Apocalipse 13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 Agwọ ochie ahụ guzoro nʼakụkụ nʼọnụ oke osimiri ahụ. Ma ahụrụ m otu anụ ọhịa ka o si nʼime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhịa a nwere isi asaa na mpi iri. Okpueze iri dịkwa nʼelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nʼisi asaa ahụ nʼotu nʼotu bụ ikwutọ na ikwuhie Chineke.
1 Vi, então, levantar-se do mar uma Fera que tinha dez chifres e sete cabeças; sobre os chifres, dez diademas; e nas suas cabeças, nomes blasfematórios.
2 Anụ ọhịa a m hụrụ dị ka agụ, ma ụkwụ ya dịka ụkwụ anụ ọhịa bịa. Ọnụ ya dịkwa ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ya, na ocheeze ya na ikike dị ukwuu.
2 A Fera que eu vi era semelhante a uma pantera: os pés como de urso, e as fauces como de leão. Deu-lhe o Dragão o seu poder, o seu trono e grande autoridade.
3 Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya.
3 Uma das suas cabeças estava como que ferida de morte, mas essa ferida de morte fora curada. E todos, pasmados de admiração, seguiram a Fera
4 Ha kpọrọ isiala nye agwọ ochie ahụ nʼihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya, onye pụkwara ibu agha megide ya?”
4 e prostraram-se diante do Dragão, porque dera seu prestígio à Fera, e prostraram-se igualmente diante da Fera, dizendo: Quem é semelhante à Fera e quem poderá lutar com ela?
5 E nyekwara anụ ọhịa ahụ ọnụ na ike ikwu okwu mpako na ikike ikwulu ekwulu ọnwa iri anọ na abụọ.
5 Foi-lhe dada a faculdade de proferir arrogâncias e blasfêmias, e foi-lhe dado o poder de agir por quarenta e dois meses.
6 O meghere ọnụ ya malite ikwulu Chineke, na aha ya na ebe obibi ya, na ndụ ahụ bụ ndị bi nʼeluigwe.
6 Abriu, pois, a boca em blasfêmias contra Deus, para blasfemar o seu nome, o seu tabernáculo e os habitantes do céu.
7 E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile.
7 Foi-lhe dado, também, fazer guerra aos santos e vencê-los. Recebeu autoridade sobre toda tribo, povo, língua e nação,
8 Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa.
8 e hão de adorá-la todos os habitantes da terra, cujos nomes não estão escritos desde a origem do mundo no livro da vida do Cordeiro imolado.
9 Onye nwere ntị ya nụrụ.
9 Quem tiver ouvidos, ouça!
10 “Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha,
10 Quem procura prender será preso. Quem matar pela espada, pela espada deve ser morto. Esta é a ocasião para a constância e a confiança dos santos!
11 Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ.
11 Vi, então, outra Fera subir da terra. Tinha dois chifres como um cordeiro, mas falava como um dragão.
12 Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ.
12 Ela exercia todo o poder da primeira Fera, sob a vigilância desta, e fez com que a terra e os seus habitantes adorassem a primeira Fera {cuja ferida de morte havia sido curada}.
13 Ọ na-emekwa ọtụtụ oke ihe ịrịbama dị iche iche. O mere ọbụladị ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nʼụwa nʼihu mmadụ niile.
13 Realizou grandes prodígios, de modo que até fez descer fogo do céu sobre a terra, à vista dos homens.
14 O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ.
14 Seduziu os habitantes da terra com os prodígios que lhe era dado fazer sob a vigilância da Fera, persuadindo-os a fazer uma imagem da Fera que sobrevivera ao golpe da espada.
15 E nyere ya ike ikunye ume ndụ nʼime oyiyi nke anụ ọhịa mbụ ahụ, ime ka ihe a kpụrụ akpụ kwuo okwu mekwa ka e gbuo ndị niile na-akpọghị isiala nye ya.
15 Foi-lhe dado, também, comunicar espírito à imagem da Fera, de modo que essa imagem se pusesse a falar e fizesse com que fosse morto todo aquele que não se prostrasse diante dela.
16 O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha.
16 Conseguiu que todos, pequenos e grandes, ricos e pobres, livres e escravos, tivessem um sinal na mão direita e na fronte,
17 Ya mere, ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịzụ ahịa maọbụ ree ahịa ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhịa ahụ, maọbụ ihe e ji mara ya, maọbụ ọnụọgụgụ nọchiri aha ya.
17 e que ninguém pudesse comprar ou vender, se não fosse marcado com o nome da Fera, ou o número do seu nome.
18 Nke a ka chọrọ amamihe maka ịghọta ya. Ka onye ọbụla nwere ọgụgụisi, gụọ ọnụọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ, nʼihi na ọ bụ ọnụọgụgụ mmadụ. Ọnụọgụgụ ahụ bụkwa narị isi na iri isi na isii, ya bụ 666.
18 Eis aqui a sabedoria! Quem tiver inteligência, calcule o número da Fera, porque é número de um homem, e esse número é seiscentos e sessenta e seis.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar Apocalipse 13, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.