2 Samuel 24

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NAA

Sair da comparação
NAA Nova Almeida Atualizada 2017
1 Ọzọkwa, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel. Ọ kpaliri Devid imegide ha, sị, “Gaa gụọ Izrel na Juda ọnụ.”
1 Mais uma vez a ira do Senhor se acendeu contra os israelitas, e ele incitou Davi contra eles, dizendo: — Vá e levante o censo de Israel e de Judá.
2 Ya mere, eze gwara Joab na ndịisi ọchịagha ya ha so, “Jegharịa nʼebo niile nke Izrel, site na Dan ruo Bịasheba, gụkọtaa ndị tozuru ije agha nʼIzrel niile ka m nwee ike mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
2 O rei disse a Joabe, comandante do seu exército: — Percorra todas as tribos de Israel, desde Dã até Berseba, e levante o censo do povo, para que eu saiba o seu número.
3 Joab zaghachiri eze, “Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị, mee ka ndị agha mụbaa, otu onye narị ụzọ, otu onye narị ụzọ karịa. Ka anya onyenwe m, bụ eze, hụkwa ya. Ma nʼihi gịnị ka onyenwe m bụ eze ji chọọ ime ihe dị otu a?”
3 Então Joabe disse ao rei: — Que o
4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab na nke ndị ọchịagha ahụ. Ya mere, ha hapụrụ ihu eze pụọ ịgụ ndị agha Izrel ọnụ.
4 Porém a palavra do rei prevaleceu contra Joabe e contra os chefes do exército. Então eles saíram da presença do rei, para levantar o censo do povo de Israel.
5 Mgbe ha gabigachara Jọdan, ha manyere ụlọ ikwu ha na nso Aroea, nʼaka nri obodo ahụ dị nʼetiti ndagwurugwu Gad na-eru Jeza,
5 Passaram o Jordão e acamparam em Aroer, à direita da cidade que está no meio do vale de Gade, e foram a Jazer.
6 ha gara Gilead ruokwa nʼala Taatim Hodshi, bịarukwaa Dan Jaan, jee gburugburu jeruo Saịdọn.
6 Dali foram a Gileade e chegaram até Cades, na terra dos heteus. Seguiram a Dã-Jaã e viraram-se para Sidom.
7 Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv, na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda.
7 Chegaram à fortaleza de Tiro e a todas as cidades dos heveus e dos cananeus, de onde saíram para o Sul de Judá, a Berseba.
8 Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya.
8 Assim, percorreram toda a terra e, depois de nove meses e vinte dias, chegaram a Jerusalém.
9 Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise.
9 Joabe apresentou ao rei o resultado do recenseamento do povo: havia em Israel oitocentos mil homens de guerra, que puxavam da espada; e em Judá eram quinhentos mil.
10 Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị Onyenwe anyị, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, Onyenwe anyị biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”
10 Depois de haver recenseado o povo, Davi ficou com dor no coração. Ele disse ao Senhor : — Cometi um grande pecado ao fazer o que fiz. Mas agora, ó
11 Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu Onyenwe anyị eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị,
11 Quando Davi se levantou pela manhã, a palavra do Senhor veio ao profeta Gade, vidente de Davi, dizendo:
12 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ”
12 — Vá e diga a Davi: Assim diz o Senhor : “Eu lhe ofereço três opções; escolha uma delas, para que eu a execute contra você.”
13 Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
13 Gade foi falar com Davi e lhe comunicou isso, dizendo: — Você quer sete anos de fome na sua terra, três meses fugindo dos seus inimigos, que vão persegui-lo, ou três dias de peste na sua terra? Decida, agora, e diga que resposta devo dar ao que me enviou.
14 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ, nʼihi na obi ebere ya bara ụba.”
14 Então Davi disse a Gade: — Estou muito angustiado. Porém é preferível que caiamos nas mãos do
15 Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, site nʼụtụtụ ahụ ruo oge akara aka. Ọ bụ iri puku mmadụ asaa nwụrụ site na Dan ruo Bịasheba.
15 Então o Senhor enviou a peste a Israel, desde a manhã até o tempo que havia determinado. E, desde Dã até Berseba, morreram setenta mil homens do povo.
16 Mgbe mmụọ ozi ahụ setịpụrụ aka ya ibibi Jerusalem, o wutere Onyenwe anyị nʼihi oke mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-eweta nhụju anya nye ndị mmadụ, “O zuola. Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nọ nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.
16 Quando o Anjo do Senhor estendeu a mão sobre Jerusalém, para a destruir, o Senhor mudou de ideia quanto a este mal e disse ao Anjo que fazia a destruição entre o povo: — Basta! Retire a sua mão. O Anjo estava junto à eira de Araúna, o jebuseu.
17 Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị Onyenwe anyị, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”
17 Ao ver o Anjo que feria o povo, Davi falou ao Senhor e disse: — Eu é que pequei. Eu é que fiz essa perversidade. Mas estas ovelhas o que fizeram? Que a tua mão seja contra mim e contra a casa de meu pai.
18 Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.”
18 Naquele mesmo dia, Gade foi falar com Davi e lhe disse: — Vá e edifique um altar ao
19 Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad.
19 Davi foi segundo a palavra de Gade, como o Senhor lhe havia ordenado.
20 Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala.
20 Araúna viu, do alto, que o rei e os seus homens vinham ao seu encontro. Saiu e se inclinou diante do rei, com o rosto em terra.
21 Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?”
21 E perguntou: — Por que o rei, meu senhor, vem até este seu servo? Davi respondeu: — Para comprar de você esta eira, a fim de edificar nela um altar ao
22 Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu, ka ha bụrụ nkụ.
22 Então Araúna disse a Davi: — Que o rei, meu senhor, tome e ofereça o que bem quiser. Aqui estão os bois para o holocausto, o debulhador de cereais e a canga dos bois para a lenha.
23 Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka Onyenwe anyị Chineke gị nabatakwa gị.”
23 Tudo isto, ó rei, Araúna oferece ao rei. E acrescentou: — Que o
24 Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ Onyenwe anyị, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”
24 Porém o rei disse a Araúna: — Não! Eu vou comprar de você pelo que vale. Porque não oferecerei ao Assim, Davi comprou a eira e os bois por cinquenta moedas de prata.
25 Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ. Chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekpere o kpere nʼihi ala ahụ. Nrịa nrịa ahụ na-efe efe nke dakwasịrị Izrel kwụsịkwara.
25 Davi edificou ali um altar ao Senhor e apresentou holocaustos e ofertas pacíficas. Assim, o Senhor se tornou favorável para com a terra, e a praga cessou no meio de Israel.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Samuel 24, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.