2 Crônicas 34
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC
1 Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem.
1 Josias tinha a idade de oito anos quando começou a reinar; reinou trinta e um anos em Jerusalém.
2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
2 Fez o bem aos olhos do Senhor, seguindo as pegadas de Davi, seu pai, sem se afastar nem para a direita, nem para esquerda.
3 Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile.
3 No oitavo ano de seu reinado, quando ele era ainda criança, começou a buscar o Deus de Davi, seu pai, e no duodécimo ano, começou a limpar Judá e Jerusalém dos lugares altos, das asserás e dos outros ídolos de madeira ou de metal fundido.
4 Nʼihu ya o mere ka a kwatuo ebe ịchụ aja Baal nʼike. Ọ kụdara ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị nʼelu ebe ịchụ aja Baal ndị ahụ, tijisie ogidi Ashera niile, na arụsị na oyiyi niile. Ọ kụjasịrị ha niile, kpokọrọ ha ghasaa ha nʼelu ili ndị na-efe ha.
4 Demoliram, em sua presença, os altares dos Baal; ele próprio destruiu os obeliscos que estavam colocados nesses altares. Fez em pedaços os bosques sagrados, os ídolos, as estelas; ele os reduziu a pó, que esparziu sobre as tumbas de seus devotos;
5 Ọ kpọrọ ọkpụkpụ ndị nchụaja ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja arụsị ha, si otu a mee ka Juda na Jerusalem dị ọcha.
5 e queimou os ossos dos sacerdotes nos seus altares. Foi assim que purificou Judá e Jerusalém.
6 Nʼobodo ndị Manase, na Ifrem na Simiọn, ruo na Naftalị, na mkpọmkpọ ebe ha niile gburugburu.
6 Fez o mesmo nas cidades de Manassés, de Efraim e até mesmo de Neftali, no meio de suas ruínas;
7 O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem.
7 demoliu os altares, quebrou e reduziu a pó as asserás e os ídolos e destruiu todos os obeliscos em toda a terra de Israel. Em seguida retornou a Jerusalém.
8 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ Chineke ya.
8 No décimo oitavo ano de seu reinado, depois de ter purificado a terra e o templo, o rei encarregou Safã, filho de Aslia, Maasias, governador da cidade, e o arquivista Joá, filho de Joacaz, da restauração do templo do Senhor, seu Deus.
9 Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem.
9 Apresentaram-se estes ao sumo sacerdote Helcias e lhe entregaram o dinheiro trazido ao templo, o que os levitas tinham recolhido de Manassés, de Efraim, de todo o resto de Israel, assim como de Judá, de Benjamim e dos habitantes de Jerusalém.
10 Mgbe ahụ, ha nyefere ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ndị ikom a kwụrụ ndị ọrụ rụziri ma mezie ụlọnsọ ahụ ụgwọ.
10 Puseram esse dinheiro nas mãos dos empreiteiros e dos vigias dos trabalhos do templo, os quais o distribuíram aos que trabalhavam na restauração do edifício.
11 Ha nyekwara ndị ọkpọ ǹtu na ndị na-ewu ụlọ ego iji zụta nkume a wara awa, osisi iji mee ihe njikọta na osisi ịkwado ụlọ, maka iji rụzie ụlọ a nke ndị eze Juda hapụrụ ka ọ dakasịa.
11 Estes o entregaram aos carpinteiros e aos pedreiros para a compra de pedras de cantaria, e madeiras de carpintaria, assim como traves destinadas às construções que os reis de Judá tinham deixado cair em ruínas.
12 Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche
12 Esses homens cumpriram fielmente sua tarefa. Tinham como inspetores para dirigi-los Jaat e Abdias, levitas da linhagem de Merari, Zacarias e Mosolão, da linhagem dos caatitas, assim como outros levitas que eram todos entendidos em música.
13 ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche.
13 Estes últimos vigiavam os carregadores e dirigiam todos os trabalhadores, segundo sua especialidade. Havia ainda levitas secretários, comissários e porteiros.
14 Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu Onyenwe anyị, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis.
14 No momento em que se retirava o dinheiro que tinha sido levado ao templo do Senhor, o sacerdote Helcias descobriu o livro da Lei do Senhor, dada por Moisés.
15 Hilkaya sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan.
15 Disse então Helcias ao escriba Safã: Encontrei o livro da Lei no templo. E ele o entregou a Safã;
16 Mgbe ahụ, Shefan buuru akwụkwọ ahụ wegara ya eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị na-eje ozi ha dịka ihe niile i tinyere ha nʼaka si dị.
16 este o levou ao rei e fez-lhe o seguinte relato: Teus servos fizeram tudo o que lhes confiaste:
17 Ha enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị nlekọta ọrụ, na ndị ọrụ.”
17 tiraram o dinheiro que estava no templo e o puseram nas mãos dos empreiteiros dos trabalhos.
18 Emesịa, Shefan ode akwụkwọ gwara eze okwu ọzọ sị ya, “O nwere akwụkwọ Hilkaya nyere m.” Shefan wepụtara ya gụọ ya na ntị eze.
18 Por outra parte, acrescentou ele, o sacerdote Helcias me entregou um livro. E começou a lê-lo em presença do rei.
19 Mgbe eze nụrụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya.
19 Ouvindo as palavras da Lei, este rasgou suas vestes.
20 O nyere Hilkaya, Ahikam nwa Shefan, Abdon nwa Maịka, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,
20 Em seguida, deu esta ordem a Helcias, a Aicão, filho de Safã, a Abdon, filho de Mica, ao escriba Safã e ao seu servo Asaa:
21 “Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị fọdụrụ nʼIzrel na Juda, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a bụ nke achọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke a wụkwasịrị anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ edebeghị okwu nke Onyenwe anyị, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime akwụkwọ a banyere anyị.”
21 Ide e consultai o Senhor de minha parte, e da parte do que resta em Israel e em Judá, a respeito das palavras deste livro que acabam de encontrar; pois grande é a ira do Senhor, que se desencadeou sobre nós porque nossos pais não observaram a palavra do Senhor, pondo em prática tudo o que está escrito neste livro.
22 Ya mere, Hilkaya na ndị ahụ eze zipụrụ ya na ha, jekwuuru Hulda, onye amụma nwanyị, onye bụ nwunye Shalum, nwa Tokhat, nwa Hasra. Onye nlekọta ebe a na-edebe uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.
22 Helcias e aqueles que o rei tinha designado foram ter com a profetisa Holda, mulher de Selum, filho de Técua, filho de Harsa, guarda do vestiário, a qual habitava em Jerusalém, no segundo distrito. Quando lhe transmitiram sua mensagem,
23 Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị
23 ela lhes respondeu: Eis o que diz o Senhor, Deus de Israel: dizei àquele que vos envia a mim: eis o que diz o Senhor:
24 ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda.
24 vou fazer vir sobre este lugar e sobre os habitantes todas as calamidades, todas as maldições escritas neste livro que foi lido na presença do rei de Judá,
25 Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’
25 porque eles me abandonaram e ofereceram incenso aos deuses falsos, irritando-me com todas as suas maneiras de agir; meu furor inflamar-se-á contra este lugar, sem que se possa jamais extingui-lo.
26 Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ.
26 Ao rei de Judá que vos enviou a consultar o Senhor, dir-lhe-eis: eis o que diz o Senhor, Deus de Israel, a respeito das palavras que ouviste:
27 Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe o kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na i wedara onwe gị nʼala nʼihu m, ma dọwaakwa uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m. Mụ onwe m anụla, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
27 porquanto teu coração se comoveu e te humilhaste diante de Deus, escutando o que eu disse contra esta terra e seus habitantes; porquanto te humilhaste diante de mim, rasgaste tuas vestes chorando, eu também te ouvirei - oráculo do Senhor.
28 Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ”
28 Vou reunir-te a teus pais; serás depositado em paz nas suas tumbas; teus olhos nada verão da catástrofe que vou mandar a este lugar e aos seus habitantes. Eles referiram ao rei esta resposta.
29 Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile.
29 Então Josias convocou todos os anciãos de Judá e de Jerusalém.
30 Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.
30 Depois, ele próprio subiu ao templo, seguido de todos os anciãos de Judá e Jerusalém, os sacerdotes, os levitas e todo o povo, desde o maior até o menor. E fez-lhes uma leitura integral do livro da aliança, encontrado no templo do Senhor.
31 Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile rube isi nʼokwu ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ ahụ.
31 O rei, de pé num estrado, fez, na presença do Senhor, um pacto no qual se comprometia a seguir o Senhor, a guardar seus mandamentos, suas ordens e seus preceitos, de todo o coração e de toda a a sua alma, e a pôr em prática todas as palavras da aliança escrita no livro.
32 O mekwara ka ndị niile nọ na Jerusalem na Benjamin kwee Onyenwe anyị otu nkwa ahụ. Ndị niile bi na Jerusalem mezukwara ihe ndị a dịka ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Chineke nna nna ha si dị.
32 Fez com que aderissem todos os que se encontravam em Jerusalém e em Benjamim; e os habitantes de Jerusalém fizeram segundo a aliança de Deus, do Deus de seus pais.
33 Josaya sitere nʼala niile bụ nke ndị Izrel wezuga ihe arụ niile bụ arụsị, o mere ndị niile nọ nʼIzrel nʼoge ahụ ka ha fee Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Nʼụbọchị ndụ ya niile, ha esiteghị nʼiso Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna wezuga onwe ha.
33 Josias fez, desse modo, desaparecer as abominações de toda a terra dos israelitas e impôs a todos que lá se encontravam que servissem o Senhor, seu Deus. Enquanto ele viveu, não se afastaram do Senhor, Deus de seus pais.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Crônicas 34, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.