2 Samuel 6
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH
1 Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi,
1 Mais uma vez Davi reuniu os melhores soldados de Israel, num total de trinta mil homens.
2 Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim.
2 Levou-os à cidade de Baalá, em Judá, para pegarem a arca da aliança , que tem o nome do Senhor Todo-Poderoso, que se assenta no seu trono, entre os querubins .
3 Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ,
3 Colocaram a arca num carro de bois, novo, e a tiraram da casa de Abinadabe, que ficava num monte. Uzá e Aiô, filhos de Abinadabe, guiavam o carro
4 nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ.
4 que carregava a arca. Aiô caminhava na frente.
5 Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu.
5 Davi e todos os israelitas dançavam e cantavam com todas as suas forças em louvor a Deus, o Senhor . Eles tocavam harpas , liras , tambores, castanholas e pratos.
6 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
6 Quando chegaram ao campo de descascar cereais que pertencia a Nacom, os bois tropeçaram. Então Uzá estendeu a mão e segurou a arca da aliança.
7 Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.
7 O Senhor Deus ficou irado com Uzá, por sua falta de respeito, e o matou. E Uzá morreu ali, ao lado da arca.
8 Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
8 Davi ficou furioso porque o Senhor , na sua ira, havia castigado Uzá; assim até hoje aquele lugar é chamado de Peres-Uzá .
9 Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?”
9 Então Davi ficou com medo de Deus, o Senhor , e disse: — E agora como é que poderei levar comigo a arca da aliança?
10 O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
10 Assim Davi resolveu não levar a arca para a sua cidade de Jerusalém; em vez disso, ele mudou de direção e a levou para a casa de Obede-Edom, que era da cidade de Gate.
11 Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.
11 A arca da aliança ficou ali três meses, e o Senhor abençoou Obede-Edom e a sua família.
12 Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid.
12 O rei Davi soube que, por causa da arca, o Senhor havia abençoado a família de Obede-Edom e tudo o que ele tinha. Então tirou a arca da casa de Obede-Edom e, com uma grande festa, a levou para a Cidade de Davi .
13 Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.
13 Depois que os homens que carregavam a arca deram seis passos, Davi ofereceu a Deus em sacrifício um touro e um bezerro gordo.
14 Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ,
14 Davi, vestindo um manto sacerdotal de linho, dançou com todo o entusiasmo em louvor a Deus, o Senhor .
15 mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
15 E assim ele e todos os israelitas levaram a arca da aliança para Jerusalém, com gritos de alegria e sons de trombetas.
16 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.
16 Quando a arca estava entrando na cidade, Mical, filha de Saul, olhou pela janela, viu o rei Davi pulando e dançando em louvor ao Senhor . Então sentiu por ele um profundo desprezo.
17 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Onyenwe anyị.
17 Levaram a arca e a colocaram no seu lugar, na barraca que Davi tinha preparado para ela. Então ele ofereceu a Deus, o Senhor , sacrifícios que foram completamente queimados e ofertas de paz.
18 Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
18 Quando acabou de oferecer os sacrifícios e as ofertas, Davi abençoou o povo em nome do Senhor Todo-Poderoso.
19 O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.
19 Depois deu a cada homem e a cada mulher de Israel um pão, um pedaço de carne assada e passas. Em seguida todos foram para casa.
20 Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”
20 Davi voltou para casa a fim de estar com a sua família, e Mical, filha de Saul, saiu para encontrá-lo. Ela disse: — Que bela figura fez hoje o rei de Israel! Parecia um sem-vergonha, mostrando o corpo para as empregadas dos seus funcionários!
21 Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị.
21 Davi respondeu: — Eu estava dançando em louvor ao
22 E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!”
22 e me humilharei ainda mais diante dele. Você pode pensar que eu não sou nada, mas aquelas moças de quem você falou vão me dar muito valor!
23 Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.
23 E Mical, filha de Saul, nunca teve filhos.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Samuel 6, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.