1 Samuel 27

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI

Sair da comparação
NVI Nova Versão Internacional
1 Devid chere nʼime onwe ya sị, “Otu ụbọchị Sọl ga-enweta m, bibie m. Ihe ka mma m ga-eme bụ ịgbaga nʼala ndị Filistia. Nke a ga-eme ka Sọl kwụsị ịchọgharị m ebe ọbụla nʼIzrel. Aga m esikwa otu a, nwere onwe m site nʼaka ya.”
1 Davi, contudo, pensou: "Algum dia serei morto por Saul. É melhor fugir para a terra dos filisteus. Então Saul desistirá de procurar-me por todo o Israel, e escaparei dele".
2 Ya mere, Devid na narị ndị ikom isii ya, na ezinaụlọ ha, biliri jekwuru Akish nwa Maok, eze ndị Gat.
2 Assim, Davi e os seiscentos homens que estavam com ele foram até Aquis, filho de Maoque, rei de Gate.
3 Devid na ndị agha ya sooro Akish biri na Gat. Onye ọbụla du ezinaụlọ ya. Devid nʼonwe ya du ndị inyom abụọ ya: Ahinoam onye Jezril, na Abigel onye Kamel, nwunye ochie Nebal.
3 Davi e seus soldados se estabeleceram com Aquis, em Gate. Cada homem levou sua família, e Davi, suas duas mulheres, Ainoã, de Jezreel, e Abigail, mulher de Nabal, de Carmelo.
4 Ọ dịghị anya, Sọl nụrụ na Devid agbalaala Gat, nʼihi ya ọ kwụsịrị ịchụso ya.
4 Quando contaram a Saul que Davi havia fugido para Gate, ele parou de persegui-lo.
5 Devid gwara Akish sị ya, “Ọ bụrụ na m anatala amara nʼebe ị nọ, ọ ga-adị mma ka enye m otu obodo nʼime obodo nke ala a, ka m biri. Nʼihi gịnị ka ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?”
5 Então Davi disse a Aquis: "Se eu conto com a sua simpatia, dá-me um lugar numa das cidades desta terra onde eu possa viver. Por que este teu servo viveria contigo na cidade real? "
6 Akish nyere ya Ziklag, nʼihi ya, Ziklag bụ obodo ndị eze Juda ruo taa.
6 Naquele dia Aquis deu-lhe Ziclague. Por isso, Ziclague pertence aos reis de Judá até hoje.
7 Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ.
7 Davi morou em território filisteu durante um ano e quatro meses.
8 Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt)
8 Davi e seus soldados atacavam os gesuritas, os gersitas e os amalequitas, povos que, desde tempos antigos, habitavam a terra que se estende de Sur até o Egito.
9 Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.
9 Quando Davi atacava a região, não poupava homens nem mulheres, e tomava ovelhas, bois, jumentos, camelos e roupas. Então retornava a Aquis.
10 Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”
10 Quando Aquis perguntava: "Onde você atacou hoje? " Davi respondia: "O Neguebe de Judá" ou "O Neguebe de Jerameel" ou "O Neguebe dos queneus".
11 Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.
11 Ele matava a todos, homens e mulheres, para que não fossem levados a Gate, pois pensava: "Eles poderão denunciar-me". Este foi o seu procedimento enquanto viveu em território filisteu.
12 Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, “Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. Ọ ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile.”
12 Aquis confiava em Davi e dizia: "Ele se tornou tão odiado por seu povo, os israelitas, que será meu servo para sempre".

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Samuel 27, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.