2 Reis 11

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze.
1 Quando Atalia, mãe de Ocozias, viu morto o seu filho, decidiu exterminar toda a descendência real.
2 Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya.
2 Josebá, porém, filha do rei Jorão e irmã de Ocozias, tomou Joás, filho de Ocozias, e fê-lo escapar do massacre dos filhos do rei, escondendo-o com sua ama de leite no quarto de dormir. Esconderam-no assim, de Atalia, de maneira que pôde escapar à morte.
3 Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.
3 Ele esteve seis anos oculto com Josebá no templo do Senhor, enquanto Atalia reinava sobre a terra.
4 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze.
4 No sétimo ano, Jojada convocou junto de si, no templo do Senhor, os centuriões dos cários e dos cursores. Fez com eles um pacto, e, depois de tê-los feito jurar no templo do Senhor, mostrou-lhes o filho do rei.
5 O nyere ha iwu, sị, “Nke a bụ ihe unu ga-eme, unu bụ ndị nọ nʼotu atọ ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, nke otu ụzọ nʼime unu na-eche ụlọeze nche,
5 Eis o que haveis de fazer, ordenou-lhes ele: um terço dentre vós fará o serviço do sábado, montando guarda ao palácio real; um terço guardará a porta de Sur;
6 otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Sua, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ ama, nʼazụ ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
6 e um terço a porta que está por detrás dos guardas. Vigiai o palácio, de modo que ninguém possa entrar.
7 Ma unu bụ otu abụọ ndị kwesiri ịga ezumike site nʼọrụ unu nʼụbọchị izuike, ga-eguzo na nche nʼụlọnsọ ukwu nʼihi eze.
7 As duas companhias que terminarem sua semana, farão a guarda do templo do Senhor, junto do rei.
8 Doonụ onwe unu gburugburu eze, onye ọbụla nʼime unu jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla nke na-abịa nso ahịrị unu, ka e gbuo ya. Nọrọnụ eze nso ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”
8 Estareis, de mãos armadas, à volta do rei, de maneira que, se alguém entrar em vossas fileiras, seja morto. Estareis sempre com o rei, onde quer que ele for.
9 Ndị ọchịagha ndị a na-achị narị ndị agha mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-emechi ọrụ, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike, bịakwute Jehoiada, bụ onye nchụaja.
9 Os centuriões executaram fielmente as ordens do sacerdote Jojada. Tomando cada um os seus homens, tanto os que começavam o serviço no sábado, como os que o terminavam, foram ter com o sacerdote Jojada.
10 O nyere ndị ọchịagha ahụ ùbe na ọta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, ndị dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
10 Jojada deu-lhes as lanças e os escudos do rei Davi, que se encontravam no templo do Senhor.
11 Onye ọbụla na ndị nche ahụ ji ngwa agha nʼaka ya, ha guzoro onwe ha, nọdụ eze gburugburu, na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu, site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
11 Os guardas postaram-se, de mãos armadas, ao longo do altar e do templo, desde a extremidade sul até a extremidade norte do templo, à volta do rei.
12 Jehoiada kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, o nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze. Ndị niile nọ nʼebe ahụ kụrụ aka, tie mkpu, sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
12 Então Jojada fez sair o menino-rei, pôs-lhe a coroa na cabeça e entregou-lhe a Lei. Proclamaram-no rei, ungiram-no e todos o aplaudiram, gritando: Viva o rei!
13 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ nke ndị nche na ndị mmadụ na-eme, ọ gakwuru ndị ahụ nọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
13 Ouvindo Atalia o clamor que faziam os guardas e o povo, entrou no templo do Senhor, pelo meio da multidão.
14 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi, dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”
14 E eis que espetáculo se ofereceu aos seus olhos: lá estava o rei, de pé no estrado, segundo o costume, tendo ao seu lado os chefes e as trombetas, enquanto o povo se alegrava, tocando as trombetas. Então ela rasgou as suas vestes, gritando: Traição, traição!
15 Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
15 Mas o sacerdote Jojada ordenou aos centuriões que comandavam as tropas: Levai-a para fora, entre vossas fileiras, e se alguém quiser segui-la, feri-o com a espada. Porque o pontífice proibira que a matassem no templo do Senhor.
16 Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya.
16 Lançaram-lhe as mãos e, ao chegarem ao palácio real pelo caminho da entrada dos cavalos, mataram-na ali.
17 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ.
17 Jojada fez entre o Senhor, o rei e o povo, uma aliança, segundo a qual o povo devia pertencer ao Senhor. Fez também uma aliança entre o rei e o povo.
18 Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
18 Todo o povo entrou então no templo de Baal e o devastou; destruíram os altares, as imagens, e mataram o sacerdote de Baal, Matã, diante dos altares. O pontífice Jojada pôs guardas no templo do Senhor.
19 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze.
19 Tomou consigo os centuriões, os caritas, os guardas e todo o povo, e, levando o rei do templo do Senhor, entraram no palácio real pela porta das guardas, e Joás sentou-se no trono dos reis.
20 Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.
20 Todo o povo da terra se alegrou, e a cidade ficou em paz. No palácio real, porém, Atalia era passada ao fio da espada.
21 Joash gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.
21 Joás tinha sete anos quando subiu ao trono.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Reis 11, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.