2 Samuel 12
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NAA
1 Ya mere, Onyenwe anyị zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye.
1 O Senhor enviou Natã a Davi. Natã foi falar com Davi e lhe disse: — Havia numa cidade dois homens, um rico e outro pobre.
2 Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi.
2 O rico tinha ovelhas e gado em grande número,
3 Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya.
3 mas o pobre não tinha coisa nenhuma, a não ser uma cordeirinha que havia comprado. Ele a criou, e ela cresceu em sua casa, junto com os seus filhos. Comia da sua comida e bebia do seu copo. Dormia nos seus braços, e ele a tinha como filha.
4 “Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.”
4 Certo dia chegou um viajante à casa do homem rico, e este não quis pegar uma das suas ovelhas ou um dos seus bois para dar de comer ao visitante que havia chegado; em vez disso, pegou a cordeirinha do homem pobre e a preparou para o homem que havia chegado.
5 Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!
5 Então o furor de Davi se acendeu contra aquele homem, e ele disse a Natã: — Tão certo como vive o
6 Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.”
6 E pela cordeirinha restituirá quatro vezes, porque fez uma coisa dessas e porque não se compadeceu.
7 Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl.
7 Então Natã disse a Davi: — Esse homem é você. Assim diz o
8 Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu.
8 Eu lhe dei a casa de seu senhor e as mulheres de seu senhor em seus braços. Também lhe dei a casa de Israel e de Judá. E, se isto fosse pouco, eu teria acrescentado tais e tais coisas.
9 Gịnị mere i ji lelịa okwu Onyenwe anyị anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya.
9 Por que, então, você desprezou a palavra do Senhor , fazendo o que era mau aos olhos dele? Com a espada você matou Urias, o heteu. Você tomou por esposa a mulher dele, depois de o matar com a espada dos filhos de Amom.
10 Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’
10 Agora, pois, a espada jamais se afastará da sua casa, porque você me desprezou e tomou a mulher de Urias, o heteu, para ser sua mulher.”
11 “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile.
11 Assim diz o Senhor : “Eis que farei com que de sua própria casa venha o mal sobre você. Tomarei as suas mulheres à sua própria vista e as darei a outro homem, que se deitará com elas em plena luz do dia.
12 I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”
12 Porque você o fez em segredo, mas eu farei isso diante de todo o Israel e em plena luz do dia.”
13 Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide Onyenwe anyị.”
13 Então Davi disse a Natã: — Pequei contra o E Natã respondeu: — Também o
14 Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.”
14 Mas, porque com isto você deu motivo a que os inimigos do Senhor blasfemassem, também o filho que lhe nasceu morrerá.
15 Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa.
15 Então Natã foi para a sua casa. E o
16 Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.
16 Davi suplicou a Deus pela criança. Davi jejuava e, entrando em casa, passava a noite deitado no chão.
17 Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla.
17 Então os anciãos do seu palácio se aproximaram dele, para o levantar do chão; porém ele não quis e não comeu com eles.
18 Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.”
18 No sétimo dia, a criança morreu. E os servos de Davi ficaram com medo de informá-lo de que a criança estava morta, porque diziam: — Quando a criança ainda estava viva, falávamos com ele, mas ele não dava ouvidos à nossa voz. Como, então, vamos dizer a ele que a criança morreu? Poderá fazer alguma loucura!
19 Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?”
19 Mas Davi notou que os seus servos cochichavam uns com os outros e entendeu que a criança havia morrido. Então perguntou: — A criança morreu? Eles responderam: — Morreu.
20 Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ Onyenwe anyị, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri.
20 Então Davi se levantou do chão, lavou-se, ungiu-se, trocou de roupa, entrou na Casa do Senhor e adorou. Depois, voltou para o palácio e pediu comida; puseram-na diante dele, e ele comeu.
21 O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.”
21 O seus servos lhe disseram: — Que é isto que o senhor fez? Pela criança viva o senhor jejuou e chorou, mas, depois que ela morreu, se levantou e se pôs a comer!
22 Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’
22 Davi respondeu: — Enquanto a criança ainda estava viva, jejuei e chorei, porque dizia: “Talvez o
23 Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.”
23 Mas agora que ela morreu, por que jejuar? Poderei eu trazê-la de volta? Eu irei até ela, mas ela não voltará para mim.
24 Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya.
24 Então Davi consolou Bate-Seba, sua mulher. Teve relações com ela, e ela teve um filho, a quem Davi deu o nome de Salomão; e o Senhor o amou.
25 O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị.
25 Davi o entregou nas mãos do profeta Natã, e este lhe chamou Jedidias, por causa do Senhor .
26 Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha.
26 Enquanto isso, Joabe atacou Rabá, dos filhos de Amom, e tomou a cidade real.
27 Joab zigara Devid ozi sị ya, “Ebuola m agha megide Raba dọta isi mmiri ọṅụṅụ ya nʼagha.
27 Então Joabe mandou mensageiros a Davi, dizendo: — Lutei contra Rabá e tomei a cidade das águas.
28 Ugbu a chịkọtaa ndị agha fọdụrụ bịa lụpụchaa agha a, ka ị dọta obodo a nʼagha. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m adọta obodo a nʼagha, a ga-akpọkwasịkwa ya aha m.”
28 Reúna agora o resto do exército e cerque a cidade para tomá-la; do contrário, se eu a tomar, ela poderia ser chamada pelo meu nome.
29 Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya.
29 Então Davi reuniu todo o povo, marchou para Rabá, lutou contra ela, e a tomou.
30 Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
30 Tirou a coroa da cabeça do seu rei. O peso da coroa era de trinta e quatro quilos de ouro, e havia nela pedras preciosas. Essa coroa foi posta na cabeça de Davi. E da cidade ele levou muitos despojos.
31 Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
31 Também trouxe o povo que havia nela, e os fez trabalhar com serras, picaretas, machados de ferro e em fornos de tijolos. Davi fez o mesmo com todas as cidades dos filhos de Amom. Depois voltou com todo o exército para Jerusalém.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Samuel 12, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.