2 Coríntios 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC
1 Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro.
1 É esta a terceira vez que vou visitar-vos. Pelo depoimento de duas ou três testemunhas se resolve toda a questão.
2 Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike.
2 Quando de minha segunda visita, já adverti àqueles que pecaram, e hoje, que estou ausente, torno a repeti-lo a eles e aos demais: se eu for outra vez, não usarei de perdão!
3 Ebe unu chọrọ ka e gosi na Kraịst na-ekwu okwu nʼime m, ọ dịghị egosi adịghị ike mgbe ọ na-emeso unu omume, kama ọ na-eme ka ike ya pụta ìhè nʼebe unu nọ.
3 Simplesmente porque exigis a prova de que é Cristo que fala em mim. Ora, para convosco ele não é fraco, mas exerce o seu poder entre vós.
4 Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.
4 É verdade que ele foi crucificado por fraqueza, mas está vivo pelo poder de Deus. Também nós somos fracos nele, mas com ele viveremos, pelo poder de Deus para atuar entre vós.
5 Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma.
5 Examinai-vos a vós mesmos, se estais na fé. Provai-vos a vós mesmos. Acaso não reconheceis que Cristo Jesus está em vós? A menos que a prova vos seja, talvez, desfavorável.
6 Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ.
6 Mas espero que reconhecereis que ela não é contra nós.
7 Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị.
7 Entretanto, rogamos a Deus que não façais mal algum, não para que pareçamos aprovados, mas para que vós façais o bem, embora nós sejamos tidos como reprovados.
8 Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu.
8 Contra a verdade não temos poder algum; temo-lo apenas em prol da verdade.
9 Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-adịghị ike ma hụ na unu dị ike. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka unu tozuo oke.
9 Alegramo-nos de ver-vos fortes, enquanto nós somos fracos. E até oramos por vossa perfeição.
10 Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ.
10 Eis por que eu vos escrevo de longe para que, estando presente, não tenha que usar de rigor, em vista do poder que o Senhor me conferiu para edificar, e não para destruir.
11 Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
11 Por fim, irmãos, vivei com alegria. Tendei à perfeição, animai-vos, tende um só coração, vivei em paz, e o Deus de amor e paz estará convosco.
12 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
12 Saudai-vos uns aos outros no ósculo santo.
13 Ndị nsọ niile na-ekelekwa unu.
13 Todos os santos vos saúdam.
14 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile.
14 A graça do Senhor Jesus Cristo, o amor de Deus e a comunhão do Espírito Santo estejam com todos vós!
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 2 Coríntios 13, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.