu unu omume, ebe unu maara na unu onwe unu nwere onyenwe unu nʼeluigwe.
1 Senhores, a vossos servos fazei o que for de justiça e equidade, sabendo que também tendes um Senhor no céu.
2 Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele.
2 Perseverai em oração, velando nela com ação de graças;
3 Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ,
3 orando também juntamente por nós, para que Deus nos abra a porta da palavra, a fim de falarmos do mistério de Cristo, pelo qual estou também preso;
4 ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri.
4 que eu possa manifestar isso, como eu devo falar.
5 Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma.
5 Andai com sabedoria para com os que estão de fora, remindo o tempo.
6 Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
6 A vossa palavra seja sempre com graça, temperada com sal, para que saibais como vos convém responder a cada homem.
7 Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m.
7 Todo o meu estado, Tíquico vos fará saber; irmão amado, e fiel ministro, e conservo no Senhor;
8 Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume.
8 o qual vos enviei para o mesmo propósito, para que saiba do vosso estado e console os vossos corações.
9 Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a.
9 Juntamente com Onésimo, amado e fiel irmão, que é um de vós; eles vos farão saber todas as coisas que por aqui se passam.
10 Arịstakọs, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. (Onye unu natara ihe ntụziaka banyere ya, ọ bụrụ na ọ bịarute nʼebe unu nọ, unu nabata ya nke ọma.)
10 Aristarco, que está preso comigo, vos saúda, e Marcos, o sobrinho de Barnabé (acerca do qual já recebestes mandamentos; se ele for ter convosco, recebei-o);
11 Jisọs, onye a na-akpọkwa Jọstus, na-ekelekwa unu. Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị Juu mụ na ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nʼebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ.
11 e Jesus, chamado Justo, os quais são da circuncisão; são estes unicamente os meus cooperadores no reino de Deus e para mim têm sido consolação.
12 Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nʼime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge niile ka ọ na-ekpe ekpere nʼihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike bụrụ ndị tozuru etozu na ndị kwesiri ike nʼọchịchọ niile nke Chineke.
12 Epafras, que é um de vós, servo de Cristo, vos saúda, sempre trabalhando ardentemente por vós em orações, para que vos conserveis firmes, perfeitos e completos em toda a vontade de Deus.
13 Ana m agbara ya akaebe na ọ rụsịrị ọrụ ike nʼihi unu na nʼihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis.
13 Porquanto, eu dou testemunho de que ele tem grande zelo por vós, e pelos que estão em Laodiceia, e pelos que estão em Hierápolis.
14 Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu.
14 Lucas, o médico amado, e Demas, saúdam-vos.
15 Keleerenụ m ụmụnna anyị bi na Laodisia na nwanna anyị Nimfas na chọọchị na-ezukọ nʼụlọ ya.
15 Saudai aos irmãos que estão em Laodiceia, e a Ninfa, e à igreja que está em sua casa.
16 Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na Laodisia. Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na Laodisia bịa.
16 E, quando esta carta tiver sido lida entre vós, que seja lida também na igreja de Laodiceia; e também leia a carta de Laodiceia.
17 Gwanụ Akipos ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ Onyenwe anyị nyere ya ịrụ.
17 E dizei a Arquipo: Atenta para o ministério que recebeste no Senhor, para que o cumpras.
18 Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.
18 Saudação de minha mão, de Paulo. Lembrai-vos das minhas prisões. A graça seja convosco. Amém.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Colossenses 4, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.