1 Samuel 21

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI

Sair da comparação
NVI Nova Versão Internacional
1 Devid jere nʼobodo Nob ịhụ Ahimelek, onye nchụaja. Ahimelek mara jijiji mgbe ọ hụrụ Devid. Ọ sịrị Devid, “Gịnị mere naanị gị ji bịa? Gịnị mere o nweghị onye so gị?”
1 Davi foi falar com o sacerdote Aimeleque, em Nobe. Aimeleque tremia quando se encontrou com ele, e perguntou: "Por que você está sozinho? Ninguém veio com você? "
2 Devid zara Ahimelek, onye nchụaja sị, “Eze ziri m ozi dị mkpa, ma sị m, ‘Ka onye ọbụla ghara ịma ihe ọbụla banyere ozi a m na-eziga gị.’ Ma banyere ụmụ okorobịa m, agwala m ha ebe ha ga-ezute m.
2 Respondeu Davi: "O rei me encarregou de uma certa missão e me disse: ‘Ninguém deve saber coisa alguma sobre sua missão e sobre as suas instruções’. E eu ordenei aos meus soldados que se encontrassem comigo num certo lugar.
3 Ugbu a, olee ihe oriri i nwere? Nye m ogbe achịcha ise maọbụ ihe ọzọ i nwere.”
3 Agora, então, o que você pode oferecer-me? Dê-me cinco pães ou algo que tiver".
4 Onye nchụaja ahụ zara Devid sị, “Enweghị m achịcha ana edoghị nsọ nʼebe a. Ma otu ọ dị, e nwere ụfọdụ achịcha e doro nsọ nʼebe a, ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị na ha so debere onwe ha ọcha, na-emetụghị nwanyị ahụ.”
4 O sacerdote, contudo, respondeu a Davi: "Não tenho pão comum; somente pão consagrado; se os soldados não tiveram relações com mulheres recentemente podem comê-lo".
5 Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.”
5 Davi respondeu: "Certamente que não, conforme o nosso costume sempre que saio em campanha. Não tocamos em mulher. Esses homens mantém o corpo puro mesmo em missões comuns. Quanto mais hoje! "
6 Ebe nri ọzọ na-adịghị, onye nchụaja ahụ nyere Devid achịcha nsọ, bụ achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, nke ewepụtara site nʼihu Onyenwe anyị nʼime ebe ịchụ aja, debekwa achịcha ọhụrụ nke e ji gbanwee nke ochie dị nʼebe ahụ.
6 Então, o sacerdote lhe deu os pães consagrados, visto que não havia outro além do pão da Presença, que era retirado de diante do Senhor e substituído por pão quente no dia em que era tirado.
7 Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl.
7 Aconteceu que um dos servos de Saul estava ali naquele dia, cumprindo seus deveres diante do Senhor; era o edomita Doegue, chefe dos pastores de Saul.
8 Devid jụrụ Ahimelek ajụjụ sị ya, “I nweghị ùbe maọbụ mma agha nʼebe a? Ewetaghị m mma agha m maọbụ ngwa agha ọzọ, nʼihi na ozi eze ziri anyị dị oke ngwangwa.”
8 Davi perguntou a Aimeleque: "Você tem uma lança ou uma espada aqui? Não trouxe minha espada nem qualquer outra arma, pois o rei exigiu urgência".
9 Onye nchụaja zaghachiri, “Mma agha Golaịat, onye Filistia, onye ahụ i tigburu na ndagwurugwu Ịla dị nʼebe a, a fụchiri ya nʼakwa nʼazụ efọọd. Ọ bụrụ na ị chọrọ ya, were ya, nʼihi na ọ dịghị mma agha ọzọ dị nʼebe a ma ọ bụghị nke ahụ.”
9 O sacerdote respondeu: "A espada de Golias, o filisteu que você matou no vale de Elá, está enrolada num pano atrás do colete sacerdotal. Se quiser, pegue-a; não há nenhuma outra espada". Davi disse: "Não há outra melhor; dê-me essa espada".
10 Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.
10 Naquele dia, Davi fugiu de Saul e foi procurar Aquis, rei de Gate.
11 Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị:
11 Todavia os conselheiros de Aquis lhe disseram: "Não é este Davi, o rei da terra de Israel? Não é aquele sobre quem cantavam em suas danças: ‘Saul abateu seus milhares, e Davi suas dezenas de milhares’? "
12 Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.
12 Davi levou a sério aquelas palavras e ficou com muito medo de Aquis, rei de Gate.
13 Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
13 Por isso, na presença deles ele fingiu estar louco; enquanto esteve com eles, agiu como um louco, riscando as portas da cidade e deixando escorrer saliva pela barba.
14 Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, “Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya?
14 Aquis disse a seus conselheiros: "Vejam este homem! Ele está louco! Por que trazê-lo aqui?
15 Ndị na-ayị ara ha kọrọ m, nke mere unu ji kpọtara m nwoke a nʼebe a ka ọ bịa na-eme ka onye na-ayị ara nʼihu m? O kwesiri ka onye dị otu a bata nʼụlọ m?”
15 Será que me faltam loucos para que vocês o tragam para agir como doido na minha frente? O que ele veio fazer no meu palácio? "

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Samuel 21, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.