2 Crônicas 30

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC

Sair da comparação
VC Versão Católica
1 Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
1 Ezequias enviou mensageiros a todo o Israel e a todo o Judá; escreveu também cartas a Efraim e a Manassés para convidá-los a vir ao templo de Jerusalém, a fim de celebrarem a Páscoa em honra do Senhor, Deus de Israel.
2 Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ.
2 O rei, seus chefes e toda a multidão de Jerusalém, tinham resolvido celebrar a Páscoa no segundo mês;
3 Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem.
3 não puderam fazê-lo em tempo, porque não estavam santificados sacerdotes em número suficiente, e o povo não se tinha ainda reunido em Jerusalém.
4 Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a.
4 Tendo isto agradado ao rei e à assembléia,
5 Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.
5 decidiram publicar em todo o Israel, desde Bersabéia até Dã, a ordem de vir a Jerusalém para celebrar a Páscoa em honra do Senhor, Deus de Israel, pois desde muito tempo não mais fora celebrada como estava prescrito.
6 Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si:
6 Partiram, então, os correios com as cartas do rei e dos chefes, para todo o Israel e Judá. Por ordem do rei, eles diziam: Israelitas, voltai ao Senhor, o Deus de Abraão, de Isaac e de Israel, a fim de que ele se volte àqueles dentre vós que conseguiram escapar das mãos do rei da Assíria.
7 Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya.
7 Não sejais como vossos pais e vossos irmãos que prevaricaram contra o Senhor, Deus de seus pais, o qual os entregou à desolação, como vedes.
8 Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ.
8 Não endureçais vossa cerviz como fizeram vossos pais. Dai a mão ao Senhor, vinde a seu santuário que ele consagrou para sempre, e servi ao Senhor, vosso Deus, a fim de que ele afaste de vós o ardor de sua cólera.
9 Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.”
9 Se voltardes para o Senhor, vossos irmãos e vossos filhos acharão misericórdia diante daqueles que os levaram para o cativeiro e voltarão à sua terra, pois o Senhor Deus é generoso e misericordioso e não desviará os olhos de vós, se voltardes para ele.
10 Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo.
10 Assim os correios passaram de cidade em cidade, na terra de Efraim, de Manassés e até de Zabulon. Zombaram deles e os escarneceram.
11 Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem.
11 Contudo, alguns homem de Aser, de Manassés e de Zabulon humilharam-se e dirigiram-se a Jerusalém.
12 Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
12 Também em Judá, a mão de Deus operou sobre os habitantes para dar-lhes um mesmo desejo de executar o mandato do rei e de seus chefes, conforme a palavra do Senhor.
13 Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko.
13 Grandes multidões afluíram a Jerusalém para celebrar a festa dos Ázimos, no segundo mês. Foi uma imensa afluência de povo.
14 Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
14 Eles puseram-se a destruir os altares que se encontravam em Jerusalém, a destruir todos os altares dos perfumes, e os atiraram na torrente do Cedron.
15 Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
15 Imolaram a Páscoa no décimo quarto dia do segundo mês. Os sacerdotes e os levitas, cheios de confusão, tinham-se santificado e ofereceram holocaustos no templo.
16 Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja.
16 Ocupavam seu lugar normal, como o prescreve a lei de Moisés, homem de Deus. Os sacerdotes esparziam o sangue que lhes davam os levitas.
17 Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị.
17 Como houvesse na assistência muitos que não se tinham purificado, os levitas encarregaram-se de imolar a Páscoa, para todos os que não estavam puros, a fim de consagrá-los ao Senhor.
18 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla
18 Grande parte do povo, com efeito, muitos de Efraim, de Manassés, de Issacar e de Zabulon, comeu a Páscoa, contrariamente à prescrição, sem se ter purificado. Mas Ezequias fez por eles esta prece: Digne-se o Senhor, na sua bondade,
19 bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.”
19 perdoar todos os que aplicaram seu coração à procura de Deus, o Senhor, Deus de seus pais, conquanto não tivessem a purificação exigida para o santuário!
20 Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.
20 O Senhor escutou Ezequias e perdoou o povo.
21 Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
21 Os israelitas que se encontravam em Jerusalém celebraram alegremente a festa dos Ázimos durante uma semana: e cada dia os levitas e os sacerdotes louvaram o Senhor com instrumentos possantes em honra do Senhor.
22 Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.
22 Ezequias dirigiu palavras de encorajamento a todos os levitas que se tinham mostrado compreensivos no serviço do Senhor. Durante sete dias comeram as vítimas da festa, ofereceram sacrifícios pacíficos e glorificaram o Senhor, Deus de seus pais.
23 Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ.
23 Mas a opinião de toda a multidão era de prolongar a festa por mais uma semana, e esses sete dias {suplementares} foram celebrados com alegria.
24 Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ.
24 Ezequias tinha dado à multidão mil touros e sete mil ovelhas; os chefes ajuntaram a isso mil touros e dez mil ovelhas; os sacerdotes, em grande número, se tinham purificado.
25 Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa.
25 A alegria reinava em toda a multidão dos homens de Judá, entre os sacerdotes e levitas, a multidão vinda de Israel e os estrangeiros vindos de Israel ou estabelecidos em Judá.
26 Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem.
26 Em Jerusalém houve grande júbilo, tanto que nada de semelhante se tinha visto na cidade desde o tempo de Salomão, filho de Davi, rei de Israel.
27 Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.
27 Finalmente os sacerdotes e os levitas levantaram-se para abençoar a multidão. A voz deles foi ouvida e a prece deles chegou até a morada santa do Senhor, no céu.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Crônicas 30, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.