Apocalipse 14

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha.
1 Eu vi ainda: o Cordeiro estava de pé no monte Sião, e perto dele cento e quarenta e quatro mil pessoas que traziam escritos na fronte o nome dele e o nome de seu Pai.
2 Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
2 Ouvia, entretanto, um coro celeste semelhante ao ruído de muitas águas e ao ribombar de potente trovão. Esse coro que eu ouvia era ainda semelhante a músicos tocando as suas cítaras.
3 Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.
3 Cantavam como que um cântico novo diante do trono, diante dos quatro Animais e dos Anciãos. Ninguém podia aprender este cântico, a não ser aqueles cento e quarenta e quatro mil que foram resgatados da terra.
4 Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.
4 Estes são os que não se contaminaram com mulheres, pois são virgens. São eles que acompanham o Cordeiro por onde quer que vá; foram resgatados dentre os homens, como primícias oferecidas a Deus e ao Cordeiro.
5 Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
5 Em sua boca não se achou mentira, pois são irrepreensíveis.
6 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa.
6 Vi, então, outro anjo que voava pelo meio do céu, tendo um evangelho eterno para anunciar aos habitantes da terra e a toda nação, tribo, língua e povo.
7 O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
7 Clamava em alta voz: Temei a Deus, e dai-lhe glória, porque é chegada a hora do seu julgamento. Adorai aquele que fez o céu e a terra, o mar e as fontes.
8 Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”
8 Outro anjo seguiu-o, dizendo: Caiu, caiu a grande Babilônia, por ter dado de beber a todas as nações do vinho de sua imundície desenfreada.
9 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya,
9 Um terceiro anjo seguiu-os, dizendo em alta voz: Se alguém adorar a Fera e a sua imagem, e aceitar o seu sinal na fronte ou na mão,
10 ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.
10 há de beber também o vinho da cólera divina, o vinho puro deitado no cálice da sua ira. Será atormentado pelo fogo e pelo enxofre diante dos seus santos anjos e do Cordeiro.
11 Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya.
11 A fumaça do seu tormento subirá pelos séculos dos séculos. Não terão descanso algum, dia e noite, esses que adoram a Fera e a sua imagem, e todo aquele que acaso tenha recebido o sinal do seu nome.
12 Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”
12 Eis o momento para apelar para a paciência dos santos, dos fiéis, aos mandamentos de Deus e à fé em Jesus.
13 Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.”
13 Eu ouvi uma voz do céu, que dizia: Escreve: Felizes os mortos que doravante morrem no Senhor. Sim, diz o Espírito, descansem dos seus trabalhos, pois as suas obras os seguem.
14 Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.
14 Eu vi ainda uma nuvem branca, sobre a qual se sentava como que um Filho do Homem, com a cabeça cingida de coroa de ouro e na mão uma foice afiada.
15 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.”
15 Outro anjo saiu do templo, gritando em voz alta para aquele que estava assentado na nuvem: Lança a tua foice e ceifa, porque é chegada a hora de ceifar, pois está madura a seara da terra.
16 Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.
16 O Ser que estava assentado na nuvem lançou então a foice à terra, e a terra foi ceifada.
17 Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.
17 Outro anjo saiu do templo do céu. Tinha também uma foice afiada.
18 Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.”
18 E outro anjo, aquele que tem poder sobre o fogo, saiu do altar e bradou em alta voz para aquele que tinha a foice afiada: Lança a foice afiada e vindima os cachos da vinha da terra, porque maduras estão as suas uvas.
19 Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.
19 O anjo lançou a sua foice à terra e vindimou a vinha da terra, e atirou os cachos no grande lagar da ira de Deus.
20 A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.
20 O lagar foi pisado fora da cidade, e do lagar saiu sangue que atingiu até o nível dos freios dos cavalos pelo espaço de mil e seiscentos estádios.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Apocalipse 14, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.