2 Coríntios 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs BKJ

Sair da comparação
1 Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute.
1 Mas eu determinei isto comigo mesmo: que não irei outra vez a vós com tristeza.
2 Nʼihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ ga-akasị m obi ma ọ bụghị unu, unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ?
2 Porque se eu vos entristeço, quem é que me alegrará, senão o mesmo que foi entristecido por mim?
3 E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile.
3 E eu escrevi isto mesmo a vós, para que, ao chegar, não tenha tristeza da parte dos que deveriam alegrar-me; tendo confiança em todos vós, que a minha alegria é a alegria de todos vós.
4 Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ.
4 Porque em muita aflição e angústia do coração eu vos escrevi, com muitas lágrimas; não para que vos entristecêsseis, mas para que conhecêsseis o amor que eu tenho mais abundantemente por vós.
5 Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu.
5 Mas, se alguém causou tristeza, não causou tristeza a mim, senão em parte, para eu não sobrecarregar a todos vós.
6 Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola.
6 Suficiente para tal homem é esta punição, a qual foi infligida por muitos.
7 Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke.
7 Assim que, ao contrário, vós deveis antes perdoar-lhe e confortá-lo, para que talvez o tal não seja consumido por excessiva tristeza.
8 Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya.
8 Por isso vos rogo que confirmeis o vosso amor para com ele.
9 Ihe mere m ji dee ihe m dere nʼakwụkwọ nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe niile irube isi nʼihe niile.
9 E para esse fim também vos escrevi, para saber de vós por esta prova, se sois obedientes em todas as coisas.
10 Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst.
10 E a quem perdoardes alguma coisa, eu também perdoo; porque se eu perdoei alguma coisa, a quem perdoei, por causa de vós o perdoei na presença de Cristo;
11 Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube.
11 para que Satanás não obtenha vantagem sobre nós, porque não ignoramos os seus objetivos.
12 Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị.
12 Além disso, quando eu cheguei a Trôade para pregar o evangelho de Cristo, e uma porta foi aberta para mim pelo Senhor,
13 Ma enweghị m izuike nʼime obi m, nʼihi na ahụghị m Taịtọs ezi nwanna m nʼebe ahụ. Nke a mere m jiri kelee ha hapụ ha gawa Masidonia.
13 eu não tive descanso no meu espírito, porque eu não encontrei Tito, meu irmão; mas ausentando-me deles, parti dali para a Macedônia.
14 Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya.
14 Agora, graças a Deus, que sempre nos faz triunfar em Cristo, e faz manifesto o cheiro de seu conhecimento por meio de nós em todo o lugar.
15 Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi.
15 Porque somos para Deus uma doce fragrância de Cristo, nos que são salvos e nos que perecem;
16 Nʼetiti ndị ahụ na-ala nʼiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nʼetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Onye zuru ime ihe ndị a?
16 para um, nós somos o cheiro da morte para morte, e para o outro, o cheiro da vida para vida. E quem é suficiente para estas coisas?
17 Nʼihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahịa. Kama, nʼime Kraịst anyị na-ekwu okwu anyị site nʼobi dị ọcha, dịka ndị ahụ Chineke zipụrụ ịrụ ọrụ a.
17 Porque nós não somos como muitos, os quais corrompem a palavra de Deus, mas com sinceridade, como de Deus, à vista de Deus, nós falamos de Cristo.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Coríntios 2, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.