1 Tessalonicenses 3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs ACF

Sair da comparação
ACF Almeida Corrigida Fiel
1 Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nʼihu, anyị kpebiri ịnọ naanị anyị nʼAtens.
1 Por isso, não podendo esperar mais, achamos por bem ficar sozinhos em Atenas;
2 Anyị zipụrụ Timoti, onye bụ nwanna anyị, onye anyị na ya so na-arụrụ Chineke ọrụ site nʼịkwusa oziọma Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasịe unu obi, meekwa ka unu guzosie ike nʼokwukwe unu.
2 E enviamos Timóteo, nosso irmão, e ministro de Deus, e nosso cooperador no evangelho de Cristo, para vos confortar e vos exortar acerca da vossa fé;
3 Ka unu hapụ ịda mba nʼihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nke a ga-abụ ihe nketa anyị.
3 Para que ninguém se comova por estas tribulações; porque vós mesmos sabeis que para isto fomos ordenados,
4 Nʼihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a, ihe niile emezuola dị ka unu matakwara.
4 Pois, estando ainda convosco, vos predizíamos que havíamos de ser afligidos, como sucedeu, e vós o sabeis.
5 Nʼihi nke a, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, eziri m ozi, ka a chọpụta maka okwukwe unu. Nʼihi na ụjọ m bụ ma eleghị anya o nweela ụzọ onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ si nwaa unu ọnwụnwa nʼoge a, mee ka ndọgbu niile anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ nʼetiti unu bụrụ ihe lara nʼiyi.
5 Portanto, não podendo eu também esperar mais, mandei-o saber da vossa fé, temendo que o tentador vos tentasse, e o nosso trabalho viesse a ser inútil.
6 Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya.
6 Vindo, porém, agora Timóteo de vós para nós, e trazendo-nos boas novas da vossa fé e amor, e de como sempre tendes boa lembrança de nós, desejando muito ver-nos, como nós também a vós;
7 Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu.
7 Por esta razão, irmãos, ficamos consolados acerca de vós, em toda a nossa aflição e necessidade, pela vossa fé,
8 Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị.
8 Porque agora vivemos, se estais firmes no Senhor.
9 Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu.
9 Porque, que ação de graças poderemos dar a Deus por vós, por todo o gozo com que nos regozijamos por vossa causa diante do nosso Deus,
10 Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu.
10 Orando abundantemente dia e noite, para que possamos ver o vosso rosto, e supramos o que falta à vossa fé?
11 Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu.
11 Ora, o mesmo nosso Deus e Pai, e nosso Senhor Jesus Cristo, encaminhem a nossa viagem para vós.
12 Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ.
12 E o Senhor vos aumente, e faça crescer em amor uns para com os outros, e para com todos, como também o fazemos para convosco;
13 Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.
13 Para confirmar os vossos corações, para que sejais irrepreensíveis em santidade diante de nosso Deus e Pai, na vinda de nosso Senhor Jesus Cristo com todos os seus santos.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Tessalonicenses 3, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.